Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌNU-ỌGUGU 13

13
1Jehova we gwa Moses okwu, si, 2Zigara onwe-gi ndikom, ka ha we ledo ala Kenean, nke Mu onwem nēnye umu Israel: otù nwoke otù nwoke diri ebo nna-ya-hà ka unu gēziga, onye ọ bula, ọ buru onye-isi n'etiti ha. 3Moses we si n'ọzara Peran ziga ha n'okwu-ọnu Jehova: ha nile bu ndikom, ndi-isi umu Israel ka ha bu. 4Ndia bu aha-ha: nke diri ebo Reuben bu Shamua nwa Zakua. 5Nke diri ebo Simeon bu Shefat nwa Hori. 6Nke diri ebo Juda bu Keleb nwa Jefune. 7Nke diri ebo Isaka bu Igal nwa Josef. 8Nke diri ebo Efraim bu Hoshia nwa Nun. 9Nke diri ebo Benjamin bu Palti nwa Rafu. 10Nke diri ebo Zebulun bu Gadiel nwa Sodi. 11Nke diri ebo Josef, nke ahu bu, nke diri ebo Manase, bu Gadi nwa Susi. 12Nke diri ebo Dan bu Amiel nwa Gemali. 13Nke diri ebo Asha bu Setua nwa Maikael. 14Nke diri ebo Naftali bu Nahbi nwa Vọfsi. 15Nke diri ebo Gad bu Geuel nwa Maki. 16Ndia bu aha ndikom ahu nke Moses zigara iledo ala ahu. Moses we kpọ Hoshia nwa Nun Joshua. 17Moses we ziga ha iledo ala Kenean, ọ si ha, Rigonu n'uzọ a nime Negeb, rigo-kwa-nu n'ugwu: 18we hu ala ahu, ihe ọ bu; na ndi ahu ndi bi na ya, ma ọ bu ndi di ike ka ha bu, ma-ọbu ndi nādighi ike, ma ọ bu madu ole-na-ole ka ha di, ma-ọbu ọtutu madu; 19na ihe ala ahu bu nke ndi ahu nēbi nime ya, ma ọ bu ezi ala ka ọ bu ma-ọbu ala ọjọ; na ihe obodo nile bu nke ndi ahu nēbi nime ha, ma ọ bu na ha bi n'ọmuma-ulo-ikwū, ma-ọbu n'ebe ewusiri ike; 20na ihe ala ahu bu, ma ọ bu ala nwere ume ka ọ bu ma-ọbu ala nātà ihe, ma osisi di nime ya, ma-ọbu na ọ dighi. Me kwa onwe-unu ka unu di ike, weta kwa ufọdu nime nkpuru ala ahu. Ma mb͕e ahu bu mb͕e nke nkpuru mbu nke nkpuru-vine. 21Ha we rigo, ledo ala ahu site n'ọzara Zin rue Rehob, na nbata Hemat. 22Ha we rigo nime Negeb, biarue Hebron; ma n'ebe ahu ka Ahiman na Sheshai na Talmai, bú umu Anak, nọ (Ma ewuru Hebron arọ asa tutu ewue Zoan n'Ijipt.) 23Ha we biarue ndagwurugwu Eshkol, si n'ebe ahu b͕utu otù alaka na otù uyọkọ nkpuru-vine; ha we būru ya n'osisi eji ebu ihe n'etiti madu abua; ha weta-kwa-ra ufọdu nime nkpuru pomegranate na ufọdu nime nkpuru fig. 24Akpọrọ ebe ahu ndagwurugwu Eshkol, n'ihi uyọkọ nke umu Israel si n'ebe ahu b͕utu. 25Ha we si n'iledo ala ahu lata n'ọgwugwu ọgu ubọchi abua. 26Ha we je biakute Moses, biakute kwa Eron, biakute kwa nzukọ nile nke umu Israel, rue ọzara Peran, rue Kedesh; we weghachiri ha na nzukọ Israel nile okwu, me kwa ka ha hu nkpuru ala ahu. 27Ha we kọrọ ya akukọ, si Ayi bara n'ala ahu ebe i zigara ayi, ọzọ kwa, ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya ka ọ bu; nka bu kwa nkpuru-ya. 28Otú ọ di, ndi bi n'ala ahu di ike, ewusi-kwa-ra obodo nile ha ike, ha di kwa uku ri nne: ọzọ kwa, umu Anak ka ayi huru n'ebe ahu. 29Amalek bi n'ala Negeb; ndi Het na ndi Jebus na ndi-Amorait bi n'ugwu: ndi Kenean bi n'usọ oké osimiri, na n'akuku Jọdan. 30Keleb we me ka ndi Israel b͕a nkiti n'ebe Moses nọ, ọ si, Ka ayi rigo nọ, nweta ya; n'ihi na ayi puru ime ya nke-ọma. 31Ma ndikom ahu ndi soro ya rigo siri, Ayi apughi irigo imegide ndi ahu, n'ihi na ndi di ike ka ha bu kari ayi. 32Ha we me ka akukọ ọjọ putara umu Israel bayere ala ahu nke ha ledoro, si, Ala ahu, nke ayi gabigaworo nime ya iledo ya, ala nke nēripia ndi bi ya ka ọ bu; ọzọ ndi nile ayi huru n'etiti ya bú ndikom toro ogologo. 33N'ebe ahu ka ayi hu-kwa-ra ndi-Nefilim, bú umu Anak, ndi sitere na ndi-Nefilim: ayi we di n'anya onwe-ayi dika ogugu, ọ bu kwa otú a ka ayi di n'anya-ha.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌNU-ỌGUGU 13: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye