Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 38

38
1O me-kwa-ra ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku ahu, ọ bu osisi acacia: cubit ise ka ogologo-ya di, cubit ise ka obosara-ya di kwa, o nwere akuku anọ ra nrata; cubit atọ ka idi-elu-ya di kwa. 2O me-kwa-ra mpi-ya n'elu nkuku anọ ya; mpi-ya sitere na ya: ọ machita ya ọla. 3O me-kwa-ra ihe nile nke ebe-ichu-aja ahu, bú ite-ya nile, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya nile, na ndudu-ya nile, na ihe-igu-ọku-ya nile: ihe-ya nile ka o ji ọla me. 4O we mere ebe-ichu-àjà ahu ihe-ọkpukpa, ihe eji ub͕u ọla me, n'okpuru ebe dipuru adipu buruburu ya n'okpuru, rue na nkera-ya. 5O we wuara nsọtu anọ nke ihe-ọkpukpa ọla ahu nb͕a-aka anọ, ibu ọnọdu inara nkpa-n'aka-ya abua. 6O me-kwa-ra nkpa-n'aka osisi acacia, machita ha ọla. 7O me ka nkpa-n'aka ahu ba na nb͕a-aka ahu n'elu akuku abua nke ebe-ichu-àjà ahu, ka ewe were ha nēbu ya; o were ibo me ya ka ọ di ka ib͕e.
8O me-kwa-ra ite ọsisa-miri, ọ bu ọla, ukwu-ala-ya bu kwa ọla: ọ bu enyo nke ndinyom nēzukọ n'usu n'usu, ndi nēzukọ n'usu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ka o ji me ya.
9O me-kwa-ra ogige ahu: akuku Ndida nke chere iru na Ndida nwere ákwà-ngechi ogige ahu nke ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ọgu cubit ise n'ogologo: 10ide-ha di orú, ukwu-ha di kwa orú, ha bu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha bu ọla-ọcha. 11Akuku Ugwu nwe-kwa-ra ọgu cubit ise, ide-ha di orú, ukwu-ha di kwa orú, ha bu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha bu ọla-ọcha. 12Akuku Ọdida-anyanwu nwe-kwa-ra ákwà-ngechi nke ọgu cubit abua na iri, ide-ha di iri, ukwu-ha di kwa iri; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha bu ọla-ọcha. 13Akuku Iru-anyanwu chere iru n'ọwuwa-anyanwu, nwekwara ọgu cubit abua na iri. 14Ákwà-ngechi cubit iri na ise ka otù akuku ọnu-uzọ-ama-ya nwere; ide-ha di atọ, ukwu-ha di kwa atọ; 15akuku nke-ọzọ nke ọnu-uzọ-ama-ya nwekwara: n'aka-nri na n'aka-ekpe nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu ka ákwà-ngechi cubit iri na ise di; ide-ha di atọ, ukwu-ha di kwa atọ. 16Ákwà-ngechi nile nke ogige ahu buruburu bu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma. 17Ukwu nile nke ide ahu nwere bu ọla; nkpọye nile nke ide na ngegide nile ha bu ọla-ọcha; ihe amachitara isi-ha bu kwa ọla-ọcha; ihe ahu bu kwa ihe egegidere ngegide ọla-ọcha, bú ide nile nke ogige ahu. 18Ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu bu ọlu onye-ọdudu-ákwà, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: orú cubit ka ogologo-ya di, idi-elu-ya nime obosara-ya di cubit ise, dika ákwà-ngechi nke ogige ahu. 19Ide-ha di anọ, ukwu-ha di kwa anọ, ha bu ọla; nkpọye nile ha bu ọla-ọcha, ihe-nmachita nke isi-ha na ngegide nile ha bu kwa ọla-ọcha. 20Ma ǹtú nile ebe-obibi ahu nwere, na nke ogige ahu buruburu nwere, bu ọla.
21Ndia bu ngukọta ihe ebe-obibi ahu, bú ebe-obibi nke ihe-àmà ahu, dika agukọtara ha, n'okwu-ọnu Moses, ọ bu òfùfè nke ndi Livai, site n'aka Itama, bú nwa Eron onye-nchu-àjà. 22Ma Bezalel nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda, mere ihe nile Jehova nyere Moses n'iwu. 23Ma onye soro ya n'ọlu ahu bu Ọhọliab, nwa Ahisamak, nke ebo Dan, bú onye nātu akika, na onye-ọ̀kà, na onye-ọdudu-ákwà n'ogho anunu, na n'ogho ododo, na n'ogho uhie, na n'ezi ákwà ọcha.
24Ọla-edo nile nke ejiri je ozi ahu n'ije-ozi nile nke ebe nsọ ahu, bú ọla-edo nke àjà-ofufé ahu, di orú talent na iteghete, na nnù shekel na ọgu iri na ọgu isi na iri, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di. 25Ọla-ọcha nke ndi agukọtara agukọta n'etiti nzukọ Israel di ọgu talent ise, na nnù shekel anọ na ọgu asatọ na iri na ise, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: 26otù beka otù isi, ya bu nkera shekel, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, enyere n'isi onye ọ bula nke nāgabiga n'ebe ndi agukọtara agukọta nọ, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, n'isi orú nnù ọgu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù asatọ, na ọgu iri-na-asa, na iri. 27Ọgu talent ọla-ọcha ise ahu we buru iwu ukwu nile nke ibo nke ebe nsọ ahu, na ukwu nile nke ide nke ákwà-nb͕ochi ahu; ọgu ukwu ise ka ọgu talent ise ahu nwere, otù talent diri otù ukwu. 28Nnù shekel anọ na ọgu asatọ na iri na ise ahu ka o ji kwa mere ide ahu nile nkpọye, machita kwa isi-ha, mekwara ha ihe-ngegide. 29Ọla nke àjà-ofufé ahu di kwa ọgu talent atọ na iri, na nnù shekel isi. 30O ji ya me ukwu nile nke ide ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, na ebe-ichu-àjà ọla, na ihe-ọkpukpa ọla nke diri ya, na ihe nile nke ebe-ichu-aja ahu, 31na ukwu nile nke ide ogige ahu buruburu, na ukwu nile nke ide ọnu-uzọ-ama ogige ahu, na ǹtú nile nke ebe-obibi ahu, na ǹtú nile nke ogige ahu buruburu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌPUPU 38: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara