Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 23

23
1Mb͕e i soro onye nāchi achi iri nri,
Ghọta nke-ọma onye ahu nke nọ n'iru gi;
2Tukwasi kwa mma n'akpiri-gi,
Ma ọ buru na onye nri-ya nātọ ya utọ ka i bu.
3Achọsila nri utọ ya ike;
Ebe nri ahu bu nri okwu-ugha.
4Adọb͕ula onwe-gi n'ọlu ibu ọgaranya;
Site na nghọta-gi ra ya aka.
5Ì gātukwasi anya-gi abua na ya? ọ dighi kwa:
N'ihi na àkù nēmere onwe-ya nkù n'ezie, Dika ugo ka ọ nēfesi n'elu-igwe.
6Erila nri nke onye nwere anya ọjọ,
Achọsi-kwa-la nri utọ ya ike:
7N'ihi na dika o si echè èchìchè na nkpuru-obi-ya, otú a ka ọ di:
Rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ka ọ nāsi gi; Ma obi-ya adighi n'ebe i nọ.
8Iberibe-nri-gi nke i riworo ka i gāb͕ọputa,
Okwu-gi nile nke di utọ ewe funari gi.
9Ekwula okwu na nti onye-nzuzu;
N'ihi na ọ gēleda ezi uche nke okwu-gi nile anya.
10Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi;
Abà-kwa-la n'ọhia ọ bula nke umu-nb͕ei:
11N'ihi na Onye-nb͕aputa-ha di ike;
Ya onwe-ya gēkpe ọnu-ha megide gi.
12Me ka obi-gi ba n'idọ-aka-na-nti,
Me kwa ka nti-gi abua ba n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma.
13Eb͕ochila idọ-aka-na-nti n'aru nwata:
Mb͕e i gēji nkpa-n'aka tie ya, ọ gaghi-anwu.
14Gi onwe-gi gēji nkpa-n'aka tie ya,
We naputa nkpuru-obi-ya n'ala-mọ.
15Nwam, ọ buru na obi-gi mara ihe,
Obim gāṅuri, ọbuná nkem:
16Akurum abua gāwuli kwa n'ọṅù,
Mb͕e eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua nēkwu ihe ziri ezi.
17Ekwela ka obi-gi kwoso ndi-nmehie ekworo:
Kama n'egwu Jehova ka i gānọ ogologo ubọchi nile.
18N'ihi na ọdi-n'iru aghaghi idi;
Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi.
19Nuru, gi onwe-gi, nwam, we mara ihe,
Me kwa ka obi-gi gazi agazi n'uzọ.
20Anọla n'etiti ndi nāṅubiga manya-vine ókè;
N'etiti ndi nēribiga anu ókè:
21N'ihi na onye nāṅubiga manya ókè na onye nēribiga ihe ókè ka agānapu ihe nile:
Ọ bu kwa nkirika ákwà ka òrù-ura gēyikwasi madu.
22Ge nna-gi, bú onye muru gi, nti,
Eleda-kwa-la nne-gi anya mb͕e o mere agadi.
23Zuta ezi-okwu, ere-kwa-la ya;
E, amam-ihe, na idọ-aka-na-nti, na nghọta.
24Nna nke onye ezi omume gēteghari egwú ọṅù nke-uku:
Onye nāmu kwa onye mara ihe gāṅuri ọṅu na ya.
25Ka nna-gi na nne-gi ṅuria,
Ka nwanyi muworo gi teghari kwa egwú ọṅù.
26Nwam, nyem obi-gi,
Ka uzọm nile tọ kwa anya-gi abua utọ.
27N'ihi na ọbù nke miri emi ka nwanyi nke nākwa iko bu;
Olùlù nke di nkpà ka nwanyi nābughi nwunye-gi bu.
28E, nwanyi ahu nēche anwu dika onye nāpunara madu ihe,
Ọzọ, ndi-nghọb͕u n'etiti madu ka ọ nēme ka ha ba uba kari.
29Ònye nwere ahuhu? ònye nwere iru-újú? ònye nwere ise-okwu?
Ònye nwere ntamu? ònye nwere ob͕ub͕u-mma n'efu?
Ònye nwere anya nācha ọbara-ọbara?
30Ọ bu ndi nānọ na manya-vine ogologo mb͕e;
Ndi nābà n'ulo ichọputa manya agwara agwa.
31Elekwasila manya-vine anya mb͕e ọ nācha ọbara-ọbara,
Mb͕e ọ nēnye udi-ya n'iko,
Mb͕e ọ nāsughari n'iko nke-ọma:
32N'ikpe-azu-ya ọ bu dika agwọ ka ọ nāta,
Ọ bu kwa dika aju-ala ka ọ nātu.
33Anya-gi abua gāhu ndinyom nābughi nwunye-gi,
Obi-gi gēkwu kwa okwu ib͕akuta Chineke azu.
34I gādi kwa ka onye nēdina n'etiti oké osimiri,
Ma-ọbu dika onye nēdina n'elu akpu-ub͕ọ.
35Ha etib͕uwom, ka i gāsi, ariaghm ọria;
Ha apiawom ihe, amaghm:
Òle mb͕e m'gēteta? m'gāchọ kwa ya ọzọ.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ILU 23: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye