Nkwa AhụIhe Atụ
Nkwa nke Ịdị Ọcha
MgbeJemeszutere Mandy, ọ maara na ọ bụ ya ka ọ chọrọ ịlụ . Mandy… ọ maghị ri nne. Ma, ọtụtụ afọ nke ọbụbụenyi mechara ghọọ alụmdi na nwunye magburu onwe ya. Otu afọ ọlụlụ, ha tulere ịdị ọcha dịka otu n'ime nkwa ha kacha mkpa.
Mandy:
E tolitere m gburugburu ụlọ ụka, ya bụ mgbe m bụ nwata, ndị enyi m niile na-ekwu maka ịdị ọcha. Akụkọ maka ịdị ọcha bụ nkata onye ọ bụla na-akpa. E chere m na ịdị ọcha bụ nwaanyị ị ghara ịnye nwoke ahụ ya. Na aka nke m, nke ahụ pụtara a gaghị enwe isusu ọnụ ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ruo mgbe alụmdi na nwunye. E chere m na ọtụtụ mmadụ na-ahụ ịdị ọcha otu a. Ọ bụ ihe niile n'agbasaghị mmetụta anụ ahụ. Kemgbe ahụ, amụtara m na ọ karịrị nke a. Ịdị ọcha bụ ihe gbasara obi gị.
Ịdị ọcha a bụghị naani maka mmadụ emeghị ihe, ọ karịkwa ime ihe. Mgbe mụ na James na-akpa, kama naani ịzere ihe ọ bụla, anyị họọrọ ibu ụzọ chụso Kraịst. Mgbe ị ji obi gị niile chọọ Chineke, Ọ ga-enyere gị aka ịdị ọcha. Ugbu a anyị lụrụ, anyị ka dị ọcha. Mana nke ahụ apụtaghị na anyị adịghị enwe mmekọ dị na nwunye! Agaghị m echefu otu ntabi anya na ezumike anyị. N'ịbụ onye jupụtara n'ọmịiko, achọpụtara m otu alụmdi na nwunye si dị nsọ n'ezie. Elere m James anya, sị, “A ghọtara m ya ugbu a, karịa oge niile gara aga. Ịhọrọ ịdị ọcha bara ezigbo uru. ” Ya bụ, ọ bụrụgodi na i mehiere, ị ka nwere ike họrọ ịdị ọcha n'ihi na ịdị ọcha bụ iji obi gị niile na-achụso Kraịst. A na m ekwe gị nkwa - ọ bara uru.
Jemes:
E toghi m gburugburu ụlọ ụka, dika Mandy. Ịdị ọcha bụ nnọọ nnukwu ihe ịma aka n'iru. N'oge m dị afọ iri na ụma, a zụrụ m echiche m n'ụzọ na-adịghị mma banyere ụmụ nwanyị na banyere mmekọrịta na-emebi ihe nke na-akpali agụụ mmekọahụ. Mgbe m gụsịrị ụlọ akwụkwọ sekọndrị, enyefere m Kraịst ndụ m. Ama m na m chọrọ ịlụ onye ji ihe niile ha nwere chụso Jizọs. Amakwa m na ị nweta nwa agbọghọ dị ka nke ahụ pụtara na ọ dị m mkpa iji nrubeisi na-eso Jizọs. Ya bụ, agbanwere m ntọala ekwentị m ka m n'enweta naanị weebụsaịtị m chọrọ maka ọrụ. Ọzọkwa, enwere m ezigbo enyi m na-ajụkarị m otú m mere. Ụkọchukwu m, Craig Groeschel, kwuru nke ọma mgbe ọ sịrị, "Gịnị kpatara iguzogide ọnwụnwa echi nke ị nwere ike ịwepụ taa?" Otu afọ anyị lụrụ, mụ na Mandy ghọtara na nkwa ịdị ọcha ka dị mkpa taa dịka ọ dị tupu anyị ezute. Dịka Mandy kwuru, ọ bara uru n'ezie.
Gwa mmadụ: Ọ bụrụ na ị na-alụ ọgụ maka ịdị ọcha ma ị lụọla ma ọ bụ na ị lụghị dị na nwunye, taa bụ ụbọchị ị ga-emepe ndụ gị ma gwa ndị ị hụrụ n'anya ma na akwanyere ùgwù. Ihere na-enwe ike nime ọchịchịrị, mana emewo ka ị nwere onwe gị site n'ìhè nke ụwa bụ Kraịst!
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
N'ime Atụmatụ Akwụkwọ Nsọ ndi Life.Church a, di na nwunye isii na -ede maka nkwa agbamakwụkwọ isii nke ha na -ekwughi n'ihu ọha ebe ịchụàjà. Nkwa ndị a nke nkwadebe, ihe kacha mkpa, nchụso, mmekọ, ịdị ọcha na ekpere bụ nkwa na -eme ka alụmdi na nwunye rụọ ọrụ ogologo oge gafere agbamakwụkwọ. Ma ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na -eche maka ya, oge eruola ime nkwa ahụ
More