Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 26

26
1Dika snow na mb͕e okpom-ọku, na dika miri-ozuzo na mb͕e owuwe-ihe-ubi,
Otú a nsọpuru amaghi nma nye onye-nzuzu.
2Dika nnunu na nfeghari-ya, dika eleke n'ofufe-ya,
Otú a nkọcha adighi-abia n'efu.
3Utari diri inyinya, bridle diri inyinya-ibu,
Nkpa-n'aka di-kwa-ra azu ndi-nzuzu.
4Azala onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di,
Ka i we ghara idi ka ya, ọbuná gi onwe-gi.
5Za onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di,
Ka o we ghara ibu onye mara ihe n'anya-ya.
6Onye nēbipu ukwu onwe-ya na onye nāṅu ime-ihe-ike dika miri
Ka onye ahu bu nēzi ozi site n'aka onye-nzuzu.
7Ogwe-ukwu abua nke onye-ngwurọ nākwu efe:
Otú a ka ilu di n'ọnu ndi-nzuzu.
8Dika akpa nkume di iche iche nke di oké ọnu-ahia n'obo nkume,
Otú a ka onye nēnye onye-nzuzu nsọpuru di.
9Dika ogwu nke dumiworo n'aka onye nāṅubiga manya ókè,
Otú a ka ilu n'ọnu ndi-nzuzu di.
10Onye-ọ̀kà nākpu ihe nile,
Ma onye nēgo onye-nzuzu ilu ọlu di ka onye nēgo ndi nāgabiga agabiga.
11Dika nkita nke chighariworo ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ,
Otú a ka onye-nzuzu di nke nēme kwa ihe uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ọzọ.
12Ì huwo onye ọ bula nke bu onye mara ihe n'anya-ya?
Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.
13Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'uzọ;
Ọdum di n'amá.
14Dika ibo-ọnu-uzọ si emeghari n'ihe-nkoye-ya,
Otú a ka onye-ume-ngwu nēmeghari n'ihe-ndina-ya.
15Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa;
Ọ nāgwu ya ike iweghachi ya n'ọnu-ya.
16Onye-ume-ngwu bu onye mara ihe n'anya-ya
Kari madu asa ndi nāzaghachi okwu n'ezi uche.
17Onye nējide nkita na nti ka ọ bu,
Bú onye nāgabiga, nēwebiga iwe ókè n'ihi ise-okwu nābughi nke ya.
18Dika onye-ará nke nātu àkú nēre ọku,
Na àkú, na ọnwu;
19Otú a ka onye ahu di nke ghọb͕uworo madu-ibe-ya,
We si, Ọ̀ bughi egwú ka m'nēgwu?
20Mb͕e nkú nādighi ọku gānyu:
Otú a mb͕e ọ dighi onye nēkwu okwu-azu, ise-okwu gādaju.
21Dika icheku si di n'ebe icheku nēre ọku di, na dika nkú si di n'ebe ọku di;
Otú a ka onye nēse okwu di ime ka ilu-ọ̀gù nwuru ọku.
22Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri di iche iche nātọ utọ nke-uku,
Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ.
23Ejùjù nke amachitaworo n'afuru-uzu ọla-ọcha
Ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēre ọku na obi ọjọ bu.
24Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka onye nke nākpọ asì nēji buru onye-iru-abua,
Ma nime onwe-ya ka ọ nētiye aghughọ:
25Mb͕e olu-ya nēkwu amara, ekwela ya;
N'ihi na ihe-árú asa di n'obi-ya.
26Ọ bu ezie na ikpọ-asi-ya ji nrafu ekpuchi onwe-ya,
Ma agēkpughe ihe ọjọ ya nime nkpọkọta ndi-ya.
27Onye nēgwu olùlù, nime ya ka ọ gādabà:
Ọzọ, onye nākpọre nkume, ya ka ọ gālaghachikuru.
28Ire okwu-ugha nākpọ ndi o gwepiaworo asì;
Ọzọ, ọnu nke nēkwu ire-utọ nākpata nnuda.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ILU 26: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye