Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara ABÙ ỌMA 119:105
Etu esi agụ akwụkwọ nsọ
3 Ụbọchị
Akwụkwọ Nsọ bụ akwụkwọ dị ezigbo mkpa ná mmekọrịta anyị na Chineke. Ọ bụghị naanị ide ihe nkịtị, kama ọ bụ mmụọ sitere n’aka Chineke, banyere etu ndị kwere ekwe kwesịrị isi na-ebi ndụ ha n’ụwa ebe a. Ọ bụkwa akụkọ banyere etú ụfọdụ ndị nna ochie nke okwukwe si nwee ike iso Chineke jee ije mgbe ha nọ n’ụwa. Ya mere, ọ dị mkpa ka anyị nwee echiche ka anyị ga-esi na-agụ akwụkwọ nsọ a.
Akụ Gị Kacha Mma!
5 Ụbọchị
Inweta nloghachi gọziri agọzi na ụbara na-amalite site n'itinye ezigbo ego. Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst ọhụrụ, ọ dịghị ego ka ukwuu ị pụrụ itinye n’okwukwe gị karịa ịnara Okwu Chineke mgbe nile. Bido ebe a iji nyere gị aka ịgụ, ghọta na itinye ya nke ọma kwa ụbọchị. Ewepụtara site n'akwụkwọ a, “Site n’ụwa a; Akwụkwọ ntuziaka Ndị Kraịst maka Uto na Nzube” nke David J. Swandt dere.
Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka Ọbụla
Ụbọchị Iri ato
Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.