Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 22

22
1Ihe anārọputa ka ezi aha bu kari ọtutu àkù,
Amara di kwa nma kari ọla-ọcha na ọla-edo.
2Ọgaranya na ob͕eye ezutewo:
Onye meworo ha nile bu Jehova.
3Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya:
Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra.
4Ọkpukpu-ọlu nke obi ume-ala na egwu Jehova
Bu àkù, na nsọpuru, na ndu.
5Ogwu na ib͕udu di n'uzọ onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi:
Onye nēdebe nkpuru-obi-ya gānọ ha n'ebe di anya.
6Zulite nwata dika uzọ-ya si di,
Ọbuná mb͕e o mere okenye ọ gaghi-esi nime ya wezuga onwe-ya.
7Ọgaranya nāchi ndi-ob͕eye,
Ọzọ, orù ka onye nēbiri ego buru onye-nbinye.
8Onye nāgha ajọ omume dika nkpuru gēwe ajọ ihe dika ihe-ubi:
Nkpa-n'aka nke nrubiga ókè nke iwe-ya gāgwusi kwa.
9Onye nwere anya ọma, onye ahu ka agāgọzi;
N'ihi na o werewo nri-ya ufọdu nye onye nēnweghi ike.
10Chupu onye nākwa emò, ise-okwu gāpu kwa;
E, iru-uka na nlelì gākwusi.
11Onye nāhu idi-ọcha nke obi n'anya,
Eyì-ya ka eze gābu n'ihi amara nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua.
12Anya abua nke Jehova echebewo onye-ihe-ọmuma,
Ma Ọ nēkpù okwu nile nke onye-nghọb͕u iru.
13Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'èzí:
N'etiti amá ka agēb͕um.
14Ọbù nke miri emi ka ọnu ndinyom nābughi nwunye-gi bu:
Onye Jehova nēwesa oké iwe gādabà nime ya.
15Uche b͕agọrọ ab͕agọ bu ihe ekekọtaworo n'obi nwata;
Ma nkpa-n'aka nke idọ-aka-na-nti gēme ka ọ di anya n'ebe ọ nọ.
16Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike ime ka àkù nke aka ya ba uba,
Ya na onye nēnye ọgaranya ihe gābiaru nání ihe-ukọ.
17Tọ nti-gi n'ala, nu okwu nile nke ndi mara ihe,
Tukwasi kwa obi-gi n'ihe-ọmumam.
18N'ihi na ọ di utọ mb͕e i debe ha n'afọ-gi,
Mb͕e ha gēguzosi ike n'otù n'elu eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua.
19Ọ bu ka ntukwasi-obi-gi we di na Jehova
Ka m'meworo ka i mara ha ta, ọbuná gi onwe-gi.
20Èdetaghm i isi ihe
Nime ndum-ọdu di iche iche na ihe-ọmuma;
21Ime ka i mara ikwesi-ntukwasi-obi nke okwu-ọnu nile nke ezi-okwu,
Ka i we weghachiri ndi nēzite gi okwu-ọnu nile nke bu ezi-okwu?
22Anapula onye nēnweghi ike ihe n'ike, n'ihi na onye nēnweghi ike ka ọ bu,
Azọpia-kwa-la onye ewedara n'ala n'ọnu-uzọ-ama:
23N'ihi na Jehova gēkpe ọnu-ha,
We punara ndi ahu ndu, bú ndi nāpunara ha ihe.
24Gi na onye-iwe abula eyì;
I gaghi-eso kwa onye-ọnuma ba n'ulo:
25Ka i we ghara imuta uzọ-ya nile,
We wetara nkpuru-obi-gi ọnyà.
26Abula otù nime ndi gānara madu n'aka,
Abu-kwa-la otù nime ndi nọ na mbe bayere ugwọ di iche iche.
27Ọ buru na i nweghi ihe ikwu ugwọ,
N'ìhi gini ka ọ gānapu ihe-ndina-gi n'okpuru gi?
28Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi,
Nke nna-gi-hà kpaworo.
29Ì huwo madu nke nēme ngwa n'ije-ozi-ya? n'iru ndi-eze ka o gēguzo onwe-ya;
Ọ gaghi-eguzo onwe-ya n'iru ndi anāmaghi aha-ha.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ILU 22: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye