Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NKPUGHE 10

10
1M'we hu mọ-ozi ọzọ di ike, ka ọ nēsi n'elu-igwe ridata, nke eb͕okwasiworo ya igwe-oji dika uwe; eke-na-ogwurugwu ahu di kwa n'isi-ya, iru-ya di kwa ka anyanwu, ukwu-ya abua di kwa ka ide ọku; 2ọ nējide kwa nwa akwukwọ ntà n'aka-ya, nke asagheworo: o we tukwasi ukwu aka-nri ya n'elu oké osimiri tukwasi kwa ukwu aka-ekpe ya n'elu ala; 3o we were oké olu tie nkpu, dika ọdum nāb͕ọ uja: mb͕e o tiri nkpu, éb͕è-elu-igwe asa ahu we kwue olu-ha. 4Ma mb͕e éb͕è-elu-igwe asa ahu kwuru okwu, agajem ide akwukwọ: m'we nu olu si n'elu-igwe da, si Kà ihe éb͕è-elu igwe asa ahu kwuru akàrà, ede-kwa-la ha n'akwukwọ. 5Mọ-ozi ahu, nke m'huru ka ọ nēguzo n'elu oké osimiri na n'elu ala, we welie aka-nri-ya zó n'elu-igwe, 6we were Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, bú Onye kère elu-igwe na ihe nile di ya nime, na uwa na ihe nile di ya nime, na oké osimiri na ihe nile di ya nime, ṅu iyi na oge agaghi-adi kwa ọzọ: 7ma n'ubọchi nke olu mọ-ozi nke-asa ahu, mb͕e ọ gaje ifù opì, agēme kwa ka ihe-omimi nke Chineke zu okè, dika O zìri ozi ọma nye ndi-orù-Ya, bú ndi amuma-Ya. 8Olu ahu nke m'nuru ka ọ nēsi n'elu-igwe da, anu-kwa-ram ya ọzọ ka ọ nākpayerem uka, si, Je, nara akwukwọ ahu nke asagheworo, bú nke di n'aka mọ-ozi ahu onye nēguzo n'elu oké osimiri na n'elu ala. 9M'we jekuru mọ-ozi ahu, si ya ka o nyem nwa akwukwọ ntà ahu. O we sim, Nara ya, ripia kwa ya; ọ gēme kwa ka afọ-gi lue ilu, ma n'ọnu-gi ọ gātọ utọ dika manu-aṅu. 10M'we nara nwa akwukwọ ntà ahu n'aka mọ-ozi ahu, we ripia ya; o we tọ utọ n'ọnum dika manu-aṅu; mb͕e m'ripiasiri ya, ewe me ka afọm lue ilu. 11Ha nāsikwam, I ghaghi ibu amumá ọzọ bayere ọtutu ndi na ọtutu mba na ọtutu asūsū na ọtutu eze.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

NKPUGHE 10: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye