Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Banye na NzubeIhe Atụ

Step into Purpose

ỤBỌCHỊ 5 NKE 5

Zọba Ụkwụ N'Nzube Site N'Ije Ọzi Na-abughi Naani Maka Nke Onwe Onye

Pọl kpọrọ ndị Galeshia ka ha bie ndụ nke na-egosipụta mmesapụ aka nke na achọghị naani ọdịmma onwe onye, nke dị iche n'ụwa na-eche nanị banyere onwe ya. Nnwere onwe nke anyị natara n’aka Kraịst abụghị akwụkwọ ikike maka nchịchọ naani ọdịmma onwe onye, kama ọ bụ ohere inye Chineke otuto na ijere ndị ọzọ ozi n’ịhụnanya (Lee Ndị Galeshia 5:13).

Anyị nwere ike ilegara Jizọs anya dị ka ihe atụ zuru oke nke onye batara na nzube ya site na nje-ozi na abụghị maka naani nke onwe. N’ime ibu mmadụ Ya, Ọ matara ọnụ ahịa nke ije-ozi n’achọghị naani ọdịmma onwe Ya, dịka Ọ kwuru si, “Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, ka iko a gabiga M”. N'agbanyeghị nke ahụ, anyị na-ahụ ka Jizọs na-eme ihe kacha mkpa na nje-ozi n'achọghị ọdịmma naani nke onwe, dịka Ọ kwụkwara, "Ọ bụghị uche M, kama ka uche Gị mee." Ọ nwụrụ ka anyị nwee ike ịbanye n'ime nzube. Ọ nwụrụ ka anyị nwee ike inyere ndị ọzọ aka ime otu ihe ahụ (Lee Matiu 26:39).

Ka ị na-ekpe ekpere, rịọ Onye-nwe-anyị ka Ọ kpugheere gị otu ị ga-eji na-ejere ndị ọzọ ozi n’ịhụnanya. Ị nwere ike ịhụ onwe gị n'ọnọdụ ebe ị na-ejere ndị mmadụ ozi na Ụlọ Ụka ma ọ bụ n'ebe ọrụ. Ihe ọbụla ị na-eme, mee ya niile dịka nye Onye-nwe-anyị maka ihunanya na nnwere onwe nke Ọ nyegọrọ gị.


Chenaniah Darma dere ya


Ọ bụrụ na ịchọrọ ozi ndị ọzọ na kọleji C3, biko pịa ebe a.

Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Step into Purpose

Gịnị bụ nzube m? Kedu ihe m kwesịrị iji ndụ m mee? Gịnị bụ atumatu Chineke maka m? Ihe ndị a niile bụ ajụjụ ọtụtụ n'ime anyị na-ajụ n'otu oge ma ọ bụ ọzọ na ndụ anyị. Anyị bu n'obi ịza ụfọdụ ajụjụ ndị a ka anyị na-ebupu ihe ọ bụ ịbanye na nzube gị. Soro ụmụ akwụkwọ kọleji C3 ole na ole ka ha nyere nkọwa ụfọdụ n'isiokwu a.

More

Anyi ga-achọ ikele Ụlọ Chukwu nke C3 Sydney Pty Ltd maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.c3college.com/

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara