Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. SAMUEL 7

7
1O rue, mb͕e eze biri n'ulo-ya, mb͕e Jehova me-kwa-ra ka o zuru ike pua n'aka ndi-iro-ya nile buruburu, 2na eze siri Netan, bú onye-amuma, Biko, le, Mu onwem nēbi n'ulo cedar, ma ib͕e Chineke nēbi n'etiti ákwà-nkwuba. 3Netan we si eze, Ihe nile nke di n'obi-gi, je, me ya; n'ihi na Jehova nọyere gi. 4O rue, n'abali ahu, na okwu Jehova ruru Netan nti, si, 5Je, si orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova siri, Ọ̀ bu gi onwe gi gēwurum ulo ibu ebe M'gēbi? 6N'ihi na ebighm n'ulo site n'ubọchi M'mere ka umu Israel si n'Ijipt rigota, we rue ta, kama M'nējeghari n'ulo-ikwū na n'ebe-obibim. 7N'ebe nile nke M'nējeghari n'etiti umu Israel nile, ọ̀ di okwu M'gwara otù n'ebo Israel nile, nke M'nyere iwu izù ndim, bú Israel, si, N'ìhi gini ka unu newurughm ulo cedar? 8Ma ub͕u a, otú a ka i gāsi orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Mu onwem siri n'ebe-ita-nri anu-ulo, si kwa n'ebe i nēso ìgwé ewu na aturu, kuru gi, ka i buru nye-ndú ndim, bú Israel: 9M'we nọyere gi n'ebe ọ bula i jere, ebipu-kwa-ram ndi-iro-gi nile n'iru gi; M'gēme-kwa-ra gi aha uku, dika aha ndi uku ndi nọ n'uwa. 10M'gēdo-kwa-ra ndim, bú Israel, otú ebe, ku kwa ha dika osisi, ka ha we biri n'ọnọdu-ha, ghara ima jijiji ọzọ; umu ajọ omume agaghi-eweda kwa ha ọzọ, dika na mbu, 11na dika site n'ubọchi mb͕e M'nyere ndi-ikpe iwu ibu ndi-isi ndim, bú Israel; emewokwam ka i zuru ike pua n'aka ndi-iro-gi nile. Jehova egosiwo kwa gi na Jehova gēmere gi ulo. 12Mb͕e ubọchi-gi zuru, mb͕e gi gēsoro nna-gi-hà dina kwa n'ọnwu, M'gēme kwa ka o bilie, bú nkpuru-gi nke gānọchi gi, nke gēsi n'afọ-gi puta, M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike. 13Onye ahu gēwuru aham ulo, M'gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi. 14Mu onwem gāburu ya nna, ya onwe ya gābu-kwa-ram nwa: ọ buru na ọ me ajọ omume, M'gēwere nkpa-n'aka madu, were kwa ihe-otiti nke umu madu, dua ya ọdu; 15ma eberem agaghi-esi n'ebe ọ nọ wezuga onwe-ya, dika M'wēzugara ya n'ebe Sọl nọ, onye M'wezugara n'iru gi. 16Ma ulo-gi na ala-eze-gi gēkwesi ntukwasi-obi n'iru gi rue mb͕e ebighi-ebi: agēme ka oche-eze-gi buru ihe guzosiri ike rue mb͕e ebighi-ebi. 17Dika okwu ndia nile si di, na dika ọhù a nile si di, otú a ka Netan gwara Devid okwu.
18Eze, bú Devid, we ba, nọdu ala n'iru Jehova; ọ si, Ònye ka m'bu, Onye-nwe-ayi Jehova, gini kwa ka ulom bu, na I mewo ka m'biarue na mb͕e a? 19Ma nka bu nání ihe ntà n'anya-Gi, Onye-nwe-ayi Jehova; I we kwu kwa okwu bayere ulo-orú-Gi rue mb͕e di anya; nka bu kwa iwu bayere madu, Onye-nwe-ayi Jehova! 20Ma gini ka Devid gāgwa kwa Gi ọzọ? n'ihi na Gi onwe-gi mara orù-Gi, Onye-nwe-ayi Jehova. 21N'ihi okwughi, na dika obi-Gi si di, ka I meworo ihe-idi-uku a nile, ime ka orù-Gi mara ya. 22N'ihi nka I di uku, Onye-nwe-ayi Jehova: n'ihi na ọ dighi onye di ka Gi, ọ dighi kwa Chineke ma-ọbughi Gi, dika ihe nile si di nke ayi nuworo na nti-ayi. 23Ma òle mba di ka ndi-Gi, dika Israel, bú otù mba nke nēguzo iche n'uwa, nke Chineke jere ib͕aputara Onwe-ya ka ọ buru otù ndi, na imere Onwe-ya aha, na imere unu ihe-idi-uku a, na imere ala-Gi ihe di egwu, n'iru ndi-Gi, nke I siri n'Ijipt, bú mba di iche iche ọzọ na chi nile ha, baputara onwe-gi? 24I we me ndi-Gi, bú Israel, ka o guzosiere Gi ike, iburu Gi otù ndi rue mb͕e ebighi-ebi; Gi onwe-gi, Jehova, we ghọrọ ha Chineke. 25Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke, okwu ahu nke I kwuworo bayere orù-Gi, baye-kwa-ra ulo-ya, me ya ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi, Gi me kwa dika I kwuworo. 26Ka aha-Gi di kwa uku rue mb͕e ebighi-ebi, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu Chineke Israel: agēme kwa ka ulo orù-Gi, bú Devid, guzosie ike n'iru Gi. 27N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, I kpughewo nti orù-Gi, si, M'gēwu-kwa-ra gi ulo: n'ihi nka orù-Gi nwetara obi-ike ikpere Gi ekpere a. 28Ma ub͕u a, Onye-nwe-ayi Jehova, Gi onwe-gi bu Chineke onwe-ya, okwu-Gi nile bu kwa ezi-okwu, I gwawo kwa orù-Gi ezi ihe a: 29ma ub͕u a kwere igọzi ulo orù-Gi, ka o we dirue mb͕e ebighi-ebi n'iru Gi: n'ihi na Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi Jehova, ekwuwo ya: ka ewere kwa ngọzi-Gi nāgọzi ulo orù-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. SAMUEL 7: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye