Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Uche Chineke banyere onye ọbụla kwere ekweIhe Atụ

Uche Chineke banyere onye ọbụla kwere ekwe

ỤBỌCHỊ 1 NKE 3

Nzisa oziọma; Iwu nke Ikpeazụ.

Site na Jenesis, anyị ga-ahụ etu Chineke si mara ụma na-adọrọ ụmụ mmadụ nye onwe ya, ozigbo Adam na Iv dàchàrà n’ogige Iden. Nke a abụrụla ihe ịma aka na obi na-eti kpumkpum nke Chineke. Ekère mmadụ ka ya na Chineke na-akpakọrịta, mana onye iro bara n'aghụghọ ya, ewee napụ mmadụ ọnọdụ ya.

E mesịa, Chineke gbalịrị ọtụtụ mgbe iweghachi mmekọrịta a, bụ́ nke mesịrị duga n’ọmụmụ, ọnwụ ya, na n’ikpeazụkwa, mbilite n’ọnwụ ya. Na mbili n’ọnwụ, Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ikpeazụ n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi 1:7-8 . Iwu a bụ ka ha bụrụ ndị akaebe nke Jizọs Kraịst n'akụkụ dị iche iche nke ụwa. Ma otu ihe dị oké mkpa e kwesịrị ịrịba ama bụ mkpa ọ dị ịkwado akwado, tupu ị̀zọpụ̀ ụkwụ nke nkwuwa okwu, ịbụ onye àmà nke Jizọs Kraịst. Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ntuziaka ka ha chere Mmụọ Nsọ tupu ha amalite ozi nzisa oziọma ha. Nke a bụ maka na nzisa oziọma chọrọ ikike.

Enwere ike iwere ikwusa ozi ọma dị ka ọrụ dị oke mkpa, nke a bụ iwu ikpeazụ Jizọs nyere tupu Ọ̀ rịgoo n'eluigwe. Nke a na-egosi ka ọrụ a si dị oke mkpa nye onye ọbụla kwere ekwe. Ọ bụrụ na ọrụ a dị oke mkpa, e nwere ike isi na ọ dịkwa oke mkpa ịgbaso iwu na ntuziaka onye nwe ya na-etinyeghị maọbụ wepụ ihe na ya. Ọ dị ezigbo mkpa ịkwado akwado na ikpe ekpere. Nke a bụ n’ihi na ike dị oke mkpa n’iji zisaara ndị mmadụ ozi ọma nke ọma. Nke a na-eme mgbe onye kwere ekwe jupụtasịrị na Mmụọ Nsọ. Mmụọ Nsọ na-enye aka nke ọma n’iji zisaara ndị na-ekweghị ekwe ozi nke nzisa oziọma. Otu n’ime ihe a na-enweta site na njupụta nke Mmụọ Nsọ dịka a hụrụ na Ọrụ Ndịozi 2, bụ nkwuwa okwu na-abịa n’ikwusa ozi ọma nke ọma, maka na okwu ọnụ nkịtị enweghị ike izisa ozi ọma, kama, ọ bụ okwu ejiri ike kwado.

Iji soro iwu ikpeazụ a, ọ dị mkpa ịgbaso ntụziaka nke Jizọs Kraịst, onye nyere anyị ntụziaka a, ma cherekwa Onye nwe anyị n’ekpere, amamihe, na nduzi nke Chineke iji malite njem nke nzisà oziọma nke ọma.

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Uche Chineke banyere onye ọbụla kwere ekwe

Ọmụmụ, ọnwụ, na mbilite n'ọnwụ Jizọs wetara ozi ọma ahụ. Ozi ọma a bụ ihe butere nzọpụta nke mmadụ. Ya mere, Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ Jizọs ji nye ntụziaka ka onye ọbụla a zọpụtara bilie maka nzọpụta nke ndị ọzọ site n'ụzọ nzisa oziọma, nke bụ ikesà otu ozi ọma a nye ndị ọzọ azọpụtabeghị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/