Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ike otuto pụrụiche: Nraranye ụbọchị 5 sitere na Abụ ỌmaIhe Atụ

The Extraordinary Power of Praise: A 5 Day Devotional From the Psalms

ỤBỌCHỊ 5 NKE 5

Ito Chineke Na-Eweta Mmeri

Anyị nwere onye iro chọrọ ịpụnara ihe, zuo ohi, gbụọ ma bibie. Ọ na-arụ ọrụ kafee oge iji napụ anyị obi isi ike anyi ma zuru oke obi inwu okụ anyị. Ọ bụ onye asi na onye ebụbọ. Aha ya bụ Ekwensu. Agbanyeghi otú ọ dị, Chineke enyela anyị ngwá agha ndị anyị pụrụ iji lụọ agha mgbe Ekwensu na-enyesi anyi nsogbu ike. Anyị nwere ike iji Okwu Chineke na Otuto kụgbụọ onye iro. Ngwá agha abụọ ndi a, ejikọta ha onu ga-egwepịa ya bụ onye iro n'okpụrụ ụkwụ gị. Nke a bụ ihe eziokwu, Ekwensu na-enwe nfụkasị ahu banyere otuto. Mgbe ị nwere mmetụta na ọ na-agbalị imeri gị ma ọ bụ zuru obi isi ike gị, malite towe aha Jizọs Kraịst. Ka ị na-ebuli Jizọs Kraịst elu maka Onye Ọ bụ, Ekwensu ga-agba ọsọ dị ka onye ụjọ.

A na-ahụ ihe eziokwu a n'akụkọ Jehoshafati onye dụụrụ ndị agha Juda pụta ka ha bụsọ ndị iro gbara ha gbụrụgbụrụ agha. Kama ibu ụzọ zipụ ndị agha, Eze Jehoshafati zipụrụ ndị ukwe ndị nọ n'abụ, “Keleenụ Onye-nwe-anyị n’ihi na ịhụnanya Ya na-adịgide rụọ mgbe ebighị ebi” (2 Ihe E Mere 20:21). Dị ka ndị ukwe n'abụ abụ, Onye-nwe-anyị zipụrụ ndị agha ndi zọrọ ezọ megide ndị iro wee merie ha nile. Ọ bụ akụkọ dị ike na-egọsi ka itọ Chineke si emeri onye iro n'ime ndụ anyị.

Selah – Kwụsịtụ ma tụgharịa uche: N’akụkụ ndu gi nke dị añaa ka ọ na-agụsi gi agụụ ike ịhụ mmeri? (dika ịhụ ya bụ mmeri n’elu nchegbu, egwu, ihe iri ahụ, ihe ndị metụtara nri..) Olee otú ị si hụta ito Chineke na e nwetegọri mmeri site n’aka Jizọs Kraịst?

Ekpere otuto: Onye-nwe-anyị Jizọs, ana m ebuli Gị elu, n’ihi na site n’enyemaka Gị, ana m agafe ọnọdụ ọbụla nke dika enweghị m ike imeri ya. Site n'ike Gi ka ọchichiri na ēchighari buru ìhè. Daalụ, na mgbe ụjọ na-atụ m, ọnụnọ Gị nọnyeere m. A na m eto Gi na Ị kwere nkwa idu m na mmeri ka m tụkwasịrị Gị obi. Nna Chineke, a na m ekele Gị na site na Kraịst enwere m mmeri n'ime ọnọdụ ọ bụla. Ọ dịghị ngwa agha a kpụworo imegide m nke ga-aga nke ọma. Ana m ekele Gi, Onye-nwe-anyi Jizọs, na enwere m ike igụzọ n'ime mmeri Gi taa.

Abụ Ọma 18:46-49, “Chineke dị ndụ! Otuto diri Nkume m! Ka Chineke dị elu, Onye nzọpụta m! Ya Onwe-Ya bu Chineke n'ābọ̀ro m ụbọ̀, Nke n'ēme ka mba niile di ala n'okpụrụ m, Onye n'ānapụta m n'aka ndi-iro m. Ị bulirim elu kari ndi-iro m; Ị napụtara m n'aka nwoke na-eme ihe ike. N'ihi nke a ka m ga-ēkele Gi, Onye-nwe-anyị, n'etiti mba nile; Aga m abụrụ aha Gi abụ otuto.”

Maka enyemaka ndị ọzọ imeri nchekasị, sonyere Becky Harling maka ihe ọmụmụ izu uka isii banyere Abụ Ọma nakwa Ike Pụrụiche Nke Otuto.

Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

The Extraordinary Power of Praise: A 5 Day Devotional From the Psalms

Nchegbu, egwu, owu ọmụma na ịda mbà n'obi amalite go nke ukwuu n'ime afọ ole na ole gara aga. Ndị ọbụ abụ abụghị ndị ọhụrụ n’ahụ́ mmetụta ndị a. Otú ọ dị, ha mụtara iwepụta ike pụrụ iche dị na abụ nke otuto ji emerie. Chọpụta ihe nzuzo iji dajụọ n'ime ofufe ndị a sitere na Abụ Ọma.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Moody Publishers maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.moodypublishers.com/the-extraordinary-power-of-praise/