Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 25

25
Abù Ọma nke Devid.
1Gi, Jehova, ka m'nēbuliri nkpuru-obim.
2Chinekem, na Gi ka m'tukwasiworo obi,
Ekwela ka ihere mem;
Ekwela ka obi ndi-irom tọ ha utọ n'arum.
3Ọzọ, ndi nile ndi nēle anya Gi, ihere agaghi-eme ha:
Ihere gēme ndi nāghọ aghughọ n'efu.
4Jehova, me ka m'mara uzọ-gi nile;
Zím okporo-uzọ-Gi nile.
5Mem ka m'zọ ije n'ezi-okwu-Gi, Gi zíkwam ihe;
N'ihi na Gi onwe-gi bu Chineke nke nzọputam;
Gi ka m'nēle anya Gi ogologo ubọchi nile.
6Cheta obi-ebere-Gi nile, Jehova, ha na ebere-Gi nile;
N'ihi na site na mb͕e ebighi-ebi ka ha diworo.
7Echetala nmehie nile m'mehiere n'okorọbiam, ha na njehiem nile:
Dika ebere-Gi si di Gi onwe-gi chetam,
N'ihi idi-nma-Gi, Jehova.
8Onye di nma na onye ziri ezi ka Jehova bu:
Nihi nka ka Ọ nēzi ndi-nmehie ihe n'uzọ.
9Ọ nēme ka ndi di ume-ala n'obi zọ ije n'ikpé:
Ọ nēzi kwa ndi di ume-ala n'obi uzọ-Ya.
10Okporo-uzọ nile nke Jehova bu ebere na ezi-okwu
N'ebe ndi nēchezi ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ihe-àmà-Ya nile nọ.
11N'ihi aha-Gi, Jehova,
B͕aghara ajọ omumem, n'ihi na o riri nne.
12Ònye ka ọ bu, bú nwoke nātu egwu Jehova?
O gēzi ya ihe n'uzọ ọ nārọputa.
13Nkpuru-obi-ya gānọ ọnọdu-abali n'ọdi-nma,
Nkpuru-ya gēnweta kwa ala.
14Ìzù nzuzo Jehova diri ndi nātu egwu Ya;
Ya na ọb͕ub͕a-ndu-Ya, ime ka ha mara ihe.
15Anyam abua di n'ebe Jehova nọ mb͕e nile;
N'ihi na Ya onwe-ya gēme ka ukwum abua si n'ub͕u puta.
16Chem iru, me-kwa-ram amara;
N'ihi na onye nání ya nọ na onye ewedara n'ala ka m'bu.
17Ahuhu nile nke obim sara mbara:
Me ka m'si na nkpàm nile puta.
18Hu nweda-n'alam na ọnọdu ọjọm;
Bupu kwa nmehiem nile.
19Hu ndi-irom, n'ihi na ha di ọtutu;
Ha ji ikpọ-asi nke na-eme ihe-ike kpọm asi.
20Debe nkpuru-obim, naputakwam:
Ekwela ka ihere mem, n'ihi na ab͕abàwom nime Gi.
21Ka izu-okè na izi-ezi chezim,
N'ihi na elewom anya Gi.
22Chineke, b͕aputa Israel
Na nkpà-ya nile.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 25: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye