ABÙ ỌMA 25:16-22
ABÙ ỌMA 25:16-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Chee m ihu ma gosi m ebere gị, nʼihi na abụ m onye nọ na nsogbu, naanị m nọkwa. Ihe mgbu nke obi m abaala ụba, napụta m site nʼobi mwute. Lekwasị nsogbu m na ihe mgbu m anya. Biko, gbaghara m mmehie m niile. Lee ka ndị iro m si mụbaa, ha ji oke iwe kpọọ m asị. Chebe ndụ m ma gbapụta m; ekwela ka m bụrụ onye ihere ga-eme, nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ Kwere ka ezi omume na izuoke bụrụ ihe ga-agba m gburugburu, nʼihi na olileanya m dị nʼime gị. O Chineke, Gbapụtakwa Izrel, site na nsogbu ya niile.
ABÙ ỌMA 25:16-22 Bible Nso (IGBOB)
Chem iru, me-kwa-ram amara; N'ihi na onye nání ya nọ na onye ewedara n'ala ka m'bu. Ahuhu nile nke obim sara mbara: Me ka m'si na nkpàm nile puta. Hu nweda-n'alam na ọnọdu ọjọm; Bupu kwa nmehiem nile. Hu ndi-irom, n'ihi na ha di ọtutu; Ha ji ikpọ-asi nke na-eme ihe-ike kpọm asi. Debe nkpuru-obim, naputakwam: Ekwela ka ihere mem, n'ihi na ab͕abàwom nime Gi. Ka izu-okè na izi-ezi chezim, N'ihi na elewom anya Gi. Chineke, b͕aputa Israel Na nkpà-ya nile.