II. SAMUEL 9
9
1Devid we si, Ọ̀ di onye ọ bula fọduru ọzọ nye ulo Sọl, ka m'we mere ya ebere n'ihi Jonatan? 2Ulo Sọl nwere otù orù, aha-ya bu Ziba, ha we kpọ ya biakute Devid; eze we si ya, Gì onwe-gi bu Ziba? Ọ si, Orù-gi bu ya. 3Eze we si, Ọ̀ dighi nwoke fọduru ulo Sọl ọzọ, ka m'we mere ya ebere Chineke? Ziba we si eze, Otù nwa-nwoke fọduru Jonatan, nke dara ngwurọ n'ukwu-ya abua. 4Eze we si ya, Òle ebe ọ nọ? Ziba we si eze, Le, Onye ahu nọ n'ulo Makia nwa Amiel, nime Lodeba. 5Eze, bú Devid, we ziga kuputa ya n'ulo Makia nwa Amiel, site na Lo-deba. 6Mefiboshet, nwa Jonatan, nwa Sọl, we biakute Devid, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala. Devid we si, Mefiboshet, Ọ si, Le orù-gi! 7Devid we si ya, Atula egwu; n'ihi na aghaghm imere gi ebere n'ihi Jonatan, bú nna-gi, m'gēweghachi-kwa-ra gi ubi nile nke Sọl nna-gi; gi onwe-gi gēri kwa nri na table nkem mb͕e nile. 8Ọ kpọ isi ala, si, Gini ka orù-gi bu, na i gēche iru n'ebe nkita nwuru anwu dikam nọ? 9Eze we kpọ Ziba, onye buri nwa-okorọbia Sọl, si ya, Ihe nile Sọl na ulo-ya nile nwere ka m'nyeworo nwa onye-nwe-gi. 10I gālu-kwa-ra ya ọlu ala-ubi, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na ndi-orù-gi; i gēwebata kwa nkpuru ọ miri, ka nwa onye-nwe-gi we nwe nri ọ gēri: ma Mefiboshet nwa onye-nwe-gi gēri nri na table nkem mb͕e nile. Ma Ziba nwere umu-ndikom iri na ise na orú ndi-orù. 11Ziba we si eze, Dika ihe nile si di, nke onye-nwem, bú eze, nyere orù-ya n'iwu, otú a ka orù-gi gēme. Eze we si, Ma Mefiboshet ganēri ihe na table nkem, dika otù nime umu eze. 12Mefiboshet nwe-kwa-ra otù nwatakiri-nwoke, aha-ya bu Maika. Ma ndi nile ndi bi n'ulo Ziba buru Mefiboshet ndi-orù. 13Mefiboshet we biri na Jerusalem' n'ihi na ọ bu na table eze ka ọ nēri ihe mb͕e nile; ma ya onwe-ya dara ngwurọ n'ukwu-ya abua.
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
II. SAMUEL 9: IGBOB
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.