Jizọs, Achọrọ M Gị!Ihe Atụ
![Jesus, I Need You! Prayer](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F37140%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Ekpere Nke Taa
Jizọs, achọrọ m Gị! Ị bụ Onyenwe m, Chineke m, Eze m na Onye-Nzọpụta m. I tozuru oke inara ofufe m niile. Nyere m aka, site n’amara Gị, ịmata Gị na ịhụ Gị n’anya nke ukwuu na n'ụzọ dị omimi nke na ihe nke ụwa a abaghịzi uru nye m ma ha adị ka ihe nwụrụ anwụ n’ìhè nke ebube na amara Gị. Achọrọ m ife Gị na naanị Gị. Achọghị m isonye n'otù ụwa a si eme ihe. Achọrọ m ka I kpụọ m ma mee m ka m yie Gị. Anọ m n'ime Gị; Achọrọ m ka mụ na Gị bụrụ otu. Mee ka obi m rapara na nke Gị, tinyekwa eziokwu Gị n'ụzọ dị omimi n'ime m. Ọ bụghị nanị na m chọrọ ịmata Gị na Okwu Gị, kamakwa a chọrọ m inwe ọchịchọ nke ịhapụ mmehie m ma soro Gị na Okwu Gị. Nyere m aka ịhụ mmehie m, bee ákwá n'ihi mmejọ m mejọrọ Gị site na mmehie m, ma hapụ yabụ mmehie, site n’amara Gị. Nyere m aka inwe agụụ na ọchịchọ n'adịghị akwụsị akwụsị maka ezi omume. Nyere m aka ife Gị ofufe n'ime mmụọ na n'eziokwu!
Jizọs, achọrọ m Gị. A ga m echeta na n’ime Gị ka ejiriwọ̀ ngọzi ime mmụọ niile gọzie m n’ebe niile dị elu n’eluigwe. Chineke, bụ́ Nna, rọputara m mgbe akātọghị ntọ-ala ụwa, ka m wee dị nsọ, n'enweghị utá n'iru Ya. N’ịhụnanya Ya, Ọ zụtara m site n’ọbara Gị dị oke ọnụ ahịa, ọbara nke Ọkpara Ya. Achọrọ m ibi ndụ n'ụzọ kwekọrọ n'eziokwu a dị ebube. Achọrọ m ike Gi, amara Gị, na ihunanya Gị ka n'agbanyeghị ihe ndụ wetara ụzọ m, aga m azaghachi ọnọdụ ọbụla, onye ọbụla, na ngabiga ọbụla otu I ga-esi zaghachi—ihe nile maka ebube Gị. Achọghị m iji anụ ahụ m zaghachi, kama achọrọ m ime nzaghachi site n'ime mmụọ m. Achọrọ m irapara n'akụkụ Gị, Jizọs, ka Mmụọ Gị si n'ime m pụta ìhè n’ihe niile m na-ekwu ma na-eme. Ka m chọta ọn̄ụ m n’ime Gị wee nye Gị otuto.
Jizọs, achọrọ m gị. Nye m amara Gị, ebere Gị, na imanma Gị ka m wee nwee ike ịhụ Gị, mara Gị, hụ Gị n'anya, na soro Gị n'eje ije. N'agbanyeghị ebe m nọ, ihe m na-eme, ihe m na-eche, akụkụ Akwụkwọ Nsọ m na-agụ, ma ọ bụ abụ m na-abụ, ka uche m, ume m, na obi m gbadoó ụkwụ na Gị, a bụghị na mụ, na ihe m na-agabiga. Achọrọ m Gị na naanị Gị. Ka ala-eze-Gị bia, ka emee uche-Gị, n'elu ụwa a dika esi eme ya n'elu-igwe.
I meela, Onye-nwe-anyị na I kwere anyị nkwa n’Okwu Gị na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọ bụla n’aha Gị nakwa dị ka uche Gị si dị na I ga-eme ya. Jizọs, n’aha-Gị ka m n'ekpe ekpere, Amen.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
![Jesus, I Need You! Prayer](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F37140%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Inwe Jizọs dị ka enyi na ndụ gị ọ bụ ihe dị gị oké mkpa? Atụmatụ ihe ọgụgụ a nke ụbọchị atọ bụ nke emebere iji mee ka ọnịnọ gị na Jizọs dịkwuo oké omimi ma nyere gị aka itikụ̀ Ya. Ọ bụkwa ekpere nsogidé nye usoro agụmagụ bụ “Jizọs, Achọrọ M Gị” sitere na Thistlebend Ministries.
More