Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 25

25
1Ndia bu kwa ilu Solomon turu, nke ndi Hezekaia, bú eze Juda, deputara n'akwukwọ.
2Ọ bu nsọpuru Chineke izobe okwu:
Ma nsọpuru ndi-eze bu igwuputa ala okwu.
3Elu-igwe n'idi-elu-ya, na ala n'omimi-ya,
Na obi ndi-eze, ọ dighi ngwuputa di ha.
4Wepu afuru-uzu n'ọla-ọcha,
Ihe ewe putara onye nānucha ọla:
5Wepu onye nēmebi iwu n'iru eze,
Oche-eze-ya ewe guzosie ike n'ezi omume.
6Asọpurula onwe-gi n'iru eze,
Eguzo-kwa-la n'ọnọdu ndi uku:
7N'ihi na ọ di nma ka asi gi, Rigota ebe a;
Kari ka eme ka i di ala n'iru onye amara aha-ya,
Onye anya-gi abua huworo.
8Apula ngwa ngwa ise okwu,
Ka o we ghara ibu na i maghi ihe i gēme n'ikpe-azu-ya,
Mb͕e madu-ibe-gi etiyewo gi n'ọnọdu-ihere.
9Gi na madu-ibe-gi kwurita okwu-ikpe-gi,
Ekpughe-kwa-la izù nzuzo nke onye ọzọ:
10Ka onye nke nānu ya we ghara ikwulu gi,
Akukọ ihe ọjọ gi ewe ghara isi n'ebe i nọ laghachi.
11Nkpuru-osisi apple ọla-edo nime nkata ọla-ọcha
Ka okwu ekwuru na mb͕e kwesiri ya bu.
12Nb͕a-aka ọla-edo na ihe-ichọ-nma nke ọla-edo ọma
Ka onye nāba nba nke mara ihe bu na nti nke nānu ihe.
13Dika oyi snow n'ubọchi owuwe-ihe-ubi,
Otú a ka ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi diri ndi nēziga ya;
Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-nwe-ya ka ọ nēwelata.
14Igwe-oji na ifufe nke miri-ozuzo nādighi
Ka onye nke nānya isi n'onyinye okwu-ugha bu.
15Site n'eweghi iwe ọsọsọ ka anāràye onye-isi,
Ire nrò nānyaji kwa ọkpukpu.
16Ọ̀ bu manu-aṅu ka i chọtaworo? racha nke gēzuru gi;
Ka i we ghara iriju ya afọ, we b͕ọ ya.
17Me ka ukwu-gi kọ ukọ n'ulo madu-ibe-gi;
Ka ihe-gi we ghara iju ya afọ, o we kpọ gi asì.
18Otùtù-agha na mma-agha na àkú di nkọ
Ka onye nke nāb͕a àmà okwu-ugha megide madu-ibe-ya bu.
19Ezé nyajiri anyaji na ukwu chikwa-puru echikwapu
Ka itukwasi onye-nghọb͕u obi n'ubọchi ahuhu bu.
20Dika onye nēyipu uwe n'ubọchi oyi, dika manya b͕ara uka n'elu akanwu,
Otú a ka onye nābùru obi jọrọ njọ abù di.
21Ọ buru na agu nāgu onye nākpọ gi asì, gi me ka o rie nri;
Ọ buru kwa na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ṅua miri:
22N'ihi na icheku nēre ọku ka i nāgukwasi n'isi-ya,
Jehova gākwughachi kwa gi.
23Ifufe Ugwu nāmuputa oké miri-ozuzo:
Ọ bu kwa iru oké iwe ka iré nēkwu okwu-azu nāmuputa.
24Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo,
Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù.
25Dika miri oyi si adiri nkpuru-obi nāda #mbà,
Otú a ka okwu ọma anuru site n'ala di anya di.
26Isi-iyi azọtọrọ azọtọ na ebe-nsuputa-miri bibiri ebibi
Ka onye ezi omume nke anēwezuga n'ọnọdu-ya n'iru onye nēmebi iwu bu.
27Iracha manu-aṅu ri nne adighi nma:
Otú a ọ buru na madu egwuputa ala nsọpuru-ha ọ bughi nsọpuru.
28Obodo etikpọrọ etikpọ nke mb͕idi nādighi
Ka onye ọ bula nke nādighi-ebọchi mọ-ya bu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ILU 25: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye