Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NKPUGHE 11

11
1Ewe nyem amì yiri nkpa-n'aka: otù onye we si, Bilie, tù kwa ulo nsọ nke Chineke, na ebe-ichu-àjà-ya, na ndi nākpọ isi ala nime ya. 2Ma obí nke di n'èzí ulo nsọ ahu, rapu ya n'èzí, atù-kwa-la; n'ihi na ewerowo ya nye ndi mba ọzọ: ha gāzọda kwa obodo nsọ ahu ọgu ọnwa abua na abua. 3M'gēnye kwa ndi-àmàm abua ike, ha gēbu kwa amuma nnù ubọchi atọ na ọgu atọ, eb͕okwasiwo kwa ha ákwà-nkpe. 4Ndia bu osisi olive abua ahu na ihe-idọba-oriọna abua ahu, ndi nēguzo n'iru Onye-nwe uwa. 5Ọ buru kwa na onye ọ bula chọrọ imejọ ha, ọku nēsi n'ọnu-ha puta, nēripia kwa ndi-iro-ha; ọ buru kwa na onye ọ bula gāchọ imejọ ha, aghaghi ib͕u ya otú a. 6Ndia nwere ike imechi elu-igwe, ka miri we ghara izo n'ubọchi nile nke amuma-ha: ha nwe-kwa-ra ike n'ebe miri nile di, ime ka ha b͕anwè ọbara, na iwere ihe-otiti nile ọ bula tie uwa, ka mb͕e ha gāchọ ra. 7Ma mb͕e ọ bula ha gāb͕azuwo àmà-ha, anu-ọhia ahu nke nēsi n'abyss ahu rigoputa gēbu agha megide ha, meri kwa ha, b͕u kwa ha. 8Ozu-ha we di n'amá nke obodo uku ahu, bú nke anākpọ Sọdọm na Ijipt n'uzọ nke Mọ Nsọ, ebe akpọgide-kwa-ra Onye-nwe-ha n'obe. 9Madu we si n'etiti ndi nile na ebo nile na asusu nile na mba nile puta nēle ozu-ha ubọchi atọ na nkera otù ubọchi, ha ekweghi kwa ka atọb͕ọ ozu-ha n'ílì. 10Ndi bi n'elu uwa nāṅuri kwa ọṅu n'isi ha, obi nātọ kwa ha utọ; ha gēzigarita kwa onwe-ha onyinye; n'ihi na ndi-amuma abua ndia mekpara ndi bi n'elu uwa aru. 11Mb͕e ubọchi atọ na nkera otù ubọchi ahu gasiri Mọ nke ndu nke si na Chineke puta we bata nime ha, ha we guzo n'ukwu-ha; oké egwu we dakwasi ndi nēkiri ha. 12Ha we nu oké olu nke si n'elu-igwe da, ka ọ nāsi ha, Rigotanu n'ebe a. Ha we rigo rue n'elu-igwe nime igwe-oji ahu; ndi-iro-ha kiri-kwa-ra ha. 13N'otù oge hour ahu oké ala-ọma-jijiji we da, otù uzọ n'uzọ iri nke obodo ahu we da rue ala; ewe b͕ue nnù madu iri na nnù asa na ọgu iri nime ala-ọma-jijiji ahu, bú ndi nwere aha: ndi fọduru we tua egwu, ha we nye Chineke nke elu-igwe otuto.
14Ahuhu nke-abua agabigawo: le, Ahuhu nke-atọ nābia ọsọsọ.
15Mọ-ozi nke-asa we fùa opì; oké olu we da n'elu-igwe, ha we si, Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya: Ọ gābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi. 16Orú ndi-okenye na anọ ahu, ndi nānọdu n'iru Chineke n'elu oche-eze-ha, we da kpuchie iru ha n'ala, we kpọ isi ala nye Chineke, 17si, Ayi nēkele Gi, Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri; n'ihi na I werewo oké ike-Gi, I bukwa eze. 18Mba nile we we iwe, iwe-Gi we bia, ya na oge ikpe ndi nwuru anwu ikpé, na inye ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, na ndi nsọ, na ndi nātu egwu aha-Gi, ndi ntà na ndi uku, ugwọ-ọlu-ha; na imebi ndi ahu nēmebi uwa.
19Ewe meghe ulo nsọ nke Chineke nke di n'elu-igwe; ewe hu ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu-Ya n'ulo nsọ Ya; àmùmà, na olu, na éb͕è-elu-igwe, na ala-ọma-jijiji, na oké ákú-miri-ígwé we so.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

NKPUGHE 11: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye