Banye na NzubeIhe Atụ
Inọgidesi Ike N'ime Okwukwe
Enweela ọtụtụ ndị dike dị egwu bụ ndị gagọrọ n'ihu anyị, banyere n'ime nzube ha ime mgbanwe, kpụru ụwa ka ọ bụrụ otu anyi si mara ya taa. Ụfọdụ aha ndị dị ka Nelson Mandela, Mother Teresa, ọbụna Bethany Hamilton (onye n'agbanyeghị nkwarụ ya ahapụghị nzube ya na ịkpọ òkù ya). Anyị niile nwere ike ịmụta n'aka ndị isi a dị egwu, ma enwere ọtụtụ àgwà mere ka ha bụrụ ndị dike. Agbanyeghị, achọrọ m ilekwasị anya n'otu njirimara nke mmadu atọ ndị a nwere, nke dị oke mkpa na 'Ịbanye n'ime Nzube gị', nke ahụ bụịnọgidesi ike n'ime okwukwe! Ịnọgidesi ike n'ihe nwere ike ịbụ ọrụ siri ike mgbe anyị bi n'ụwa jupụtara n'ihe ndi na-adighi nma - karịsịa n'ebe Iso Ụzọ Kraịst na Chineke nọ. Ma otu ihe ị pụrụ ijide n’aka bụ na Chineke nọnyeere gị! Ọ bụrụ na Onye Okike anyị kpọrọ gị ma kee nzube gị, Ọ bu n’obi ka i ruo ya. O nwere ike ịdị ka ibu karịri gị ugbu a… ma ị makwa, Ọ BỤ N'EZIE! Ma, ka m gbaa gị ume site n’akụkọ banyere otú Jeremaya onye amụma si wee dịrị, na otú Chineke si kpọọ ya. Site na Jeremaịa isi 1 (na nkenke), anyị hụru Chineke na-akpọ Jeremaya ka ọ bụrụ onye amụma na abụghị nanị banyere ndị ya kama ọ bụ banyere “MBA NIILE” - ọrụ na amapụ obi, ọkwa ya? Ma Chineke gafere n'elu ihe niile ka Ọ gbaa Jeremaya ume ma kwadoo ya maka nzube ya (Jer 1:9-14). N’eziokwu niile, Jeremaya nwere nnọọ ibu arọ banyere nzube ya, ma Chineke kwere Jeremaya nkwa na ọ dịghị mgbe Ọ ga-ahapụ ya ma ọ bụ gbahapụ ya. Site na ozi a, anyị nwere ike inwe obi siri ike na Chineke chọrọ ka i rụọ nzube gi, ọbụlagodi na ọrụ ahụ siri ike. Anyị pụrụ idetu ihe site ná nnọgidesi ike Jeremaya iji gaa nke ọma n’ebe Chineke nọ! Ndị iro enweghị ike imetụ ihe Chineke họpụtara aka, ma ọ ga-abu ma anyị nye ya ikike. Chineke akpọọla gị ka ị gaa nke ọma n'nzube gị n'ihi na Ọ kwere na gị, wee kee gị maka ihe ahụ kpọmkwem. Ọ nọnyeere gị, ma ị nwekwara eluigwe niile na-akwado gị! Ya mere, bulie ihu iji aru ezigbọte ọrụ elu, na-aga n'ihu ma ghara ige ntị banyere ụgha na nkụda mmụọ nke onye iro. Nnogidesi ike bụ nwa-igodo iji hụ nzube Chineke nyere gi ibia n'ndu! Gị onwe gị, onye na-agụ nke a, nwere ike ma buru dike nke ụwa a chọrọ, n'ihi ya, nwee obi sie ike ma gee ntị na nkwa Chineke kwere Jeremaya - "'Ha ga-ebuso gị agha ma ha agaghị emeri gị, n'ihi na M nọnyeere. Aga m anapụtakwa gị,' ka Onye-nwe-anyị kwụrụ. ( Jer. 1:19)Ashleigh Meyer dere
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Gịnị bụ nzube m? Kedu ihe m kwesịrị iji ndụ m mee? Gịnị bụ atumatu Chineke maka m? Ihe ndị a niile bụ ajụjụ ọtụtụ n'ime anyị na-ajụ n'otu oge ma ọ bụ ọzọ na ndụ anyị. Anyị bu n'obi ịza ụfọdụ ajụjụ ndị a ka anyị na-ebupu ihe ọ bụ ịbanye na nzube gị. Soro ụmụ akwụkwọ kọleji C3 ole na ole ka ha nyere nkọwa ụfọdụ n'isiokwu a.
More
Anyi ga-achọ ikele Ụlọ Chukwu nke C3 Sydney Pty Ltd maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.c3college.com/