Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Uche Chineke banyere onye ọbụla kwere ekweIhe Atụ

Uche Chineke banyere onye ọbụla kwere ekwe

ỤBỌCHỊ 2 NKE 3

Nzisa oziọma; Ụzọ e si ekwusa ozi ọma ahụ

Ọrụ Ndịozi 1:8, na-egosi mkpa ọ dị ịbụ ndị àmà nke Jizọs Kraịst, mgbe anyị bu ụzọ natachaa ike. Nke a mere Pita ji kpaa ike dị egwù ka ahụmihe Ụlọ elu ya gaschara, nke dị 'akwụkwọ Ọrụ Ndịozi 2. Pita, bụ onye a maara na ọ na-eme ihere, nwere ike, gosipụta obi isi ike na nkwuwa okwu n'ihu ndị mmadụ, ebe o nwere ike mepụta ma kwusaara ìgwè mmadụ nọ ebe ahụ n’ụbọchị ahụ ozi ọma nke Jizọs.

Isi ahụrụ kwaba okpu na nzisaọma bụ inwe ike ikwusa ọmụmụ, ọnwụ, na mbilite n’ọnwụ nke Jizọs Kraịst. Etu e siri mụọ Jizọs Kraịst, ọ ma nwụọ n'ọnọdụ nke mmadụ. Ọnwụ ya bụ ihe mgbapụta nke mmehie anyị, iji weghachi anyị niile nye Chineke, ịlaghachi azụ n'etu ọ dị na mmalite. Pita kwusara otu ozi ọma a n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi 2 a zọpụta ọtụtụ mmadụ n’ihi nke a.

Chekene maka udi obi ụtọ ị ga-enwe ma i nweta onyinye, maọbụ nweta ihe ị na-achọ, ị ga-enwewanye obi ụtọ ịma na ndị enyi gị, na ezinaụlọ gị, ọbụna ndị iro gị, nwekwazịrị ike irite uru na nnukwu ohere a. Nke a na-eduba gị n'ịgwa ha, ime ka ha kwenye, nakwa ịgba ha ume ka ha soro na irite uru na nnukwu ihe ùgwù a. Dị ka ndị kwere ekwe, ọ bụ ọrụ dịịrị anyị kpọmkwem ịkwusara onye ọbụla anyị hụrụ n’anya na ndị anyị na-ahụghị n’anya ozi ọma ahụ. N’ụzọ dị etu a, anyị na-azọpụta ha n'ihe ize ndụ na-abịakwasị onye ọbụla na-anabataghị ozi ọma a.

Oziọma nke Jizọs bụ ozi ịhụnanya. Jizọs hụrụ anyị n'anya, ya mere o ji nwụọ n’ihi anyị iji napụta anyị n'ahụhụ nke na-echere ndị na-anabataghị ya dị ka Onye nwe ha na onye nzọpụta ha. Enyere anyị ọrụ a ka anyị na ọtụtụ mmadụ kerịta ya dịka o kwere mee. Dịka onye nabatara Jizọs Kraịst dịka Onye nwe gị na Onye Nzọpụta gị, otu n’ime ọrụ gị bụ ibili maka nzọpụta nke ndị ọzọ. Onye ọbụla kwere ekwe ji Chineke ụgwọ ọrụ nke ịtọghata mkpụrụ obi. Mụọ ịkọrọ enyi gị maọbụ onye ezinaụlọ gị ihe akaebe gị na ihe ndị bụ isi nke ozi Oziọma. Nke a bụ nnọọ ihe nzisaoziọma bụ.

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Uche Chineke banyere onye ọbụla kwere ekwe

Ọmụmụ, ọnwụ, na mbilite n'ọnwụ Jizọs wetara ozi ọma ahụ. Ozi ọma a bụ ihe butere nzọpụta nke mmadụ. Ya mere, Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ Jizọs ji nye ntụziaka ka onye ọbụla a zọpụtara bilie maka nzọpụta nke ndị ọzọ site n'ụzọ nzisa oziọma, nke bụ ikesà otu ozi ọma a nye ndị ọzọ azọpụtabeghị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/