Ibi Ndụ Gbanwere-Agbanwe: N'ime Afọ ỌhụrụIhe Atụ

Ibi Afọ Ná Nyefè
Mbido afọ bụ oge kachasị mma iji kwụsịtụ wee mee ntụgharị uche—a bụghị naanị iji hụ ihe niile kpataranụ anyị kwesịrị iji nwee ekele, ma ọ bụkwà nke iji gwọọ ọnyá obi anyị na too ka afọ n'aga.
Ka anyị n'eme ntụgharị uche, ihe ọjọọ gasị ndị e mere anyị nwere ike ị n'achigharí anyị n'obi. Kama imesò mmetụta ndị ahụ omume dịka o nweghị ihe ha pụtara ma ọ bụ kwe ha ka ha too ghọọ obi ilu, anyị nwere ike ịhọrọ ntọhapụ n'agbụ nke mgbaghara. Ma nzọụkwụ nke mbụ ime mgbaghara bụ ịnyefe onwe anyị.
“Nyefè” nwere ike ịbụ otu n’ime okwu ndị ahụ n'adịghị adị ndị mmadụ mma n'obi, karịsịa mgbe o metụtara mgbaghara. Anyị na-ahụta ya dịka ịda mbà na-agha—ifé ọkọlọtọ ọcha n'elu ma n'ekwe ka ndị iro bịa wakpọọ anyị. Mana mgbe anyị buurù onwe anyị nyefee Chineke, anyị na-ahụta ya n'ụzọ dị iche.
Nye Chineke, nyefé ndụ anyị n'aka Ya pụtara ịchịri ihe niile gbasara onwe anyị chinye n'aka Ya ma hapụ Ya ka O tụọ ndụ anyị ka O si masị Ya—ọbụna ihe mgbu anyị na obi mgbawa anyị ka O wee gwọọ anyị ha. O jupụtara na ịhụnanya, ebere na ọmịiko nye onye ọbụla n'ime anyị. Anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ inye Chineke ihe mgbu anyị n’ihi na anyị pụrụ ịtụkwasị Ya obi na Ọ ga-adị nrò, ma jiri nlezianya lekọta obi anyị.
Anyị pụkwara ịtụkwasị Chineke obi ime ihe ziri ezi. Ọ bụ atụ́manya anyị dịka mmadụ ka onye mere anyị ihe ọjọọ taa ahụhụ maka ihe ahụ o mere anyị. Ọbụna Chineke nwere iwe ezi omume megide mmehie na ikpe n'ezighị ezi. Mana anyị kwesịrị ịnakwere na ọ bụ naanị Chineke pụrụ ikpe obi mmadụ ikpe. Ọ bụghị anyị ka ọ dịịrị ikpebi ma mmadụ ọ ga-anata ntaramahụhụ ma ọ bụ amara, ma ijigidesi-ike atụmanyá anyị na agụụ obi anyị ka mmadụ nata ụgwọ ihe ọjọọ o mere anyị naanị ga-eme ka anyị ghọọ ndị ilu jupụtara n'obi ha.
Ọ bụrụ na anyị chọrọ ibi n’udo n’afọ a, ọ dị mkpa ka anyị nyefee Chineke iwe anyị na mpako anyị ma jiri nwayọọ leba anya n'obi anyị. Anyị ga-eji aka anyị kpebie ichísa obi mgbu anyị na ọchịchọ anyị nke ịnọgide n'elu ihe na ijikwa ihe, n'ụkwụ Ya, ma rịọ Chineke ka O rụọ ọrụ dị ebube n'ime ndụ anyị. Ọ dị mkpa ka anyị kweta na anyị chọrọ enyemaka Ya.
Dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst, mgbaghara bụ ihe anyị n'eme kwa ụbọchị—ọbụna mgbe anyị n'achọghị ime ya. Oge ụfọdụ mgbe anyị n'enwe mgba nke ime mgbaghara, anyị n'enyefe Chineke otu ihe mgbu ahụ ugboro ugboro. Mgbe ihe ọjọọ ndị ahụ e mere anyị gará agá pụtara ọzọ n'obi anyị, anyị n'eme mgbaghara ugboro ugboro ruo mgbe o dịghị afụ anyị ụfụ n'obi ọzọ. Site n'amara Chineke, ọ dịghị ihe a na-apụghị ịgbagharà.
Ugbu a, mgbaghara apụtaghị na ihe merenụ dị mma. Ọ pụtaghị na anyị ga-ekwe ka ndị mmadụ ka na-emejọ anyị. Ọ pụtaghịkwanu ka anyị na onye ma ọ bụ ndị ahụ mejọrọ anyị nwee mkparịta-ụka ihu n'ihu—ọ dịghịkwanu mkpa ka onye ahụ mejọrọ anyị ká dị ndụ ka anyị gbaghara ha n'ihi na mgbaghara anyị n'eme abụghị maka ha. Ọ bụ nkwenye n'otu oge dị n'etiti anyị na Chineke. Ọ bụ maka ịnabata Ya n'ime obi anyị ka Ọ wee gwọọ obi anyị.
Eburulá iwe na ọnụma nke afọ gara aga wee bata n'ime afọ ọhụrụ a. Ọ bụrụ na o nwere ihe dị mkpa ka ị mee mgbaghara banyere ya, wepụta nwa oge kpee ekpere ma nyefee ya n'aka Chineke. Gwa Ya na ị chọrọ enyemaka Ya na ị tụkwasịrị Ya obi maka ihe ga-esi na ya pụta.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Afọ ọhụrụ ọ bụla n'eji ohere maka mmalite ọhụrụ abịa. Ekwela ka nke a bụrụ afọ ọzọ na-amalite site na mkpebi ndị ịma na ị gaghị edebe. Atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị anọ a ga-eduzi gị na ntụgharị-uche ma nye gị echiche ọhụrụ ka ị wee nwee ike ime ka afọ a bụrụ nke kachasị mma nye gị ma n'aga n'ihu.
More