Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 27

27
1Anyala isi bayere echi;
N'ihi na i maghi ihe chi gābọ.
2Ka onye ala ọzọ to gi, ma ọ bughi ọnu-gi;
Ka onye mba ọzọ to gi, ma ekwela ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua to gi.
3Nkume di arọ́, ájá bu kwa ibú;
Ma nkpasu-iwe nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ di arọ́ kari ha abua.
4Ihe nēnweghi obi-ebere ka ọnuma bu, iju-miri ka iwe bu kwa;
Ma ònye gēguzo n'iru ekworo?
5Ọ di nma, bú iba-nba n'ìhè,
Kari ihu-n'anya nke ezobeworo ezobe.
6Ihe kwesiri ntukwasi-obi ka ob͕ub͕u-mma nile nke onye nāhu gi n'anya bu:
Ma ihe riri nne ka nsutu-ọnu nke onye nākpọ gi asì bu.
7Nkupuru-obi nke rijuworo afọ nāzọda manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nābusi:
Ma ihe nile ọ bula nke nēlu ilu nātọ nkpuru-obi agu nāgu utọ.
8Dika nnunu nke nēsi n'akwu-ya efefu,
Otú a ka madu di nke nēsi n'ọnọdu-ya akpafu.
9Manu na ihe-nsure-ọku nke nēsi ísì utọ nēme ka obi ṅuria:
Otú a ka utọ eyì madu di nke sitere na ndum-ọdu nke nkpuru-obi.
10Arapula eyì-gi na eyì nna-gi;
Abà-kwa-la n'ulo nwa-nne-gi n'ubọchi nhuju-anya-gi:
Ọ di nma, bú ab͕ata-obi nke nọ nso, Kari nwa-nne nke nọ n'ebe di anya.
11Mara ihe, nwam, we me ka obim ṅuria,
Ka m'we zaghachi onye nātam uta okwu.
12Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya:
Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra.
13Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe;
N'ọnọdu nwanyi nābughi nwunye-ya nara ya onwe-ya n'ihe-ibe.
14Onye ji oké olu agọzi madu-ibe-ya, nke nēbili n'isi-ututu ime ya,
Nkọcha ka agāgu ngọzi ahu nye ya.
15Miri-ọtutu nke nātu mb͕e nile n'ubọchi oké miri-ozuzo,
Ya na nwanyi nke nēse okwu yiri:
16Onye nēzobe ya ezobewo ifufe,
Ọ bu kwa manu ka aka-nri-ya nēzute.
17Ígwè nāmucha ígwè;
Otú a ka madu nāmucha iru eyì-ya.
18Onye nēche osisi fig gēri nkpuru-ya;
Ọ bu kwa onye nāriba onye-nwe-ya ama ka agāsọpuru.
19Dika miri si eme ka iru hu iru,
Otú a ka obi nēme ka madu hu madu.
20Afọ adighi-eju ala-mọ na ebe-ila-n'iyì;
Otú a afọ adighi-eju anya abua nke madu.
21Ite eji anucha ihe diri ọla-ọcha, oké ọku di-kwa-ra ọla-edo,
Anānwa kwa onye ọ bula site n'otuto-ya.
22Ọ buru na i ji aka-íkwè supia onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'íkwè n'etiti ọka asuru asu,
Uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ agaghi-esi n'aru ya wezuga onwe-ya.
23Mara iru igwè ewu na aturu-gi nke-ọma,
Tukwasi obi-gi n'igwè anu-ulo-gi nile:
24N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka àkù di;
Okpu-eze kwa, ọ̀ nādiru ọb͕ọ nile?
25Ekpopuwo ahihia, ewe hu ahihia ndu,
Chikọta kwa ihe-ọkukú nile nke ugwu nile.
26Umu-aturu diri uwe-oyiyi-gi,
Ọnu-ahia nke ọhia-gi ka ewu bu kwa:
27Ara ewu gēzu-kwa-ra nri-gi, zu-kwa-ra nri ulo-gi;
Buru kwa ihe gēdebe umu-ab͕ọghọ-gi ndu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ILU 27: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara