Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 25

25
Abụ Ọma 25
Abụ Ọma Devid.
Ekpere maka odudu na nnapụta
1Ọ bụ na gị Onyenwe anyị
ka m tụkwasịrị obi m.
2O Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi m.
Ekwela ka ihere mee m,
ekwekwala ka ndị iro m merie m.
3Ihere agaghị eme
onye ọbụla olileanya ya dị na gị,
ma ihere ga-eme ha
bụ ndị niile ịghọ aghụghọ jụrụ ahụ.
4O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile,
kuzikwaara m ụzọ gị niile.
5Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe,
nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile,
olileanya m dị na gị.
6Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị,
nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie.
7Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m,
ya na nnupu isi m niile.
Kama site nʼịhụnanya gị cheta m,
Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ.
8Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ;
ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya.
9Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi,
na-ezikwa ha ụzọ nke ya.
10Ụzọ niile nke Onyenwe anyị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi,
nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya.
11Nʼihi aha gị, O Onyenwe anyị,
gbaghara m ajọ omume m nʼagbanyeghị na ha dị ukwuu.
12Olee mmadụ ahụ nke na-atụ egwu Onyenwe anyị?
O ga-ezi ya ihe nʼụzọ ahụ a họpụtaara ya.
13Ọ ga-ebi ogologo ụbọchị nke ndụ ya nʼime ịba ụba,
ndị agbụrụ ha ga-eketa ala ahụ.
14 Onyenwe anyị na-eme ka ndị ahụ na-atụ egwu ya mara
ọgbụgba ndụ ya na izu nzuzo ya.
15Anya m abụọ na-elegide Onyenwe anyị mgbe niile;
nʼihi na ọ bụ naanị ya ga-eme ka ụkwụ m abụọ site nʼọnya pụta.
16Chee m ihu ma gosi m ebere gị,
nʼihi na abụ m onye nọ na nsogbu, naanị m nọkwa.
17Ihe mgbu nke obi m abaala ụba,
napụta m site nʼobi mwute.
18Lekwasị nsogbu m na ihe mgbu m anya.
Biko, gbaghara m mmehie m niile.
19Lee ka ndị iro m si mụbaa,
ha ji oke iwe kpọọ m asị.
20Chebe ndụ m ma gbapụta m;
ekwela ka m bụrụ onye ihere ga-eme,
nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ
21Kwere ka ezi omume na izuoke bụrụ ihe ga-agba m gburugburu,
nʼihi na olileanya m dị nʼime gị.
22O Chineke, Gbapụtakwa Izrel,
site na nsogbu ya niile.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Abụ Ọma 25: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye