Jizọs, Achọrọ M Gị!Ihe Atụ
Ụbọchị ugbu a nwere ike ịjụpụta n'ihe gbasara naanị onwe anyị, n’amaghị ama, mana ihe kwesịrị ịbụ agụụ nke obi anyị bụ ka Kraịst mejupụta Onwe-Ya n'ime anyị. Ọ na-esikarị ike ịmata otù ụzọ anyị si dị iche n’ụzọ Ya, n’agbanyeghị ụdị ụlọ a zụlitere anyị n'ime ya, ezinụlọ kwenyere na Kraịst ma ọ bụ ndị na-abụghị Ndị Kraịst, n’ihi mmehie bi anyị n'ime, anyị enwetawo àgwà, otu esi eme ihe, otu esi eche echiche, na ịtụgharị uche site n’ọtụtụ ebe ndị ọzọ na-abụghị nke sitere na Jizọs Kraịst, n’amaghịdị na anyị n'eme otu ahụ.
Nke a bụ ihe mgbaru ọsọ Pọl: “Mụ ịdị ndụ bụ Kraịst” (Ndị Filipaị 1:21). Pọl esiteghí na mbụ mee ka Kraịst bụrụ ndụ ya. Ọ bidoro mewe nke a naanị mgbe Jizọs zutere ya n'okporo ụzọ Damaskọs wee kusuo ya maka mmehie ya, na mgbe site n'amara emere ka ọ bịaruo nso wee mara onye Jizọs bụ n'ezie (Ọrụ Ndị Ozi 9:1-19). Rịọ Jizọs ka O mee ka Ọ bụrụ IHE NIILE nye gị! Tikuo Ya ma riọ Ya ka O nye gị ike ibu ụzọ chọọ Ya dịka O nyere iwu na Matiu 6:25-33."Jizọs, achọrọ m Gị. Enweghị m ike ime ihe ọbụla na ndụ ma e wezụga Gị."
“Jizọs, ị bụghị naanị echiche isi nke mmadụ, ndepụta nke ihe ndị aga eme na ndị a na-ekwesịghị ime, usoro okpukperechi, ma ọ bụ ihe a ga-alụ ọgụ maka ya. Achọrọ m Gị, Ị dị m mkpa! Achọrọ m ịma Gị nke ọma karịa ka m si mara onye ọ bụla—ndị ezinụlọ m, ndị enyi m, enyi m kacha hụ n'anya—ọbụna mụ onwe m. Achọrọ m ka Ị nọnyeere m ugbu a, ebe a m nọ. Ọ n'agụsi m agụụ ike ka mụ na Gị nọkọọ, ka m n'ahụ ihu Gị, wee na-ajụ gị ajụjụ ndị n'enye m nsogbu n'echiche ma chọọ irugbụ̀ obi m. Achọrọ m ka ọ dị m mfe igbakwurú Gị, tukwasị isi m n'ubu Gị, wụputasia ihe niile jụrụ m obi, ma hụ Gị ka ị n'amaku m wee na-agwa m eziokwu—ọbụna eziokwu siri ike. Achọrọ m enyemaka Gị, amara Gị, ebere Gị. Enweghị m ike ije ije ndụ a naanị m."
Maka ọgụgụ nke taa, mechie site n'iji Matiu 6:25-33 kpee ekpere. Echi na ụbọchị n'esote ya, anyị ga-enye ekpere ndị ị nwere ike n'ekpe kwa ụbọchị ogologo oge ị nwere mkpali idi n'ekpe ha. Otuto niile dịrị Chineke!
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Inwe Jizọs dị ka enyi na ndụ gị ọ bụ ihe dị gị oké mkpa? Atụmatụ ihe ọgụgụ a nke ụbọchị atọ bụ nke emebere iji mee ka ọnịnọ gị na Jizọs dịkwuo oké omimi ma nyere gị aka itikụ̀ Ya. Ọ bụkwa ekpere nsogidé nye usoro agụmagụ bụ “Jizọs, Achọrọ M Gị” sitere na Thistlebend Ministries.
More