N’sachapụ Mkpụrụ ObiIhe Atụ
Ndụ anyị juputara na nsị omenala, nke bụ ihe ndị ahụ nabatara nke omenala, mana na-emerụ mkpụrụ obi anyị ahụ. A pụrụ ịchọta nsị omenala n’akwụkwọ anyị na-agụ, magazin anyị na-agụ, egwú anyị na-ege, ihe omume telivishọn anyị na-ekiri, na ihe nkiri sịnịma anyị na-ekiri. Mgbe anyị kwere ka nsị omenala banye na ndụ anyị, ọ na-emetọ anyị. N’izu a ị ga-amata ihe Okwu Chineke kwuru gbasara ihe ọghọm dị na nsị omenala na mkpa ọ dị ilekwasị anya n’ihe ga-eme ka anyị bịarukwuo Chineke nso.
Kedu ụfọdụ nsị omenala ị nwere ugbu a na ndụ gị? Kedu ka ị hụworo nsị a si emebi ndụ gị?
Kedu ụfọdụ nsị omenala ị nwere ugbu a na ndụ gị? Kedu ka ị hụworo nsị a si emebi ndụ gị?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Anyị abụghị ahụ́ nke nwere mkpụrụ obi. Anyi bu nkpuru obi nwere aru. Ọ bụ ezie na ụwa na-akụziri anyị n'ụzọ ziri ezi ka anyị dozie ahụ anyị, oge ụfọdụ anyị kwesịrị ịgbanwe mmụọ anyị. Atụmatụ ụbọchị-35 a ga-enyere gị aka ịmata ihe mkpụrụ obi gị na-akụda, na ihe na-egbochi gị ịghọ onye Chukwu kere gị ka ị bụrụ. Ga-amụta site n’Okwu Chineke otu ị ga-esi kwụsị mmetụta ndị a na-emebi ihe ma were ibi ndụ dị ọcha maka mkpụrụ obi gị.
More
Anyi ga acho ikele Pastor Craig Groeschel na Life.Church maka iweputa nhazia. Maka nhe ndi ozi bara uru, biko hu:www.life.church