Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 119

119
'
1Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi zuru okè n'uzọ Jehova bu,
Ndi nējeghari n'iwu jehova.
2Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēchebe ihe-àmà-Ya nile bu,
Ndi nēwere obi-ha nile chọ Ya.
3E, ha emeghi ajọ omume;
N'uzọ-Ya nile ka ha nēje ije.
4Gi onwe-gi ewerewo ihe-iriba-ama-Gi nye ayi n'iwu,
Ka ayi we debesie ha ike.
5Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na edoziwo uzọm nile
Idebe ukpuru-Gi nile!
6Mb͕e ahu ihere agaghi-emem,
Mb͕e m'nēlegide anya n'ebe ihe nile I nyere n'iwu di.
7M'gēwere obi ziri ezi kele Gi,
Mb͕e m'mutara ikpé nile nke ezí omume-Gi.
8Ukpuru-Gi nile ka m'gēdebe:
Arapusilam arapu.
b
9Gini ka okorọbia gēji me ka uzọ-ya di ọcha?
Ọ bu n'ilezi ya anya dika okwu-Gi si di.
10Obim nile ka m'wereworo chọ Gi:
Ekwela ka m'si n'ihe nile I nyere n'iwu jehie.
11N'obim ka m'zobeworo okwu-ọnu-Gi,
Ka m'we ghara imehie megide Gi.
12Onye agọziri agọzi ka I bu, Jehova:
Zím ukpuru-Gi nile.
13Eb͕ub͕ere-ọnum ka m'wereworo kọ akukọ
Ikpé nile nke ọnu-Gi.
14N'uzọ ihe-àmà-Gi nile ka obi nātọm utọ,
Dika ọ gātọm utọ bayere àkù nile.
15N'ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'gātughari uche,
M'gēlegide kwa uzọ-Gi nile anya.
16Ihe ukpuru-Gi nile gātọm utọ nke-uku:
M'gaghi-echezọ okwu-Gi.
g
17Meso orù-Gi nke-ọma, ka m'we di ndu;
M'gēdebe kwa okwu-Gi.
18Kpughepu anyam abua, ka m'we legide
Oké ihe di iche iche si n'iwu-Gi puta.
19Ọbìa ka m'bu n'uwa:
Ezonarilam ihe nile I nyere n'iwu.
20Nkpuru-obim etiwawo n'ihi ọchichọ
O ji chọsie ikpé-Gi nile ike mb͕e nile.
21I basiworo ndi-nganga ndi abuworo ọnu nba ike,
Ndi nēsi n'ihe nile I nyere n'iwu jehie.
22Wepu ita-uta na nleda n'arum;
N'ihi na echebewom ihe-àmà-Gi nile.
23Ọzọ, ndi-isi nọduru ala kwurita okwu imegidem:
Ma orù-Gi nātughari uche n'ukpuru-Gi nile.
24Ọzọ, ihe-àmà-Gi nile bu ihe nātọm utọ nke-uku,
Ha bu ndi nādum ọdu.
d
25Nkpuru-obim nārapara n'ájá:
Dika okwu-Gi si di, me ka m'di ndu.
26Akọrọm akukọ uzọm nile, I we zam:
Gi zím ukpuru-Gi nile.
27Me ka m'ghọta uzọ nke ihe-iriba-ama-Gi nile:
M'gātughari kwa uche n'oké ọlu-Gi nile.
28Nkpuru-obim atupuwo dika miri site n'iru-újú:
Dika okwu-Gi si di, me ka m'guzosie ike.
29Wezuga uzọ okwu-ugha n'ebe m'nọ:
Were kwa amara nyem iwu-Gi.
30Uzọ nke ikwesi-ntukwasi-obi ka m'rọputaworo:
Ikpé-Gi nile ka m'doworo n'irum.
31Araparawom n'aru ihe-àmà-Gi nile:
Jehova, emela ka ihere mem.
32N'uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu ka m'gāb͕a ọsọ,
N'ihi na I gēme ka obim sa mbara.
h
33Jehova, zím uzọ ukpuru-Gi nile:
M'gēchebe kwa ya rue mb͕e ikpe-azu.
34Me ka m'ghọta ihe, m'gēchebe kwa iwu-Gi;
M'gēwere kwa obim nile debe ya.
35Me ka m'zọ ije n'okporo-uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu;
N'ihi na uzọ ahu nātọm utọ
36Wezuga obim iche ihe-àmà-Gi nile iru,
Ewezuga-kwa-la ya iche urù nēzighi ezi iru.
37Me ka anyam abua si n'ile ihe-efu gabiga,
Me ka m'di ndu n'uzọ-Gi nile.
38Me ka okwu-ọnu-Gi guzosiere orù-Gi ike,
Bú nke diri egwu-Gi.
39Me ka ita-utam nke m'nātu ujọ ya gabiga;
N'ihi na ikpé-Gi nile di nma.
40Le, achọsiwom ihe-iriba-ama-Gi nile ike:
N'ezi omume-Gi me ka m'di ndu.
w
41Ọzọ, kwe ka ebere-Gi nile biakutem, Jehova,
Bú nzọputa-Gi, dika okwu-ọnu-Gi si di.
42M'gāza kwa onye nātam uta okwu;
N'ihi na atukwasiwom okwu-Gi obi.
43Anapusi-kwa-la okwu nke ezi-okwu n'ọnum;
N'ihi na ikpé-Gi nile ka m'chereworo.
44M'gēdebe kwa iwu-Gi mb͕e nile
Rue mb͕e nile ebighi-ebi.
45M'gējeghari kwa n'ebe sara mbara;
N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo.
46M'gēkwu kwa okwu bayere ihe-àmà-Gi nile n'iru ndi-eze,
Ihere agaghi-emekwam.
47Ihe nke ihe nile I nyere n'iwu gātọkwam utọ nke-uku,
Bú nke m'huworo n'anya.
48M'gāchili-kwa-ra ihe nile I nyere n'iwu ọbu-akam, bú ihe nke m'huworo n'anya;
M'gātughari kwa uche n'ukpuru-Gi nile.
z
49Cheta okwu I gwara orù-Gi,
Nke I meworom ka m'chere.
50Nka bu nkasi-obim nime nweda-n'alam:
Na okwu-ọnu-Gi emewo ka m'di ndu.
51Ndi-nganga akwawom emò nke-uku:
Ma esighm n'iwu-Gi wezuga onwem.
52Echetawom ikpé-Gi nile site na mb͕e ebighi-ebi, jehova,
We kasie onwem obi.
53Iwe di ọku ejidewom,
N'ihi ndi nēmebi iwu ndi nārapu iwu-Gi.
54Abù ọma ka ukpuru-Gi nile buruworom
N'ulo ebe m'nọ dika ọbìa.
55Echetawom aha-Gi, Jehova, n'abali,
We debe iwu-Gi.
56Nka ka m'nweworo,
Na echebewom ihe-iriba-ama-Gi nile.
x
57Òkèm ka Jehova bu:
Asiwom na m'gēdebe okwu-Gi nile.
58Ewerewom obim nile me ka iru-Gi dajua:
Merem amara dika okwu-ọnu-Gi si di.
59Echèrem èchìchè uzọm nile,
We me ka ukwum abua laghachi n'ihe-àmà-Gi nile.
60Abiaram ọsọsọ, ọ b͕agwojughkwam anya,
Idebe ihe nile I nyere n'iwu.
61Udọ̀ nile nke ndi nēmebi iwu ehikọwom buruburu;
Ma echezọghm iwu-Gi.
62N'etiti abali ka m'gēbili ikele Gi
N'ihi ikpé nile nke ezi omume-gi.
63Onye ekekọtaworo mu na ndi nile nātu egwu Gi n'otù ka m'bu,
Onye ekekọtaworo mu na ndi nēdebe ihe-iriba-ama-Gi nile n'otù.
64Jehova, uwa juputara n'ebere-Gi:
Zím ukpuru-Gi nile.
X
65I meworo orù-Gi ezi ihe,
Jehova, dika okwu-Gi si di.
66Zím idi-nma nke ezi uche na ihe-ọmuma;
N'ihi na ọ bu n'ihe nile I nyere n'iwu ka m'kwereworo.
67Tutu ewedam n'ala mu onwem nēme ihe ọjọ n'amaghi-ama;
Ma ub͕u a okwu-ọnu-Gi ka m'debeworo.
68Onye di nma ka I bu, na Onye nēme nma;
Zím ukpuru-Gi nile.
69Ndi-nganga etekpuwom okwu-ugha dika ihe-ntekpu:
Mu onwem gēwere obim nile chebe ihe-iriba-ama-Gi nile.
70Obi-ha bu nání abuba dika abuba;
Ma mu onwem, ihe iwu-Gi nātọm utọ nke-uku.
71Ọ dim nma na ewedawom n'ala;
Ka m'we muta ukpuru-Gi nile.
72Iwu ọnu-Gi dim nma
Kari ọla-edo na ọla-ọcha nādighi iguta-ọnu.
y
73Aka-Gi abua emewom, me kwa ka m'guzosie ike:
Gi me ka m'ghọta ihe, ka m'we muta ihe nile I nyere n'iwu.
74Ndi nātu egwu Gi gāhum, we ṅuria;
N'ihi na okwu-Gi ka m'chereworo.
75Jehova, amawom na ikpé-Gi nile bu ezi omume,
Amawokwam na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obi ka I wedaworom nala.
76Biko, kwe ka ebere-Gi buru ihe gākasi obim,
Dika okwu-ọnu-Gi nke diri orù-Gi si di.
77Ka obi-ebere-Gi nile biakutem, ka m'we di ndu;
N'ihi na iwu-Gi bu ihe nātọm utọ nke-uku.
78Ka ihere me ndi-nganga; n'ihi na ha ewerewo okwu-ugha me ka ikpém b͕agọ ab͕agọ:
Ma m'gātughari uche n'ihe-iriba-ama-Gi nile.
79Ka ndi nātu egwu Gi laghachikutem,
Ha gāma kwa ihe-àmà-Gi nile.
80Ka obim zue okè n'ukpuru-Gi nile,
Ka ihere we ghara imem.
k
81Nkpuru-obim agwusiwo site n'ichọsi nzọputa-Gi ike:
Ma okwu-Gi ka m'chereworo.
82Anyam abua adalawo n'isi site n'ichọsi okwu-Gi ike,
Mb͕e m'nāsi, Òle mb͕e I gākasim obi?
83N'ihi na adiwom ka karama-akpukpọ di n'anwuru-ọku;
Ma echezọghm ukpuru-Gi nile.
84Ùbọchi nke orù-Gi di ole?
Òle mb͕e I gēme ndi nēsob͕um ihe I kpere n'ikpe?
85Ndi-nganga egwuworom olùlù di iche iche,
Bú ndi nādighi ka iwu-Gi si di.
86Ihe nile I nyere n'iwu kwesiri ntukwasi-obi:
N'uzọ okwu-ugha ka ha nēsob͕um; biko, yerem aka.
87Ọ fọduru nwantī ka ha me ka m'gwusia n'uwa;
Ma mu onwem arapughi ihe-iriba-ama-Gi nile.
88Dika ebere-Gi si di, me ka m'di ndu,
M'gēdebe kwa ihe-àmà nke ọnu-Gi.
l
89Jehova, rue mb͕e ebighi-ebi
Ka emeworo ka okwu-Gi guzosie ike n'elu-igwe.
90Rue ọb͕ọ nile ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di:
I mewo ka uwa guzosie ike, o we guzo.
91Dika ikpé-Gi nile si di, ha nēguzo ta;
N'ihi na ihe nile bu ndi-orù-Gi.
92Asi na iwu-Gi abughi ihe nātọm utọ nke-uku,
Mb͕e ahu m'gālawori n'iyì nime nweda-n'alam.
93Rue mb͕e ebighi-ebi m'gaghi-echezọ ihe-iriba-ama-Gi nile:
N'ihi na ha ka I jiworo me ka m'di ndu.
94Ọ bu Gi nwem, zọputam;
N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo.
95Ndi nēmebi iwu elewo anyam ime ka m'la n'iyì;
Ma ihe-àmà-Gi nile ka m'gātukwasi uche.
96Ahuwom nsọtu diri izu-okè nile;
Ma ihe, I nyere n'iwu sara mbara nke-uku.
m
97Le ka m'si hu iwu-Gi n'anya!
Ogologo ubọchi nile ka nke ahu bu ihe m'natughari n'uche.
98Ihe nile I nyere n'iwu nēme ka m'mara ihe kari ndi-irom;
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka nke ahu dirim.
99Kari ndi nile nēzím ihe ka m'nwere uche;
N'ihi na ihe-àmà-Gi nile bu ihe m'nātughari n'uche.
100Anamaghọta ihe kari ndi-okenye,
N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chebeworo.
101Eb͕ochiwom ukwum abua ka ha ghara ibà n'uzọ ọjọ ọ bula,
Ka m'we debe okwu-Gi.
102Esighm n'ikpé-Gi nile wezuga onwem;
N'ihi na I zíwom ihe.
103Le ka okwu-ọnu-Gi si atọ okpo-ọnum utọ!
Ha nātọ ọnum utọ kari manu-aṅu.
104M'nēsitei n'ihe-iriba-ama-Gi nile ghọta ihe:
N'ihi nka ka m'kpọworo uzọ okwu-ugha ọ bula asì.
n
105Okwu-Gi bu oriọna diri ukwum,
Ọ bu kwa ìhè diri okporo-uzọm.
106Aṅuwom iyi, me ka o guzosie ike,
Na m'gēdebe ikpé nile nke ezi omume-Gi.
107Ewedawom n'ala nke-uku:
Me ka m'di ndu, Jehova, dika okwu-Gi si di.
108Biko, ka onyinye-afọ-ofufo nile nke ọnum tọ Gi utọ, Jehova,
Zíkwam ikpé-Gi nile.
109Nkpuru-obim di n'ọbu-akam mb͕e nile;
Ma echezọghm iwu-Gi.
110Ndi nēmebi iwu esiworom ọnya;
Ma esighm nihe-iriba-ama-Gi nile fugharia.
111Eketawom ihe-àmà-Gi nile rue mb͕e ebighi-ebi;
N'ihi na ihe nātọ obim utọ ka ha bu.
112Ewezugawom obim ime ukpuru-Gi nile,
Rue mb͕e ebighi-ebi, rue mb͕e ikpe-azu.
s
113Ndi nwere uche abua ka m'kpọworo asì:
Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya.
114Ebe-nzuzom na ọtam ka I bu:
Okwu-Gi ka m'chereworo.
115Sinu n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu, unu ndi nēme ihe ọjọ;
Ka m'we chebe ihe nile Chinekem nyere n'iwu.
116Kwagidem dika okwu-ọnu-Gi si di, ka m'we di ndu;
Eme-kwa-la ka ihere olile-anyam mem.
117Kwaliem elu, ewe zọputam,
M'gēle kwa ukpuru-Gi nile anya ọma mb͕e nile.
118I ledawo ndi nile si n'ukpuru nile Gi jehie anya,
N'ihi na okwu-ugha ka aghughọ-ha bu.
119I nēme ka ndi nile nēmebi iwu n'uwa gwusia di ka ifuru:
N'ihi ya ka m'huworo ihe-àmà-Gi nile n'anya.
120Aji anu-arum guzoro ọtọ site n'oké egwu-Gi;
Ọ bu kwa ikpé-Gi nile ka m'nātu egwu ha.
v
121Emewom ikpe ekpere na ezi omume:
Arapulam nye ndi nēmeb͕um.
122Buru onye-mbe nye orù-Gi na I gēmem nma:
Ekwela ka ndi-nganga meb͕uem.
123Anyam abua adalawo n'isi n'ichọsi nzọputa-Gi ike,
Na n'ichọsi okwu ezi omume-Gi ike.
124Meso orù-Gi dika ebere-Gi si di,
Zíkwam ukpuru-Gi nile
125Orù-Gi ka m'bu, me ka m'ghọta ihe,
Ka m'we mara ihe-àmà-Gi nile.
126Mb͕e eruworo Jehova ilu ọlu;
Ha emebiwo iwu-Gi.
127N'ihi nka ka m'huworo ihe nile I nyere n'iwu n'anya
Kari ọla-edo, e, kari ọla-edo anuchara anucha.
128N'ihi nka ka m'guworo ihe-iriba-ama-Gi nile, nke diri ihe nile, n'ihe ziri ezi;
Uzọ okwu-ugha ọ bula ka m'kpọworo asì.
p
129Oké ọlu ka ihe-àmà-Gi nile bu:
N'ihi nka ka nkpuru-obim chebeworo ha.
130Nkpughepu okwu-Gi nile nēnye ìhè;
Ọ nēmeka ndi nēnweghi uche ghọta ihe.
131Asaghepurum ọnum, ku kwa ume ike ike;
N'ihi na achọsirim ihe nile I nyere n'iwu ike.
132Chem iru, me-kwa-ram amara,
Dika I si eme ndi nāhu aha-Gi n'anya.
133Me ka nzọ-ukwum nile guzosie ike n'okwu-ọnu-gi:
Ekwe-kwa-la ka ajọ ihe ọ bula buru onye-isim.
134B͕aputam na nmeb͕u nke madu:
M'gēdebe kwa ihe-iriba-ama-Gi nile.
135Me ka iru-Gi nye orù-Gi ìhè;
Zíkwam ukpuru-Gi nile.
136Anya-miri nke di ka ọtutu miri-iyi nāb͕a anyam abua,
N'ihi na ha edebeghi iwu-Gi.
c
137Onye ezi omume ka I bu Jehova,
Ọzọ, ihe ziri ezi ka ikpé-Gi nile bu.
138I nyewo ihe-àmà-Gi nile iwu n'ezi omume
Na ikwesi-ntukwasi-obi di uku.
139Ekworom ekpochapuwom,
N'ihi na ndi nākpab͕um echezọwo okwu-Gi nile.
140Ihe anuchara anucha nke-uku ka okwu-ọnu-Gi bu;
Orù-Gi ahuwo kwa ya n'anya.
141Onye ntà ka m'bu, na onye anēleda anya:
Ma echezọghm ihe-iriba-ama-Gi nile.
142Ezi omume-Gi bu ezi omume nādiru mb͕e ebighi-ebi,
Iwu-Gi bu kwa ezi-okwu
143Ahuhu na nkpà achọtawom:
Ma ihe nile I nyere n'iwu bu ihe nātọm utọ nke-uku.
144Ihe-àmà-Gi nile bu ezi omume rue mb͕e ebighi-ebi:
Me ka m'ghọta ihe, m'gādi kwa ndu.
q
145Ewerewom obim nile kpọ nkpu; zam, Jehova:
Ukpuru-Gi nile ka m'gēchebe.
146Akpọkuwom I; zọputam,
M'gēdebe kwa ihe-àmà-Gi nile.
147Eburum chi-ọbubọ uzọ, we tikue Gi:
Okwu-Gi nile ka m'chere.
148Anyam abua buru nche-abali nile uzọ,
Ka m'we tugharia uche n'okwu-ọnu-Gi.
149Nuru olum, dika ebere-Gi si di:
Dika ikpé-Gi nile si di, Jehova, me ka m'di ndu.
150Ha abiaruwo nso bú ndi nāb͕aso nzube ọjọ;
Ha nọ iwu-Gi n'ebe di anya.
151Gi onwe-gi nọ nso, Jehova;
Ọzọ, ihe nile I nyere n'iwu bu ezi-okwu.
152Site na mb͕e ochie ka m'maworo site n'ihe-àmà-Gi nile,
Na rue mb͕e ebighi-ebi ka I tọworo ntọ-ala-ha.
r
153Hu nweda-n'alam, dọputam;
N'ihi na echezọghm iwu-Gi.
154Kpe ọnum b͕aputakwam:
Dika okwu-ọnu-Gi si di, me ka m'di ndu.
155Nzọputa di anya n'ebe ndi nēmebi iwu nọ;
N'ihi na ha achọghi ukpuru-Gi nile.
156Obi-ebere-Gi nile bara uba, Jehova;
Dika ikpé-Gi nile si di, me ka m'di ndu.
157Ha di ọtutu, bú ndi nēsob͕um na ndi nākpab͕um;
Ma esighm n'ihe-àmà-Gi nile wezuga onwem.
158Ahurum ndi nāghọb͕u nghọb͕u, m'we sọ ha oyi;
N'ihi na ha edebeghi okwu-ọnu-Gi.
159Le otú m'huworo ihe-iriba-ama-Gi nile n'anya:
Dika ebere-Gi si di, Jehova, me ka m'di ndu.
160Isi ihe nke okwu-Gi bu ezi-okwu;
Ọzọ, rue mb͕e ebighi-ebi ka ikpé ọ bula nke ezi omume-Gi di.
S
161Ndi-isi esob͕uwom n'efu;
Ma okwu-Gi nile ka obim tuworo oké egwu ha.
162Obi nātọ mu onwem utọ n'ihi okwu-ọnu-Gi,
Dika onye nāhuta ọtutu ihe-nkwata.
163Okwu-ugha ka m'kpọworo asì, m'we kpọ ya ihe-árú;
Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya.
164Ub͕ò asa n'ubọchi ka m'toworo Gi,
N'ihi ikpé nile nke ezi omume-Gi.
165Udo nke riri nne ka ndi nāhu iwu-Gi n'anya nwere;
Ọ dighi kwa ihe-isu-ngọngọ ha nwere.
166Elewom anya nzọputa-Gi, Jehova,
Ọ bu kwa ihe nile I nyere n'iwu ka m'meworo.
167Nkpuru-obim edebewo ihe-àmà-Gi nile;
Anamahu kwa ha n'anya nke-uku.
168Edebewom ihe-iriba-ama-Gi nile na ihe-àmà-Gi nile;
N'ihi na uzọm nile di n'iru Gi.
t
169Ka iti-nkpum biarue nso n'iru Gi, Jehova:
Dika okwu-Gi si di, me ka m'ghọta ihe.
170Ka aririọ-amaram bia n'iru Gi:
Dika okwu-ọnu-Gi si di, naputam.
171Ka eb͕ub͕ere-ọnum kwuwa otuto;
N'ihi na I nezím ukpuru-Gi nile.
172Ka irem bùa abù bayere okwu-ọnu-Gi;
N'ihi na ihe nile I nyere n'iwu bu ezi omume.
173Ka aka-Gi buru ihe iyerem aka;
N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'rọputaworo.
174Achọsiwom nzọputa-Gi ike, Jehova;
Iwu-Gi bu kwa ihe nātọm utọ nke-uku.
175Ka nkpuru-obim di ndu, ọ gēto kwa Gi;
Ka ikpé-Gi nile ye-kwa-ram aka.
176Efughariwom dika aturu nke furu efu; chọ orù-Gi;
N'ihi na echezọghm ihe nile I nyere n'iwu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 119: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara