Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 26

26
Abụ Ọma 26
Abụ Ọma Devid.
Ekpere nke ezi mmadụ
1 Onyenwe anyị, biko kpepụta m,
nʼihi na ebiela m ndụ zuruoke;#26:1 2Ez 20:2; Ilu 20:7
atụkwasịrị m Onyenwe anyị obi,
na-eleghị anya nʼazụ.
2Tulee m, O Onyenwe anyị, ma nwakwaa m,
nyochaa obi m na echiche m.
3Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m.
Ana m ejegharịkwa nʼime eziokwu gị.
4Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla.
Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ.
5Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị.
Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa.
6Ana m asacha aka#26:6 Ọ bụrụ na mmadụ asacha maọbụ kwọọ aka ya nʼihu ọha, ọ na-apụta ngọpụ site nʼihe na-ezighị ezi, maọbụ onye dị otu a na-asị, ikpe amaghị m. Abụ 73:13 m abụọ nʼọnọdụ emeghị ihe ọjọọ,
na-eje ozi nʼebe ịchụ aja gị ife gị ofufe, o Onyenwe anyị.
7Ana m abụkwa abụ ekele,
jiri iti mkpu na-ekwusa otuto gị, na ọrụ ebube gị niile.
8O Onyenwe anyị, ahụrụ m ụlọ obibi gị nʼanya,
ụlọ ahụ ebe ebube gị na-adịgide nʼime ya.
9Ebibikọtala mụ na ndị mmehie,
ewezugakọtala ndụ m na nke ndị na-awụfu ọbara,
10ndị aka ha jupụtara nʼatụmatụ ọjọọ,
aka nri ha jupụtakwara na ngarị.
11Ma mụ onwe m na-ebi ndụ zuruoke;
gbapụta m ma meere m ebere.
12Ụkwụ m na-eguzo nʼala dị larịị;
aga m eto Onyenwe anyị nʼetiti ọha mmadụ.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Abụ Ọma 26: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye