Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 17

17
1Nzukọ nile nke umu Israel we si n'ọzara Sin bulie ije, na nbuli-ije nile ha, n'okwu-ọnu Jehova, ha we ma ulo-ikwū-ha na Refidim: ma ọ dighi miri ndi Israel gāṅu. 2Ndi Israel we so Moses se okwu, si, Nyenu ayi miri ka ayi ṅua. Moses we si ha, Gini mere unu som nēse okwu? gini mere unu nānwa Jehova? 3Akpiri miri we kpọ ndi Israel nku n'ebe ahu; ndi ahu we tamu ntamu megide Moses, si, ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i meworo ka ayi si n'Ijipt rigota, iwere akpiri-ikpọ-nku me ka ayi na umu-ayi na anu-ulo-ayi, nwua? 4Moses we tikue Jehova, si, Gini ka m'gēme ndi nka? ọ fọduru ihe ntà ka ha tub͕uem na nkume. 5Jehova we si Moses, Gabiga n'iru ndim, chiri kwa ufọdu nime ndi-okenye Israel ka ha so gi je; nkpa-n'aka-gi kwa, nke i ji ti osimiri Nail, were ya n'aka-gi, je. 6Le, M'gaje iguzo n'iru gi n'ebe ahu n'elu oké nkume nime Horeb, i gēti oké nkume ahu ihe, miri gēsi kwa nime ya puta, ka ndim we ṅua. Moses we me otú a n'anya ndi-okenye Israel. 7O we kpọ aha ebe ahu Masa, na Meriba, n'ihi ise-okwu nke umu Israel, na n'ihi na ha nwara Jehova, si, Jehova, Ọ̀ nọ n'etiti ayi, ma-ọbu na Ọ nọghi?
8Amalek we bia, buso Israel agha nime Refidim. 9Moses we si Joshua, Rọputara ayi ndikom, pua, buso Amalek agha; echi mu onwem ganēguzo onwem n'elu ugwu ntà nka, nējide nkpa-n'aka Chineke n'akam. 10Joshua we me dika Moses siri ya, ibuso Amalek agha: ma Moses na Eron na Hua rigoro n'elu ugwu ntà ahu. 11O rue, mb͕e Moses weliri aka-ya elu, na Israel kariri ike: ma mb͕e o mere ka aka-ya zuru ike, Amalek kariri ike. 12Ma aka Moses abua di arọ́; ha we were nkume, tiye ya n'okpuru ya, ọ nọkwasi ya; Eron na Hua we jide aka-ya abua elu, otù onye n'otù akuku, ibe-ya n'akuku ọzọ; aka-ya abua we nēguzosi ike rue ọdida-anyanwu. 13Joshua we me ka ike gwu Amalek n'ọnu mma-agha. 14Jehova we si Moses, De nka n'akwukwọ, ka ọ buru ihe-ncheta, me kwa ka ọ ba na nti Joshua: n'ihi na M'gēhichapusi ncheta Amalek n'okpuru elu-igwe. 15Moses we wue ebe-ichu-àjà, kpọ aha-ya Jehova-nisi: 16ọ si, Aka dikwasi oche-eze Ja, agha ka Jehova gēbuso Amalek site n'ọb͕ọ rue ọb͕ọ.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌPUPU 17: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye