Ike otuto pụrụiche: Nraranye ụbọchị 5 sitere na Abụ ỌmaIhe Atụ
Itọ Chineke N'Azulite Afọ Ọjụjụ
Ọ dị mfe n'omenala anyị ugbu a ịkwa akwa na ịsụ ude maka ihe anyi n'enweghị. Anyị na-eji ọnọdụ anyị n'atụnyere ndị enyi anyị, ya ana-adịkwa anyị ka hà n'ebi ndụ di nma karịa anyị. N'ihi afọ anyị n'ejughi eju, anyị n'amalite ịtamu ntamu na ekpesakwa. Devid dere na n'ihi na Jehova bụ onye ọzụzụ atụrụ ya na ọ dịghị ihe kọrọ ya (Abụ Ọma 23:1). N’Abụ Ọma ọzọ, ọ dere si, na naanị Jehova bụ òkè ya na ikọ ya (Abụ Ọma 16:5).
Gịnị bụtere Devid n'ebe nke afọ ojuju a dị ukwuu? E kwenyere m na ọ bụ nhọrọ ya idi n'aga n'ihu na-eto Chineke. Mgbe anyị n'atụle ma na-eme mkpesa, anyị na-efopụ afọ ojuju anyị. Otú ọ dị, nke dị iche bụkwa eziokwu. Ka anyị na-eto Chineke ma na-efe Ya, otú ahụ ka anyị na-enwekwu mmasị na Ya. Ka anyị na-enyekwu Ya ekele, ka anyị na-enwekwu ihe iji nye Ya ekele. Ka anyị na-egosipụtakwu ịhụnanya anyị n’ebe Ọ nọ, otú ahụ ka anyị na-ahụkwu Ya n’anya. Obere obere e nwee nghọta na Ya bu Chineke – puru inyezu ihe niile – zụrụ oke. N'ezie, Ọ zuru oke karia oke! Mgbe ahu anyi e nwee ike ikwu ka Devid siri kwụọ ma site n'eziokwu anyi nwere ike itipụta si, “O nweghi ihe kọrọ m!”
Gịnị kpatara na ị gaghị agbali ito Ya nkeji iri na ise kwa ụbọchị n'ime ụbọchị ise na-esote. Ị nwere ike idepụta àgwà Ya ndi nke ị na-enwe ekele maka ha. Ma ọ bụ, ị nwere ike iji egwu ofufe kpalite ọtụtọ gị. Otu isi eme ya adighi oke mkpa. Gbalia nyewe ekele ma hụrụ ihe ga-emewe n'ime mkpụrụ obi gi.
Selah – Kwụsịtụ ma tụgharịa uche: Ị bụ udi mmadu n'atụkari atụ ma n'ekpesa? Olee otú ọ ga esi adị ma gị nwee afọ ojuju nke ukwuu n’ebe Jizọs nọ nke ga-eme na ị pụrụ isi n’ebe eziokwu kwụọ sị, “Ọ dịghị ihe kọrọ m?”
Ekpere ọtụtọ: Onye Di Nsọ, a na m ekele Gị na Ị bu Chineke nke zuru oke, buru Chineke na-enye ihe niile ndu. Ọ nweghị ihe ọ bụla kọrọ Gi ma Ị kwere m nkwa na Ị ga-enye m ihe niile m chọrọ. Ana m efe Gị ọfụfe maka na Ị bụ òkè m na ihe nkenye m nke oriri. N'ime Gị, ana m achọta afọ ojuju udo nke gafere nghọta niile n'ihi na a ghọtara m na Ị bụ Chineke na-emesapụ aka burukwa Chineke nke ịhụnanya. Ihe niile m chọrọ ana m ahụ n'ime Gị. Daalụ na enwere m ike zuru ike ma nwee ahụ iru ala n'ime Gị n'ihi na Ị nwere ihe niile na-nchịkwa. Ana m ekele Gị ma na-efe Gị dị ka Onye nsọ m, Chineke zuru oke.
Abụ Ọma 16:5, Onye-nwe-anyị, nanị Gị bụ òkè m buru ikọ m; Ị na-eme ka nkenye m dị nchebe.”
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Nchegbu, egwu, owu ọmụma na ịda mbà n'obi amalite go nke ukwuu n'ime afọ ole na ole gara aga. Ndị ọbụ abụ abụghị ndị ọhụrụ n’ahụ́ mmetụta ndị a. Otú ọ dị, ha mụtara iwepụta ike pụrụ iche dị na abụ nke otuto ji emerie. Chọpụta ihe nzuzo iji dajụọ n'ime ofufe ndị a sitere na Abụ Ọma.
More