Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌNU-ỌGUGU 12

12
1Miriam na Eron we kwue okwu megide Moses n'ihi nwayi Etiopia ahu ọ lutara: n'ihi na nwayi Etiopia ka ọ lutara. 2Ha we si, Ọ̀ bu ezie na nání Moses ka Jehova wereworo kwue okwu? Ọ̀ bughi kwa ayi ka o wereworo kwue okwu? Jehova we nu ya. 3Ma nwoke ahu, bú Moses, di ume-ala n'obi nke-uku, kari madu nile ndi nọ n'elu ala. 4Jehova we si Moses na Eron na Miriam na mberede, Putanu, unu atọ, rue ulo-ikwū nzute. Ha atọ we puta. 5Jehova we ridata n'ogidi igwe-oji, guzo n'ọnu-uzọ Ulo-ikwū, kpọ Eron na Miriam: ha abua we puta. 6Ọ we si Biko, nurunu okwum nile: ọ buru na onye-amuma di n'etiti unù, n'ọhu ka Mu, bú Jehova, gēme ka ọ maram, na nrọ ka M'gāgwa ya okwu. 7Ọ bughi otú a ka orùm Moses di; n'ulom nile onye kwesiri ntukwasi-obi ka ọ bu 8ọnu na ọnu ka M'gāgwa ya okwu ọbuná n'ile-anya, ọ bughi kwa n'ilu di iche iche; udi Jehova ka ọ gēlegide kwa anya: ọ̀ bu kwa gini mere unu nātughi egwu ikwu okwu megide orùm, bú imegide Moses? 9Iwe Jehova we di ọku megide ha; Ọ we la. 10Igwe-oji ahu we si n'elu Ulo-ikwū ahu wezuga onwe-ya; ma, le, Miriam bu onye ekpenta, dika snow; Eron we che Miriam iru, ma, le, ọ bu onye-ekpenta. 11Eron we si Moses, Biko, onye-nwem, ariọm i, atukwasila ayi nmehie, nke ayi buru ndi-nzuzu nime ya, nke ayi mehiewo-kwa-ra nime ya. 12Biko, ka ọ ghara idi ka onye nwuru anwu, nke nkera anu-aru-ya richapuworo mb͕e o si n'àkpà-nwa nne-ya puta. 13Moses we tikue Jehova, si, Chineke, biko, me ka aru-ya di ike, biko. 14Jehova we si Moses, Ọ buru na nna-ya ab͕asa ya asọ n'iru ma-ọli, ìhere agaghi-eme ya ubọchi asa? ka emechibido ya uzọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa, emesia agāchikọta kwa ya na ndi Israel. 15Ewe mechibido Miriam uzọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa: ma ndi Israel ebulighi ije rue mb͕e achikọtara Miriam na ndi Israel. 16Ma emesia ndi Israel siri na Hazerot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Peran.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌNU-ỌGUGU 12: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye