Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 21

21
1Iyi di iche iche nke juputara na miri ka obi eze bu n'aka Jehova:
N'ebe ọ bula nke nātọ Ya utọ ka Ọ nēwezuga ya.
2Uzọ ọ bula nke onye ọ bula ziri ezi n'anya-ya abua:
Ma onye nātùzi obi nile ka Jehova bu.
3Ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe
Bu ihe Jehova nārọputa kari àjà.
4Anya npako na obi di nganga,
Ọbuná oriọna nke ndi nēmebi iwu, bu nmehie.
5Èchìchè nile nke onye di nkọ nēdubà nání n'urù:
Ma èchìchè nile nke onye ọ bula nke nēme ngwa nēdubà nání n'ikọ-ukọ.
6Ikpa àkù site n'ire okwu-ugha
Bu otù nku-ume anēfesa n'ifufe; ndi nāchọ àkù ahu nāchọ ọnwu.
7Ipunara-madu-ihe nke ndi nēmebi iwu gēkpochapu ha;
N'ihi na ha juru ime ihe ekpere n'ikpe.
8Ihe b͕agọrọ ab͕agọ nke-uku ka uzọ onye ikpe mab͕uru ya bu:
Ma onye di ọcha n'obi, ọlu-ya ziri ezi.
9Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo,
Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù.
10Nkpuru-obi nke onye nēmebi iwu nāchọsi ihe ọjọ ike:
Madu-ibe-ya abughi onye imere amara n'anya-ya.
11Mb͕e anēri onye nākwa emò nra, anēme ka onye nēnweghi uche mara ihe:
Ọzọ, mb͕e anēme ka onye nke mara ihe nwe uche, ọ nānara ihe-ọmuma.
12Onye ezi omume nēnwe uche n'imeso ulo nke onye nēmebi iwu;
Ọ nēkpù ndi nēmebi iwu iru n'ihi ihe ọjọ ha.
13Onye nēkwuchipu nti-ya n'iti-nkpu nke onye nēnweghi ike,
Ya onwe-ya gākpọ kwa nkpu, ma agaghi-aza ya.
14Onyinye enyere na nzuzo nādaju iwe,
Iri-ngo ezobere n'uwe-obi nādaju kwa ọnuma siri ike.
15Ọ buru onye ezi omume ọṅù ime ihe ekpere n'ikpe;
Ma nbibi diri ndi nālu ajọ ihe.
16Madu nke nēsi n'uzọ ezi uche akpafu,
Nime nkpọkọta nke ndi nādighi ndu ka o gēzu ike.
17Onye ihe kọrọ ka onye nāhu ọṅù n'anya gābu:
Onye nāhu manya-vine na manu n'anya agaghi-abu ọgaranya.
18Ihe-nb͕aputa ib͕aputa onye ezì omume ka onye nēmebi iwu bu;
Ọzọ, n'ọnọdu ndi ziri ezi ka onye nāghọb͕u aghọb͕u nọ.
19Ọ di nma inọ n'ala bú nání ọzara,
Kari inọyere nwayi nēse okwu nākpasu kwa iwe.
20Àkù anāchọsi ike na manu di n'ebe-obibi nke onye mara ihe;
Ma madu nzuzu nēloda ya.
21Onye nāb͕aso ezi omume na ebere
Nāchọta ndu, na ezi omume, na nsọpuru.
22Obodo ndi-dike ka onye nke mara ihe rigobàworo,
O we me ka ike nke ikwesi-ntukwasi-obi-ya rida.
23Onye nēdebe ọnu-ya na ire-ya
Nēdebe nkpuru-obi-ya ka ọ pua n'ahuhu nile.
24Onye-nganga na onye-npako, onye nākwa emò bu aha-ya,
Ọ nālu ọlu n'iwe nērubiga ókè nke nganga.
25Ọchichọ siri ike nke onye-ume-ngwu nēme ka ọ nwua;
N'ihi na aka-ya abua juru ilu ọlu.
26Ogologo ubọchi nile ka ọ chọsiworo ihe ike nke-uku:
Ma onye ezi omume nēnye, ọ dighi-eb͕ochi kwa aka-ya inye ihe.
27Àjà nke ndi nēmebi iwu bu ihe-árú:
O gēsi kwa aṅa ghara ibu ihe-árú kari, mb͕e o ji nzube ọjọ weta ya?
28Onye-àmà okwu-ugha gāla n'iyì:
Ma onye nānu, rue mb͕e ebighi-ebì ka o gēkwu.
29Onye nēmebi iwu emewo ka iru-ya sie ike:
Ma onye ziri ezi, onye ahu nēdozi uzọ-ya nile.
30Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di,
Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.
31Inyinya bu ihe anēdoziri ubọchi agha:
Ma Jehova nwe nzọputa.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ILU 21: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye