Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. SAMUEL 8

8
1O rue, mb͕e nka gasiri, na Devid tib͕uru ndi Filistia, me kwa ka ha ruru ala: Devid we nara n'aka ndi Filistia bridle nke isi obodo-ha. 2O tib͕u-kwa-ra Moab, were udọ̀-ọtùtù tùa ha, me ha ka ha dina ala; o we tùa udọ̀-ọtùtù abua ime ka ha nwua, na udọ̀ ọtùtù zuru ezu ime ka ha di ndu. Moab we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma. 3Devid tib͕u-kwa-ra Hedadeza nwa Rehob, bú eze Zoba, mb͕e ọ nēje iweghachi ike-ya n'akuku Osimiri. 4Devid we napu n'aka-ya nnù ndi-inyinya anọ na ọgu ise, na orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri, bú ndi ji ukwu eje: Devid bipu-kwa-ra nkwonkwo-ukwu inyinya ub͕ọ-ala nile, ma o kwere ka ọgu inyinya ub͕ọ-ala ise fọdu n'etiti ha. 5Siria Damaskọs we bia iyere Hedadeza, bú eze Zoba, aka, Devid we tib͕ue n'etiti ndi Siria orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise. 6Devid we tiye ebe-nguzo-ndi-agha nime Siria Damaskọs: Siria we ghọrọ Devid ndi-orú, nēbute onyinye-inata-iru-ọma. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere. 7Devid we chiri ọta ọla-edo nke dikwasiri ndi-orù Hedadeza, chita ha na Jerusalem. 8Eze, bú Devid, we si na Beta, si kwa na Birotai, bú obodo Hedadeza, chiri ọtutu ọla nke-uku. 9Toi, bú eze Hemat, we nu na Devid etib͕uwo usu-ndi-agha nile nke Hedadeza, 10Toi we zíe Joram nwa-ya jekuru eze, bú Devid, iju ya ajuju bayere udo-ya, na igọzi ya, n'ihi na o busoworo Hedadeza agha, we tib͕ue ya: n'ihi na nwoke nke nēbuso Toi agha nke-uku ka Hadadeza bu. Ihe ọla-ọcha na ihe ọla-edo na ihe ọla di kwa n'aka Joram inye ya: 11ihe ndia ka eze, bú Devid, do-kwa-ra nsọ nye Jehova, tiyere ọla-ọcha na ọla-edo nke o doro nsọ site na mba nile nke o budara; 12site na Siria, site kwa na Moab, site kwa n'umu Amon, site kwa na ndi Filistia, site kwa n'Amalek, site kwa n'ihe-nkwata Hedadeza, nwa Rehob, bú eze Zoba. 13Devid we mere onwe-ya aha mb͕e o siri n'itib͕u Siria nime Ndagwurugwu Nnù lata, bú orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise. 14O tiye-kwa-ra ebe-nguzo-ndi-agha n'Edom: n'Edom nile ka o tiyere ebe-nguzo-ndi-agha, Edom nile we ghọrọ Devid ndi-orù. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula ọ jere.
15Devid we buru eze Israel nile; Devid we nēmere ndi-ya nile ihe ekpere n'ikpe na ezi omume. 16Joab nwa Zeruaia bu onye-isi usu-ndi-agha; Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta: 17Zedok nwa Ahaitub, na Ahimelek nwa Abaiata, bu ndi-nchu-àjà; Seraia bu ode-akwukwọ; 18Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret na ndi Pelet; umu-ndikom Devid bu ndi-isi n'ije ozi.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. SAMUEL 8: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye