Ibi Ndụ Gbanwere-Agbanwe: N'ime Afọ ỌhụrụIhe Atụ

Jiri Ekele Baa N'ime Afọ Ọhụrụ
Kedụ otù ị ga-esi malite afọ ọhụrụ? Ọ bụrụ na afọ gara aga siri ike ma ọ bụ bụrụ nke nkụda mmụọ jupụtara na ya, ọ ga-abụ ihe ụtọ nye obi gị isi ụdị afọ ahụ laa nke ọma ma gị achifuo ihe ọbụla gbasara ya. Mana tupu gị kpochapụ ihe niile gbasara afọ gara aga, jiri nwayọọ wepụta nwa oge iji mee ntụgharị uche ma kelee Chineke.
Abụ Ọma nke 100 na-agba anyị ume ka anyị banye n'ọnụ ụzọ Chineke jiri ekele na ebe obí ikpe Ya gasị jiri otuto—a bụghị n'ihi ọnọdụ anyị gasị magburu onwe ha, kama ọ bụ n'ihi na Chineke dị oké mma. E nweghị ụzọ kachasị mma iji bido afọ ọhụrụ karịa ikele Chineke maka Onye Ọ bụ na ihe niile O meere anyị.
Kelee Chukwu maka ezinụlọ gị, ụgbọ ala gị, ma ọ bụ ọrụ nke ị n'arụ ị hụrụ n'anya. Gwa Ya na ị dị ekele maka ikuku ị n'eku ka ume, ahụ ike gị, ma ọ bụ ọbụna ezinụlọ gị n'enye gị nsogbu. Kelee Ya maka inye gị nduzi na mgbamume site n'Okwu O kwuru n'ime Akwụkwọ Nsọ. Ma kelee Ya maka izite Nwa Ya Nwoke bụ Jizọs, ka Ọ bịa nwụọ ọnwụ Ọ na-ekwesịghị ịnwụ iji nye gị onyinye nke ndụ ebighị-ebi ị n'emekataghị nweta n'ike nke aka gị.
Mgbe anyị na-ekele Chineke, anyị na-asị na ike Ya, ọnịnọ Ya, na onyinye Ya gasị n'ime ndụ anyị doro anyị anya, na anyị agaghị ma ọ bụ nwekata gọnarí ha. Ọ na-agbanwe ụzọ anyị si ele Chineke anya, ọ na-agbanwekwa ụzọ anyị si ahụta ọnọdụ anyị. Ọ bụrụgodị na ihe siri ike, ọ gaghị ekwe omume ịnọdụ ala n'echekasị ma n'ewe iwe ma ọ bụrụ na anyị n'eto Chineke. Inye Chineke ekele n'eme ka anyị wepụ anya anyị na mgbu na nrụgide gasị nke ndụ anyị wee lekwasị Ya anya. Mgbe anya anyị dịkwasịrị na Ya, naanị ihe anyị pụrụ ịhụ bụ ka O si buo ibù, nke n'echetara anyị na ọ dịghị mkpa anyị ọbụla dị ukwuu karịa Chineke anyị dị ike.
Site n'ibú ụzọ towe Chineke, anyị na-agbanwe ka anyị si abịakwute Chineke. Ị sí daalụ maka ihe ndị anyị nwere tupu anyị ebido ịrịọ arịrịọ maka ihe ọbụla ọzọ n'enye anyị ohere ka obi anyị na nke Ya kwekọọ. Ọ na-enyere anyị aka ka anyị weda onwe anyị ala wee wepụ echiche obi anyị nke bụ na Chineke kwesịrị inye anyị ihe niile na ihe ọbụla anyị rịọrọ Ya, nke na-apụta na ọ bụrụgodị na O nyeghị anyị ihe anyị rịọrọ Ya, anyị ga-adị ncheta nke àgwà Ya, nkwa Ya gasị, na ịhụnanya Ya n'ebe anyị nọ.
Iji ekele malite ekpere bụ otu ụzọ esi eme nyefé. Ọ bụ nkwupụta sitere n'ime obi anyị na ọ bụghị gbasara anyị, mana ihe niile bụ maka Ya. Ọ n'eme ka nlekwasị anya anyị na echiche anyị dị n'ihe Eluigwe ma n'eme ka ịhụnanya anyị n'ebe Chineke anyị nọ dịkwuo ime.
Were nwa oge jiri anya ekele lee afọ gara aga anya ọzọ. Gwa Chineke otu ihe ịdị ekele maka ya ụbọchị taa, ọ bụrụgodị na ọ dị mpe ma ọ bụ dịka ihe na-abaghị uru. Ị nwere ike ina eme nke a kwa ụbọchị ma ọ bụ kwa izu. Depụta ihe ndị ị chọrọ ikele Chineke maka ha n'ime foonu gị, malite ihe odide kwa ụbọchị nke ihe ndị ịdị ekele maka ha, ma ọ bụ bipute ha n'ihe ma ọ bụ n'ebe mgbasa-ozi-ọha ka ị wee n'ahụta aka ọma Ya na ikwesị ntụkwasị obi Ya osiiso n'afọ ọhụrụ a.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Afọ ọhụrụ ọ bụla n'eji ohere maka mmalite ọhụrụ abịa. Ekwela ka nke a bụrụ afọ ọzọ na-amalite site na mkpebi ndị ịma na ị gaghị edebe. Atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị anọ a ga-eduzi gị na ntụgharị-uche ma nye gị echiche ọhụrụ ka ị wee nwee ike ime ka afọ a bụrụ nke kachasị mma nye gị ma n'aga n'ihu.
More