Chee m ihu ma gosi m ebere gị, nʼihi na abụ m onye nọ na nsogbu, naanị m nọkwa. Ihe mgbu nke obi m abaala ụba, napụta m site nʼobi mwute. Lekwasị nsogbu m na ihe mgbu m anya. Biko, gbaghara m mmehie m niile. Lee ka ndị iro m si mụbaa, ha ji oke iwe kpọọ m asị. Chebe ndụ m ma gbapụta m; ekwela ka m bụrụ onye ihere ga-eme, nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ Kwere ka ezi omume na izuoke bụrụ ihe ga-agba m gburugburu, nʼihi na olileanya m dị nʼime gị. O Chineke, Gbapụtakwa Izrel, site na nsogbu ya niile.
Gụọ Abụ Ọma 25
Geere nke a ntị Abụ Ọma 25
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 25:16-22
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị