Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 24

24
1Ekwosola ndi ọjọ ekworo,
Achọsi-kwa-la ike inọ n'etiti ha:
2N'ihi na ipunara-madu-ihe ka obi-ha nātughari,
Okwu nmeb͕u ka eb͕ub͕ere-ọnu-ha nēkwu.
3Amam-ihe ka eji ewu ulo;
Ọ bu kwa nghọta ka eji eme ka o guzosie ike:
4Site kwa n'ihe-ọmuma ka ime-ulo-ya nile nējuputa
N'àkù nile di oké ọnu-ahia di kwa utọ.
5Onye mara ihe di ike;
E, onye nwere ihe-ọmuma nēme ka ike nwe ume.
6N'ihi na ezi ndum-ọdu ka i gēji eburu onwe-gi agha:
Ọzọ, nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu.
7Amam-ihe adikara onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ elu:
Ọ dighi-asaghe ọnu-ya n'ọnu-uzọ-ama.
8Onye nēchè ime ihe ọjọ,
Ya ka agākpọ onye-nwe nzube ọjọ nile.
9Nzube nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ bu nmehie:
Ọzọ, ihe-árú n'anya madu ka onye nke nākwa emò bu.
10Ọ buru na i di ume-ngwu n'ubọchi ahuhu,
Ike-gi pere npe.
11Naputa ndi anāchigara ọnwu,
Ndi ahu kwa anēwezuga n'ọnọdu-ha nye n'ob͕ub͕u, gi lezie anya ka i b͕ochie ha.
12Mb͕e i si, Le, ayi amaghi ihe a:
Onye nātùzi obi nile, Ònye ahu adighi-aghọta?
Onye nēche kwa nkpuru-obi-gi nche, Ònye ahu adighi-ama?
Ọ̀ gaghi-enyeghachi kwa madu dika ọlu-ya si di?
13Nwam, racha manu-aṅu, n'ihi na ọ di nma;
Ya na manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nābusi, nke nātọ okpo-ọnu-gi utọ:
14Mara na otù a ka amam-ihe diri nkpuru-obi-gi:
Ọ buru na i chọtawo ya, ọdi-n'iru gādi kwa, Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi.
15Gi onye nēmebi iwu, echela anwu imegide ebe-obibi onye ezi omume;
Apunarala ya ebe-izu-ike-ya:
16N'ihi na ub͕ò asa ka onye ezi omume nāda, bili kwa ọzọ:
Ma ndi nēmebi iwu nāsu ngọngọ n'ihe ọjọ.
17Aṅurila mb͕e onye-iro-gi nāda,
Ka obi-gi ghara kwa iteghari egwú ọṅù mb͕e ọ nāsu ngọngọ:
18Ka Jehova we ghara ihu ya, o we jọ njọ n'anya-Ya,
O we me ka iwe-Ya si n'aru ya laghachi.
19Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ;
Ekwosola ndi nēmebi iwu ekworo.
20N'ihi na ọdi-n'iru agaghi-adiri onye ọjọ;
Oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.
21Nwam, tua egwu Jehova na eze:
Agwakọtala onwe-gi na ndi nēnwo enwo:
22N'ihi na ọ bu na mberede ka nhuju-anya-ha gēbili;
Ọdida nke ha abua kwa, ònye mara ya?
23Ndia bu kwa okwu nke ndi mara ihe.
Imata iru madu n'ikpé adighi nma.
24Onye nāsi onye nēmebi iwu, Onye ezi omume ka i bu;
Ndi nile di iche iche gākpọlu ya, mba nile gēwesa ya iwe:
25Ma ndi nābara ya nba ka ọ gādi utọ,
Ọ bu kwa ndi ahu ka ezi ngọzi gābiakwasi.
26O ji eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua esutu ọnu,
Bú onye nāza okwu ziri ezi.
27Dozie ije-ozi-gi n'èzí,
Jikere-kwa-ra ya onwe-gi n'ọhia;
Emesia wu kwa ulo-gi.
28Abula onye-àmà megide madu-ibe-gi n'efu;
Ì gēji kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua rafu?
29Asila, Dika o siri mem, otú a ka m'gēme ya;
M'gēnyeghachi onye ahu dika ọlu-ya si di.
30N'akuku ubi onye-ume-ngwu ka m'gabigara,
Na n'akuku ubi-vine nke madu obi amam-ihe kọrọ;
31Ma, le, o púchiri n'ogwu,
Akuba kpuchiri iru-ya,
Akwada-kwa-ra mb͕idi nkume ya.
32Mu onwem we hu, m'we tukwasi obim na ya:
Ahurum ya, we nata idọ-aka-na-nti.
33Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà,
Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala:
34Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe;
Ihe-ukọ-gi kwa, dika nwoke ji ọta.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ILU 24: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye