Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 16

16
1Ha si n'Ilim bulie ije, nzukọ nile nke umu Israel we ba n'ọzara Sin, nke di n'etiti Ilim na Sainai, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-abua site n'ọpupu-ha n'ala Ijipt. 2Nzukọ nile nke umu Israel we tamu ntamu megide Moses, megide kwa Eron, n'ọzara ahu: 3umu Israel we si ha, Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi nwururi n'aka Jehova n'ala Ijipt, mb͕e ayi nọduru n'akuku ite anu, mb͕e ayi rijuru nri afọ; n'ihi na unu emewo ka ayi puta ba n'ọzara nka, iwere agu me ka nkpọkọta nka nile nwua. 4Jehova we si Moses, Le, M'gaje ime ka nri si n'elu-igwe zoro unu dika miri; ndim gāpu, chikọta ihe nke otù ubọchi n'ubọchi-ya, ka M'we nwa ha, ma ha gēje ije n'iwum, ma-ọbu na ha agaghi-eje. 5O gēru kwa, n'ubọchi nke-isi, na ha gēdozi ihe nke ha nāchibata, ọ gēme kwa okpukpu abua nke ha nāchikọta kwa-ubọchi. 6Moses na Eron we si umu Israel nile, n'anyasi ka unu gāmara na Jehova emewo ka unu si n'ala Ijipt puta: 7n'ututu ka unu gāhu kwa ebube nke Jehova; ebe Ọ nānu ntamu nile unu nātamu megide Jehova: ma àyi onwe-ayi bu gini, na unu nātamu ntamu megide ayi? 8Moses we si, Nka gābu mb͕e Jehova gēnye unu anu n'anyasi ka unu rie, mb͕e Ọ gēnye kwa unu nri n'ututu ka unu riju afọ; ebe Jehova nānu ntamu unu onwe-unu nātamu megide Ya: ma àyi onwe-ayi bu gini? ha abughi imegide ayi, bú ntamu unu nātamu, kama imegide Jehova. 9Moses we si Eron, Si nzukọ nile nke umu Israel, Biarunu nso n'iru Jehova: n'ihi na Ọ nuwo ntamu nile unu. 10O rue, mb͕e Eron nāgwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, na ha chere ọzara iru, ma, le, ahuru ebube Jehova n'igwe-oji ahu. 11Jehova we gwa Moses okwu, si, 12Anuwom ntamu nile nke umu Israel: gwa ha okwu, si, N'etiti ehihie na anyasi ka unu gēri anu, n'ututu ka unu gēriju kwa afọ na nri; unu gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 13O rue, n'anyasi, na nnunu quail rigotara, kpuchie ebe ọmuma-ulo-ikwū-ha: n'ututu igirigi we dikwasi n'ala buru-buru ọmuma-ulo-ikwū. 14Mb͕e igirigi nke dikwasi n'ala rigoro, le, n'elu ọzara imurimu ihe nke ekpere ekpè, imurimu ihe dika hoar frost nke di n'elu ala. 15Umu Israel we hu ya, sirita onwe-ha, Gini ka ọ bu? n'ihi na ha amaghi ihe ọ bu. Moses si ha, Nke ahu bu nri nke Jehova nyeworo unu ka unu rie. 16Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu, Chikọtanu ufọdu nime ya, onye ọ bula dika oriri-ya si di; otù ọtùtù omer otù isi, dika ọnu-ọgugu madu-unu si di, ka unu gēwere ya, onye ọ bula o were ndi nọ n'ulo-ikwū-ya. 17Umu Israel we me otú a, chikọta, otù onye nāchikọta ri nne, nke-ọzọ nāchikọta nke ntà. 18Ha we were omer tùa ya, onye chikọtara ri nne enweghi kari nke gēzuru ya, onye chikọta-kwa-ra nke ntà, ọ dighi ihe fọduru ya inwe; onye ọ bula dika oriri-ya si di, otú a ka ha chikọtara. 19Moses we si ha, Ka onye ọ bula ghara ime ka ufọdu nime ya fọdu rue ututu. 20Ma ha egeghi Moses nti; madu ufọdu nime ha we me ka ufọdu nime ya fọdu rue ututu, o we b͕a ikpuru, nēsì ísì: Moses we we iwe n'aru ha. 21Ha we nāchikọta ya kwa-ututu, onye ọ bula dika oriri-ya si di: ma mb͕e anyanwu di ọku ọ b͕aze. 22O rue, n'ubọchi nke-isi, na ha chikọtara nri okpukpu abua, ha nwere omer abua n'otù n'otù: ndi-isi nile nke nzukọ we bia, gosi Moses. 23Ọ si ha, Nke ahu bu ihe Jehova kwuworo, si, Idebe-ubọchi-izu-ike, bú ubọchi-izu-ike di nsọ nye Jehova, ka echi bu: ihe unu nēghe, ghenu ya, ihe unu nēsi kwa, sienu ya; ma ihe nile nke fọduru, dọbaranu onwe-unu ya, ka ọ buru ihe-ndebe rue ututu. 24Ha we dọba ya rue ututu, dika Moses nyere iwu: ma o sìghi ísì, ikpuru adighi kwa nime ya. 25Moses we si, Rienu ya ta; n'ihi na ubọchi-izu-ike diri Jehova ka ta bu: ta unu agaghi-achọta ya n'ọhia. 26Ubọchi isi ka unu gāchikọta ya; ma n'ubọchi nke-asa ka ubọchi-izu-ike di, ọ dighi nke gādi nime ya. 27O rue, n'ubọchi nke-asa, na ufọdu nime ndi Israel puru apu ichikọta, ma ha achọtaghi. 28Jehova we si Moses, Rùe ole mb͕e ka unu nāju idebe ihe nile M'nyere n'iwu na iwum nile? 29Lenu, n'ihi na Jehova enyewo unu ubọchi-izu-ike, n'ihi nka Ya onwe-ya nēnye unu nri nke ubọchi abua n'ubọchi nke-isi; nọdunu, onye ọ bula n'ebe ọ nọ, ka onye ọ bula ghara isi n'ọnọdu-ya pua n'ubọchi nke-asa. 30Ndi Israel we kwusi ilu ọlu n'ubọchi nke-asa. 31Ulo Israel we kpọ aha-ya Manna: ihe ahu di ka nkpuru coriander, ọ di ọcha; idetu ya ire ọ di ka achicha wafer eji manu-aṅu me. 32Moses we si, Nka bu ihe Jehova nyeworo n'iwu, si, Ka nju omer nime ya buru ihe-ndebe anēdebere ọb͕ọ nile unu; ka ha we hu nri M'mere ka unu rie n'ọzara, mb͕e M'mere ka unu si n'ala Ijipt puta. 33Moses we si Eron, Were otù ite, tiye nju omer nke manna nime ya, dọba ya n'iru Jehova ka ọ buru ihe-ndebe anēdebere ọb͕ọ nile unu. 34Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka Eron dọbara ya n'iru Ihe-àmà, ka ọ buru ihe-ndebe. 35Umu Israel we rie manna ahu ọgu arọ abua, rue mb͕e ha batara n'ala ebí ebí; manna ahu ka ha riri, rue mb͕e ha batara na nsọtu ala Kenean. 36Ma omer, otù uzọ n'uzọ iri nke ọtùtù ephah ka ọ bu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌPUPU 16: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye