1
NKPUGHE 11:15
Bible Nso
Mọ-ozi nke-asa we fùa opì; oké olu we da n'elu-igwe, ha we si, Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya: Ọ gābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa NKPUGHE 11:15
2
NKPUGHE 11:18
Mba nile we we iwe, iwe-Gi we bia, ya na oge ikpe ndi nwuru anwu ikpé, na inye ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, na ndi nsọ, na ndi nātu egwu aha-Gi, ndi ntà na ndi uku, ugwọ-ọlu-ha; na imebi ndi ahu nēmebi uwa.
Nyochaa NKPUGHE 11:18
3
NKPUGHE 11:3
M'gēnye kwa ndi-àmàm abua ike, ha gēbu kwa amuma nnù ubọchi atọ na ọgu atọ, eb͕okwasiwo kwa ha ákwà-nkpe.
Nyochaa NKPUGHE 11:3
4
NKPUGHE 11:11
Mb͕e ubọchi atọ na nkera otù ubọchi ahu gasiri Mọ nke ndu nke si na Chineke puta we bata nime ha, ha we guzo n'ukwu-ha; oké egwu we dakwasi ndi nēkiri ha.
Nyochaa NKPUGHE 11:11
5
NKPUGHE 11:6
Ndia nwere ike imechi elu-igwe, ka miri we ghara izo n'ubọchi nile nke amuma-ha: ha nwe-kwa-ra ike n'ebe miri nile di, ime ka ha b͕anwè ọbara, na iwere ihe-otiti nile ọ bula tie uwa, ka mb͕e ha gāchọ ra.
Nyochaa NKPUGHE 11:6
6
NKPUGHE 11:4-5
Ndia bu osisi olive abua ahu na ihe-idọba-oriọna abua ahu, ndi nēguzo n'iru Onye-nwe uwa. Ọ buru kwa na onye ọ bula chọrọ imejọ ha, ọku nēsi n'ọnu-ha puta, nēripia kwa ndi-iro-ha; ọ buru kwa na onye ọ bula gāchọ imejọ ha, aghaghi ib͕u ya otú a.
Nyochaa NKPUGHE 11:4-5
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị