Okwu-Gi bu oriọna diri ukwum,
Ọ bu kwa ìhè diri okporo-uzọm.
Aṅuwom iyi, me ka o guzosie ike,
Na m'gēdebe ikpé nile nke ezi omume-Gi.
Ewedawom n'ala nke-uku:
Me ka m'di ndu, Jehova, dika okwu-Gi si di.
Biko, ka onyinye-afọ-ofufo nile nke ọnum tọ Gi utọ, Jehova,
Zíkwam ikpé-Gi nile.
Nkpuru-obim di n'ọbu-akam mb͕e nile;
Ma echezọghm iwu-Gi.
Ndi nēmebi iwu esiworom ọnya;
Ma esighm nihe-iriba-ama-Gi nile fugharia.
Eketawom ihe-àmà-Gi nile rue mb͕e ebighi-ebi;
N'ihi na ihe nātọ obim utọ ka ha bu.
Ewezugawom obim ime ukpuru-Gi nile,
Rue mb͕e ebighi-ebi, rue mb͕e ikpe-azu.
Ndi nwere uche abua ka m'kpọworo asì:
Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya.
Ebe-nzuzom na ọtam ka I bu:
Okwu-Gi ka m'chereworo.
Sinu n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu, unu ndi nēme ihe ọjọ;
Ka m'we chebe ihe nile Chinekem nyere n'iwu.
Kwagidem dika okwu-ọnu-Gi si di, ka m'we di ndu;
Eme-kwa-la ka ihere olile-anyam mem.
Kwaliem elu, ewe zọputam,
M'gēle kwa ukpuru-Gi nile anya ọma mb͕e nile.
I ledawo ndi nile si n'ukpuru nile Gi jehie anya,
N'ihi na okwu-ugha ka aghughọ-ha bu.
I nēme ka ndi nile nēmebi iwu n'uwa gwusia di ka ifuru:
N'ihi ya ka m'huworo ihe-àmà-Gi nile n'anya.
Aji anu-arum guzoro ọtọ site n'oké egwu-Gi;
Ọ bu kwa ikpé-Gi nile ka m'nātu egwu ha.
Emewom ikpe ekpere na ezi omume:
Arapulam nye ndi nēmeb͕um.
Buru onye-mbe nye orù-Gi na I gēmem nma:
Ekwela ka ndi-nganga meb͕uem.
Anyam abua adalawo n'isi n'ichọsi nzọputa-Gi ike,
Na n'ichọsi okwu ezi omume-Gi ike.
Meso orù-Gi dika ebere-Gi si di,
Zíkwam ukpuru-Gi nile
Orù-Gi ka m'bu, me ka m'ghọta ihe,
Ka m'we mara ihe-àmà-Gi nile.
Mb͕e eruworo Jehova ilu ọlu;
Ha emebiwo iwu-Gi.
N'ihi nka ka m'huworo ihe nile I nyere n'iwu n'anya
Kari ọla-edo, e, kari ọla-edo anuchara anucha.
N'ihi nka ka m'guworo ihe-iriba-ama-Gi nile, nke diri ihe nile, n'ihe ziri ezi;
Uzọ okwu-ugha ọ bula ka m'kpọworo asì.
Oké ọlu ka ihe-àmà-Gi nile bu:
N'ihi nka ka nkpuru-obim chebeworo ha.
Nkpughepu okwu-Gi nile nēnye ìhè;
Ọ nēmeka ndi nēnweghi uche ghọta ihe.
Asaghepurum ọnum, ku kwa ume ike ike;
N'ihi na achọsirim ihe nile I nyere n'iwu ike.
Chem iru, me-kwa-ram amara,
Dika I si eme ndi nāhu aha-Gi n'anya.
Me ka nzọ-ukwum nile guzosie ike n'okwu-ọnu-gi:
Ekwe-kwa-la ka ajọ ihe ọ bula buru onye-isim.
B͕aputam na nmeb͕u nke madu:
M'gēdebe kwa ihe-iriba-ama-Gi nile.
Me ka iru-Gi nye orù-Gi ìhè;
Zíkwam ukpuru-Gi nile.
Anya-miri nke di ka ọtutu miri-iyi nāb͕a anyam abua,
N'ihi na ha edebeghi iwu-Gi.
Onye ezi omume ka I bu Jehova,
Ọzọ, ihe ziri ezi ka ikpé-Gi nile bu.
I nyewo ihe-àmà-Gi nile iwu n'ezi omume
Na ikwesi-ntukwasi-obi di uku.
Ekworom ekpochapuwom,
N'ihi na ndi nākpab͕um echezọwo okwu-Gi nile.
Ihe anuchara anucha nke-uku ka okwu-ọnu-Gi bu;
Orù-Gi ahuwo kwa ya n'anya.
Onye ntà ka m'bu, na onye anēleda anya:
Ma echezọghm ihe-iriba-ama-Gi nile.
Ezi omume-Gi bu ezi omume nādiru mb͕e ebighi-ebi,
Iwu-Gi bu kwa ezi-okwu
Ahuhu na nkpà achọtawom:
Ma ihe nile I nyere n'iwu bu ihe nātọm utọ nke-uku.
Ihe-àmà-Gi nile bu ezi omume rue mb͕e ebighi-ebi:
Me ka m'ghọta ihe, m'gādi kwa ndu.