Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 37

37
1Bezalel me-kwa-ra ib͕e osisi acacia: cubit abua na nkera ka ogologo-ya di, otù cubit na nkera ka obosara-ya di kwa, otù cubit na nkera ka elu-ya di kwa: 2ọ machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, nime na azu ka ọ machitara ya, o we mere ya mpempe ọla-edo buruburu 3O we wuara ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, n'ukwu anọ ya; bú nb͕a-aka abua n'otù akuku-ya, na nb͕a-aka abua n'akuku-ya ọzọ. 4O me-kwa-ra nkpa-n'aka osisi acacia, machita ha ọla-edo. 5O we me ka nkpa-n'aka ahu ba na nb͕a-aka ahu n'elu akuku ib͕e ahu, iji ebu ib͕e ahu. 6O me-kwa-ra ebe-nkpuchi-nmehie nke ọla-edo anāgwaghi agwa: cubit abua na nkera ka ogologo-ya di, otù cubit na nkera ka obosara-ya di. 7O me-kwa-ra cherubim ọla-edo abua; ihe akpuru akpu ka o mere ha, na nsọtu abua nke ebe-nkpuchi-nmehie; 8otù cherub n'otù nsọtu, na otù cherub na nsọtu nke-ọzọ: site n'ebe-nkpuchi-nmehie ka o mere cherubim ahu, na nsọtu-ya abua. 9Cherubim ahu nāb͕asa kwa nkù-ha n'elu, nēkpuchi ebe-nkpuchi-nmehie na nkù-ha, iru-ha nēcherita kwa onwe-ha; n'ebe ebe-nkpuchi-nmehie di ka iru cherubim ahu di.
10O me-kwa-ra table osisi acacia ahu: cubit abua ka ogologo-ya di, otù cubit ka obosara-ya di, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya di: 11ọ machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, me-kwa-ra ya mpempe ọla-edo buruburu. 12O me-kwa-ra ya ihe-njìkọ buruburu nke ra ka otù ọbu-aka, mere ihe-njikọ-ya mpempe ọla-edo buruburu. 13Ọ wuara ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, tukwasi nb͕a-aka ahu na nkuku anọ nke di n'ukwu anọ ya. 14Na nso ihe-njikọ ahu ka nb͕a-aka di, ka ha buru ọnọdu itiye nkpa-n'aka eji ebu table ahu. 15O ji kwa osisi acacia me nkpa-n'aka ahu, ọ machita ha ọla-edo, iji ebu table ahu. 16O me-kwa-ra ihe nile nke di n'elu table, bú afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na ọkwa-ya nile, na iko-ya nile, nke eji awusi àjà-ihe-ọṅuṅu: ọla-edo anāgwaghi agwa ka ha bu.
17O me-kwa-ra ihe-idọba-oriọna ahu nke ọla-edo anāgwaghi agwa: ihe akpuru akpu ka o mere ihe-idọba-oriọna ahu, bú ukwu-ala-ya na alaka-ya; iko-ya nile, bú isi-ya nile, na okoko-ya nile, sitere na ya: 18alaka isi nēsi n'akuku-ya abua waputa; alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu n'otù akuku-ya, alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu kwa n'akuku-ya nke-ọzọ: 19iko atọ emere dika ifuru osisi almond di n'otù alaka, otù isi na otù okoko; iko atọ emere dika ifuru osisi almond di kwa n'alaka-ibe-ya, otù isi na otù okoko: otú a ka ọ diri alaka isi ahu nke nēsi n'ihe-idọba-oriọna ahu waputa. 20iko anọ emere dika ifuru osisi almond di kwa n'ihe-idọba-oriọna ahu, isi-ha na okoko-ha: 21otù isi di kwa n'okpuru alaka abua site na ya, otù isi di kwa n'okpuru alaka abua site na ya, otù isi di kwa n'okpuru alaka abua site na ya, diri alaka isi ahu nke nēsi nime ya waputa. 22Isi-ha na alaka-ha sitere na ya; ihe-idọba-oriọna ahu nile bu otù ihe eji ọla-edo nke anāgwaghi agwa kpu. 23O me-kwa-ra oriọna-ya, ha di asa, na nkpa-ya nile, na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile, ha bu ọla-edo anāgwaghi agwa. 24Otù talent nke ọla-edo anāgwaghi agwa ka o ji me ya, ya na ihe-ya nile.
25O me-kwa-ra ebe-ichu-àjà ahu nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, osisi acacia ka ọ bu: otù cubit ka ogologo-ya di, otù cubit ka obosara-ya di kwa, ihe nwere akuku anọ ra nrata ka ọ bu; cubit abua ka idi-elu-ya di kwa; mpi-ya nile sitere na ya. 26Ọ machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, elu-ya, na akuku-ya nile buruburu, na mpi-ya nile: o we mere ya mpempe ọla-edo buruburu. 27Nb͕a-aka ọla-edo abua ka o me-kwa-ra nye ya n'okpuru mpempe-ya, n'elu ihe-akuku-ya abua, n'elu akuku-ya abua, ka ha buru ọnọdu inara nkpa-n'aka eji ebu ya. 28O ji kwa osisi acacia me nkpa-n'aka ahu, ọ machita ha ọla-edo. 29O me-kwa-ra manu otite-manu ahu di nsọ, na ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ nke anāgwaghi agwa, bú nke eji uda utọ di iche iche me, bú ọlu onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌPUPU 37: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara