Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 36

36
1Bezalel na Ọhọliab gālu kwa ọlu, ha na nwoke ọ bula nke nwere obi amam-ihe, ndi Jehova tiyeworo amam-ihe na nghọta nime ha ka ha mara ije ozi ọ bula nke òfùfè nke ebe nsọ ahu, dika ihe nile si di nke Jehova nyere n'iwu.
2Moses we kpọ Bezalel na Ọhọliab, na nwoke ọ bula nwere obi amam-ihe, onye Jehova tiyere amam-ihe n'obi-ya, onye ọ bula nke obi-ya kwaliri ya ibiaru nso ozi ahu ije ya: 3ha we si n'iru Moses were ihe àjà-nbuli ahu nile nke umu Israel wetara iji je ozi nke òfùfè nke ebe nsọ ahu, ime ya. Ma ndi Israel ahu nọ n'iwetara ya onyinye-afọ-ofufo kwa-ututu. 4Ndi-amam-ihe ahu nile, ndi nēje ozi nile nke ebe nsọ ahu, ha nile n'otù n'otù we si n'ozi-ha nke ha nēje bia, 5gwa Moses okwu, si, Ndi Israel nēweta ọtutu ihe kari nke gēzuru òfùfè nke diri ozi ahu nke Jehova nyere iwu ka eje ya. 6Moses we nye iwu, ha we me ka ekwusa ya n'ọmuma-ulo-ikwū nile, si, Nwoke ma-ọbu nwayi, ka ha ghara ije ozi ọzọ bayere àjà-nbuli nke ebe nsọ ahu. Ewe me ka ndi Israel wetabìe ihe. 7Ihe-ije-ozi ahu we zuere ha iji je ozi nile, ime ya, ihe we fọdu.
8Onye ọ bula nke nwere obi amam-ihe n'etiti ndi nēje ozi ahu we me ebe-obibi ahu: were ákwà-nkwuba iri me ya; ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, nke emere ka ha yie cherubim, bú ọlu nke onye-ọ̀kà, ihe ndia ka o ji me ha. 9Ogologo nke otù ákwà-nkwuba di orú cubit na asatọ, obosara nke otù ákwà-nkwuba di kwa cubit anọ: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba nile nwere. 10O we jikọta ákwà-nkwuba ise, otù na ibe-ya: jikọta kwa ákwà-nkwuba ise nke-ọzọ, otù na ibe-ya. 11O ji kwa ogho anunu me anya-nko n'elu ọnu-ọnu nke otù ákwà-nkwuba, site na nsọtu-ya nime njikọta ahu: otú a ka ọ me-kwa-ra n'ọnu-ọnu ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke-abua. 12Ọgu anya-nko abua na iri ka o mere n'otù ákwà-nkwuba, ọgu anya-nko abua na iri ka ọ me-kwa-ra nime nsọtu nke ákwà-nkwuba nke di na njikọta nke-abua: anya-nko cheritara onwe-ha iru, otù na ibe-ya. 13O me-kwa-ra ọgu nko ọla-edo abua na iri, were nko ahu jikọta ákwà-nkwuba, otù na ibe-ya: ebe-obibi ahu we buru otù. 14O me-kwa-ra ákwà-nkwuba aji ewu, ibu ulo-ikwū n'elu ebe-obibi ahu: ákwà-nkwuba iri na otù ka o mere ha. 15Ogologo nke otù ákwà-nkwuba di orú cubit na iri, cubit anọ ka obosara nke otù ákwà-nkwuba di kwa: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba iri na otù ahu nwere. 16O jikọta-kwa-ra ákwà-nkwuba ise iche, na ákwà-nkwuba isi iche. 17O me-kwa-ra ọgu anya-nko abua na iri n'elu ọnu-ọnu nke ákwà-nkwuba ahu dipuru adipu nime njikọta ahu, ọ me-kwa-ra ọgu anya-nko abua na iri n'elu ọnu-ọnu nke ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke-abua. 18O me-kwa-ra ọgu nko ọla abua na iri, ijikọta ulo-ikwū ahu ka ọ we buru otù. 19O were mere ulo-ikwū ahu ihe-nkpuchi akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, ya na ihe-nkpuchi akpukpọ seal n'elu ya.
20O we mere ebe-obibi ahu ibo osisi acacia, nke nēguzo ọtọ. 21Cubit iri ka ogologo nke otù ibo di, otù cubit na nkera cubit ka obosara nke otù ibo di kwa. 22Otù ibo nwere ihe-nhiọye abua, nke ekwukọtara, otù na ibe-ya: otú a ka o mere nye ibo nile nke ebe-obibi ahu. 23O we mere ebe-obibi ahu ibo ahu; orú ibo ka ọ mere nye akuku Ndida chere iru na Ndida: 24ọgu ukwu ọla-ọcha abua ka o me-kwa-ra n'okpuru orú ibo ahu; ukwu abua n'okpuru otù ibo inara ihe-nhiọye-ya abua, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ inara ihe-nhiọye-ya abua. 25O we mere akuku nke-abua nke ebe-obibi ahu orú ibo, bú akuku Ugwu, 26na ọgu ukwu ọla-ọcha ha abua; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ. 27Isi ebe-obibi ahu nke chere iru n'Ọdida-anyanwu ka o me-kwa-ra ibo isi nye. 28Ibo abua ka o me-kwa-ra nye nkuku ebe-obibi ahu n'isi-ya. 29Ha bu ihe abua ejikọtara n'otù n'okpuru, ha abua bu kwa otù ihe zuru okè rue isi-ya rue otù nb͕a-aka ahu: otú a ka o mere nye ha abua na nkuku abua ahu. 30Ha di kwa ibo asatọ, na ukwu ọla-ọcha ha, ukwu iri na isi; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ. 31O me-kwa-ra nkpọrọ osisi acacia; ise ka o mere nye ibo otù akuku nke ebe-obibi ahu, 32nkpọrọ ise ka o me-kwa-ra nye ibo akuku nke-ọzọ nke ebe-obibi ahu, nkpọrọ ise ka o me-kwa-ra nye ibo nke ebe-obibi ahu, bú isi-ya chere iru n'Ọdida-anyanwu. 33O we me ka nkpọrọ etiti gabiga n'etiti ibo ahu, si n'otù nsọtu rue nsọtu ọzọ. 34Ọ machita-kwa-ra ibo nile ọla-edo, were kwa ọla-edo me nb͕a-aka-ha, ka ha buru ọnọdu itiye nkpọrọ ahu, ọ machita-kwa-ra nkpọrọ ahu ọla-edo.
35O we me ákwà-nb͕ochi ahu nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: ọ bu ọlu onye-ọ̀kà, o mere ya ka o yie cherubim. 36O we mere ya ide acacia anọ, machita ha ọla-edo: nkpọye-ha bu ọla-edo; o we wuara ha ukwu ọla-edo anọ. 37O we mere ọnu-uzọ Ulo-ikwū ahu ákwà-nkwuchi, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ọ bu ọlu onye-ọdudu-ákwà; 38o me-kwa-ra ide ise ya na nkpọye-ha, machita isi-ha na ngegide-ha ọla-edo: ma ukwu ise ha bu ọla.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌPUPU 36: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara