Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 15

15
1Mb͕e ahu Moses na umu Israel nābukuru Jehova abù a, ha kwue, si,
Ka m'bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku:
Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri.
2Ikem na abù ọmam ka Ja bu,
Ọ we ghọrọm nzọputa:
Onye a bu Chinekem, m'gēme kwa Ya ka Ọ di elu;
Chineke nke nnam, m'gēweli kwa Ya elu.
3Jehova bu onye-agha:
Jehova bu aha-Ya.
4Ub͕ọ-ala Fero nile na usu-ndi-agha-ya ka O tufuworo n'oké osimiri:
Ndi-isi-agha-ya arọputara arọputa, ha emikpuwo emikpu n'Oké Osimiri Uhie.
5Ob͕u-miri nēkpuchi ha:
Ha aridawo na miri di omìmì dika nkume.
6Jehova, aka-nri-Gi, nke di ebube n'ike,
Jehova, aka-nri-Gi nētipia onye-iro.
7N'idi-ọtutu nke nbili-elu-Gi ka I nākwada ndi nēbili megide Gi:
I nēzipu iwe-Gi di ọku, o richapu ha dika ahihia-ọka.
8Ewere iku-ume nke oghere-imi-Gi me ka miri tua obo,
Nrurù-miri guzoro onwe-ha ọtọ dika obo;
Ob͕u-miri raruru aruru n'obi oké osimiri.
9Onye-iro siri,
M'gāchu, m'gēru ha aru, m'gēkesa ihe m'kwatara:
Nkpuru-obim gējuputa na ha,
M'gāmipu mma-agham, akam gā-napu ha ihe nile.
10I were ifufe-Gi fe, oké osimiri kpuchiri ha:
Ha mikpuru dika opù nime miri di ebube.
11Ònye di ka Gi n'etiti chi nile, Jehova?
Ònye di ka Gi, di ebube n'idi-nsọ?
Onye anātu egwu n'otuto nile, nēme ihe-ebube di iche iche.
12I setiri aka-nri-Gi,
Ala elo ha.
13N'ebere-Gi ka I duworo ndi nke I b͕aputaworo:
N'ike-Gi ka I duworo ha nwayọ rue ebe-obibi-Gi di nsọ.
14Ndi ọzọ anuwo, ha ama jijiji:
Ihe-nb͕u eb͕uwo ndi bi na Filistia.
15Mb͕e ahu ka obi lọrọ ndi-isi Edom miri:
Ebulu nke Moab, ọma-jijiji nējide ha:
Ndi nile bi na Kenean ab͕azewo.
16Oké ujọ na oké egwù nādakwasi ha;
N'idi-uku nke ogwe-aka-Gi ha nọ jū dika nkume;
Rue mb͕e ndi-Gi gāgabiga, Jehova,
Rue mb͕e ndi nke I nwetara gāgabiga.
17I gēme ka ha bata, I gāku kwa ha n'ugwu nke ihe-nketa-Gi,
Bú ọnọdu guzosiri ike I meworo, ka ọ we buru ebe I gēbi, Jehova,
Ebe di nsọ, Onye-nwe-ayi, nke aka-Gi abua meworo ka o guzosi ike.
18Jehova gābu eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.
19N'ihi na inyinya nile nke Fero, ha na ub͕ọ-ala-ya nile na ndi-inyinya-ya, bara nime oké osimiri, Jehova we me ka miri nke oké osimiri lata n'aru ha; ma umu Israel jere ije n'elu ala-akọrọ n'etiti oké osimiri. 20Miriam, bú nwayi-amuma, bú nwa-nne-nwayi Eron, we were egwú-otiti n'aka-ya; ndinyom nile we chiri egwú-otiti na ite-egwú soro ya pua. 21Miriam we za ha, si,
Unu bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku;
Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri.
22Moses we me ka Israel si n'Oké Osimiri Uhie bulie ije, ha we pua ba n'ọzara Shua; ha we je ije ubọchi atọ n'ọzara ahu, ma ha achọtaghi miri. 23Ha we biarue Mara, ma ha apughi iṅu miri nke Mara, n'ihi na ilu ka ha di: n'ihi nka akpọrọ aha-ya Mara. 24Ndi Israel we tamu ntamu megide Moses, si, Gini ka ayi gāṅu? 25Ọ we tikue Jehova; Jehova we me ka ọ hu otù osisi, ọ tubà ya na miri ahu, miri ahu we di utọ. N'ebe ahu ka O doro ukpuru na ikpé nye ha, ọ bu kwa n'ebe ahu ka Ọ nwara ha; 26si, Ọ buru na i ge nti nke-ọma n'olu Jehova, bú Chineke-gi, ọ buru kwa na i me ihe nke ziri ezi n'anya-Ya, ọ buru kwa na i ṅa nti n'ihe Ọ nyere n'iwu, ọ buru kwa na i debe ukpuru-Ya nile, ọ dighi ọria ọ bula nke M'tiyere n'aru ndi Ijipt M'gētiye n'aru gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka aru di gi nma.
27Ha biarue Ilim, ebe isi-iyi iri na abua na ọgu nkwu atọ na iri di: ha we ma ulo-ikwū-ha n'ebe ahu n'akuku miri.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌPUPU 15: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye