Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nkwa AhụIhe Atụ

The Vow

ỤBỌCHỊ 4 NKE 6

Nkwa nke Mmekọrịta

Ha lụrụ afọ iri na asaa, Michael na Shelley rụkọọ ọrụ ọnụ, gwukọọ egwu ọnụ, rikọọ nri ọnụ, hụ ibe ha n'anya, ma mụọ ụmụ nwanyị atọ ọnụ. Ha na-ahụ alụmdi na nwunye dị ka njikọ nke “otu anụ ahụ́”. Mana ọ dịghị otu a mgbe niile.

Shelley:

Na mmalite alụm di na nwunye anyị, a nam atụ egwu oge ịgba bọl. Michael ga-achọ ịnụ ụtọ ụbọchị ịgba bọl ebe m hụrụ Satọdee dịka ụbọchị “i me obiutom”. Mgbe ọtụtụ oge bọl gara, ekpebiri m ikpe ekpere. Naanị ihe m chọrọ ịme ka m chọrọ ka di m mee (ịchọ ọdịmma onwe, a mam). Chineke nyeere m aka n'echiche dịka nke a, “Ị nwere ike ịhụ ihe ọ hụrụ n'anya n'anya?” Bọọlụ Satọde wee ghọrọ ihe “anyị”. Ihe mere ọzọ bụ na Michael malitere ịkwụsịtụ egwuregwu ahụ iji nyere m aka n'ọrụ m. Chineke nyeere m aka ịghọta na anaghị m emeso di m ihe dị ka onye n'enwe ezi mmekọrịta. N'ezie, aghọtaghị m ihe mmekọ bụ. Taa, alụmdi na nwunye anyị siri ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Anyị bụ otu anụ ahụ - eriri atọ enweghị ike ịgbaji ngwa ngwa. Ma nke ahụ bụ n'ụzọ dị ukwuu n'ihi na anyị amụtala ịhụrịta onwe anyị n'anya site n'ịhụ ihe onye nke ọzọ hụrụ n'anya.

Michael:

Mụ na Shelley abụwo ndị mmekọ ruo nwa oge, ya bụ na ọ dị mfe iwere ya dị ka obere ihe. Mgbe ụfọdụ ọ na-adị m ka ọ bụ m na-arụ ọrụ niile. A nam eche na ọ na-eche otu ihe ahụ gbasara m. N'oge na-adịghị anya, Shelley a nọghị n'ụlọ otu izu ụka zuru oke. Nanị ịkpụ ntutu, ịkwa nri ehihie, mee kọfị, ma mee ka ụmụaka banye na ụgbọala — ihe ndị anyị na-emekọ ọnụ kwa ụbọchị — karịrị akarị. Ọ gaara afọ iri na asaa anyị na-alụ dị na nwunye, ma m ka na-amụta na anyị nwere ike pụrụ iche na njikọ a. Ike ya na-akwado adịghị ike m, otu aka ahụ ike m na-akwado ya. Anyị dabara onwe anyi. Anyị abụọ na-aghọ “otu anụ ahụ́”. Ọ bụghị na ọ mere ka m zuo oke. Naanị Chineke na-eme nke ahụ. Mana, n'ebe Chineke nọ, anyị bụ mmadụ abụọ zuru oke, na-amụnye ọkụ n'ime onwe anyị, wee ghọkwa ihe ọhụrụ. N'eziokwu, anyị dị mma mgbe anyị na-emekọ ọnụ.

Kpee ekpere: Chineke, nyere m aka ịhụ alụmdi na nwunye dịka mmekọ nke agụụ mmekọahụ, abụọ na-aghọ otu. Nyere m aka ịghara ilekwasị anya n'ọchịchọ nke m ma ọ bụ nke di ma ọ bụ nke nwunye m, mana n'ebe ị nọ. Nyere m aka ịbịa n'alụmdi na nwunye site n'ịdị njikere maka mmekọrịta ọnụ.

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

The Vow

N'ime Atụmatụ Akwụkwọ Nsọ ndi Life.Church a, di na nwunye isii na -ede maka nkwa agbamakwụkwọ isii nke ha na -ekwughi n'ihu ọha ebe ịchụàjà. Nkwa ndị a nke nkwadebe, ihe kacha mkpa, nchụso, mmekọ, ịdị ọcha na ekpere bụ nkwa na -eme ka alụmdi na nwunye rụọ ọrụ ogologo oge gafere agbamakwụkwọ. Ma ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na -eche maka ya, oge eruola ime nkwa ahụ

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka imeputa nhazi a. Maka ihe ndi ozi bara uru, biko gaa na: https://www.life.church/