Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 119:105-144

ABÙ ỌMA 119:105-144 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m bụrụkwa ìhè nʼụzọ m. Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike, na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile. Ataala m ahụhụ nke ukwuu; chebe ndụ m, o ONYENWE ANYị, dịka okwu gị si dị. O ONYENWE ANYị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m, kuziekwara m iwu gị niile. Mkpụrụobi m na-adị m nʼọbụaka m oge niile, ma echezọghị m iwu gị. Ndị ajọ omume esielera m ọnya, ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo. Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi; ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ. Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gị ruo na ngwụcha. Ana m akpọ ndị na-enwe obi abụọ asị, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya. Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m; olileanya m dị nʼokwu gị. Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-eme ihe ọjọọ, ka m nwee ike idebe iwu niile nke Chineke m! Gbaa m ume dịka nkwa gị si dị, aga m adịkwa ndụ; ekwekwala ka olileanya m daa. Kwagide m, aga m abụ onye a gbapụtara; aga m anọgide na-asọpụrụ iwu gị niile. Ị na-ajụ ndị niile na-adịghị edebe iwu gị, nzube aghụghọ ha niile bụ ihe na-enweghị isi. Ị na-ekpochapụ ndị ajọ omume dịka unyi a na-ekpofu ekpofu; nʼihi ya, ahụrụ m ụkpụrụ gị niile nʼanya. Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị; ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile. Emeela m ihe dị mma na ihe ziri ezi; ahapụkwala m nʼaka ndị na-emegbu m. Kwee ohu gị nkwa na ị ga-elekọta ya; ekwela ka ndị mpako kpagbuo m. Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nzọpụta gị ebe m na-ele anya nkwa gị ziri ezi. Biko mesoo ohu gị mmeso dịka ịhụnanya gị si dị ma kuziekwara m ụkpụrụ gị niile. Abụ m ohu gị, nye m nghọta, ka m nwee ike mara ụkpụrụ gị niile. O ONYENWE ANYị, oge eruola mgbe ị ga-arụ ọrụ, nʼihi na a na-emebi iwu gị. Nʼihi na ahụrụ m iwu gị niile nʼanya karịa ọlaedo, e karịa ọlaedo a nụchara anụcha, nʼihi na m na-ahụta ụkpụrụ gị niile ka ihe ziri ezi, akpọrọ m ụzọ niile na-ezighị ezi asị. Iwu gị niile dị ịtụnanya; ya mere, ana m erubere ha isi. Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe. Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike, na-achọsi iwu gị niile ike. Chee m ihu, meere m ebere, dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere. Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị; ekwela ka mmehie chịa m. Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m, ka m nwee ike debe iwu gị. Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị. Kuziere m ụkpụrụ gị niile. Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuu nʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị. O ONYENWE ANYị, ị bụ onye ezi omume, iwu gị niile zikwara ezi. Ụkpụrụ gị niile ziri ezi; ha kwesiri ntụkwasị obi. Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya, ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba. Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma, ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya. Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya, ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya. Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi. Iwu gị niile bụkwa eziokwu. Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m, ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m. Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi; nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ.

ABÙ ỌMA 119:105-144 Bible Nso (IGBOB)

Okwu-Gi bu oriọna diri ukwum, Ọ bu kwa ìhè diri okporo-uzọm. Aṅuwom iyi, me ka o guzosie ike, Na m'gēdebe ikpé nile nke ezi omume-Gi. Ewedawom n'ala nke-uku: Me ka m'di ndu, Jehova, dika okwu-Gi si di. Biko, ka onyinye-afọ-ofufo nile nke ọnum tọ Gi utọ, Jehova, Zíkwam ikpé-Gi nile. Nkpuru-obim di n'ọbu-akam mb͕e nile; Ma echezọghm iwu-Gi. Ndi nēmebi iwu esiworom ọnya; Ma esighm nihe-iriba-ama-Gi nile fugharia. Eketawom ihe-àmà-Gi nile rue mb͕e ebighi-ebi; N'ihi na ihe nātọ obim utọ ka ha bu. Ewezugawom obim ime ukpuru-Gi nile, Rue mb͕e ebighi-ebi, rue mb͕e ikpe-azu. Ndi nwere uche abua ka m'kpọworo asì: Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya. Ebe-nzuzom na ọtam ka I bu: Okwu-Gi ka m'chereworo. Sinu n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu, unu ndi nēme ihe ọjọ; Ka m'we chebe ihe nile Chinekem nyere n'iwu. Kwagidem dika okwu-ọnu-Gi si di, ka m'we di ndu; Eme-kwa-la ka ihere olile-anyam mem. Kwaliem elu, ewe zọputam, M'gēle kwa ukpuru-Gi nile anya ọma mb͕e nile. I ledawo ndi nile si n'ukpuru nile Gi jehie anya, N'ihi na okwu-ugha ka aghughọ-ha bu. I nēme ka ndi nile nēmebi iwu n'uwa gwusia di ka ifuru: N'ihi ya ka m'huworo ihe-àmà-Gi nile n'anya. Aji anu-arum guzoro ọtọ site n'oké egwu-Gi; Ọ bu kwa ikpé-Gi nile ka m'nātu egwu ha. Emewom ikpe ekpere na ezi omume: Arapulam nye ndi nēmeb͕um. Buru onye-mbe nye orù-Gi na I gēmem nma: Ekwela ka ndi-nganga meb͕uem. Anyam abua adalawo n'isi n'ichọsi nzọputa-Gi ike, Na n'ichọsi okwu ezi omume-Gi ike. Meso orù-Gi dika ebere-Gi si di, Zíkwam ukpuru-Gi nile Orù-Gi ka m'bu, me ka m'ghọta ihe, Ka m'we mara ihe-àmà-Gi nile. Mb͕e eruworo Jehova ilu ọlu; Ha emebiwo iwu-Gi. N'ihi nka ka m'huworo ihe nile I nyere n'iwu n'anya Kari ọla-edo, e, kari ọla-edo anuchara anucha. N'ihi nka ka m'guworo ihe-iriba-ama-Gi nile, nke diri ihe nile, n'ihe ziri ezi; Uzọ okwu-ugha ọ bula ka m'kpọworo asì. Oké ọlu ka ihe-àmà-Gi nile bu: N'ihi nka ka nkpuru-obim chebeworo ha. Nkpughepu okwu-Gi nile nēnye ìhè; Ọ nēmeka ndi nēnweghi uche ghọta ihe. Asaghepurum ọnum, ku kwa ume ike ike; N'ihi na achọsirim ihe nile I nyere n'iwu ike. Chem iru, me-kwa-ram amara, Dika I si eme ndi nāhu aha-Gi n'anya. Me ka nzọ-ukwum nile guzosie ike n'okwu-ọnu-gi: Ekwe-kwa-la ka ajọ ihe ọ bula buru onye-isim. B͕aputam na nmeb͕u nke madu: M'gēdebe kwa ihe-iriba-ama-Gi nile. Me ka iru-Gi nye orù-Gi ìhè; Zíkwam ukpuru-Gi nile. Anya-miri nke di ka ọtutu miri-iyi nāb͕a anyam abua, N'ihi na ha edebeghi iwu-Gi. Onye ezi omume ka I bu Jehova, Ọzọ, ihe ziri ezi ka ikpé-Gi nile bu. I nyewo ihe-àmà-Gi nile iwu n'ezi omume Na ikwesi-ntukwasi-obi di uku. Ekworom ekpochapuwom, N'ihi na ndi nākpab͕um echezọwo okwu-Gi nile. Ihe anuchara anucha nke-uku ka okwu-ọnu-Gi bu; Orù-Gi ahuwo kwa ya n'anya. Onye ntà ka m'bu, na onye anēleda anya: Ma echezọghm ihe-iriba-ama-Gi nile. Ezi omume-Gi bu ezi omume nādiru mb͕e ebighi-ebi, Iwu-Gi bu kwa ezi-okwu Ahuhu na nkpà achọtawom: Ma ihe nile I nyere n'iwu bu ihe nātọm utọ nke-uku. Ihe-àmà-Gi nile bu ezi omume rue mb͕e ebighi-ebi: Me ka m'ghọta ihe, m'gādi kwa ndu.