Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 7

7
1Ndikom Kiriat-jearim we bia, bugo ib͕e Jehova, bubata ya n'ulo Abinadab n'ugwu ntà ya, do Eleeza nwa-ya nwoke nsọ idebe ib͕e Jehova. 2O rue, site n'ubọchi ib͕e ahu nọduru na Kiriat-jearim, na ubọchi bara uba; o we di orú arọ: ulo Israel nile we kwaso Jehova. 3Samuel we gwa ulo Israel nile okwu, si, Ọ buru na obi-unu nile ka unu onwe-unu nēwere laghachikute Jehova, wezuganu chi nile nke ndi ala ọzọ na Ashtarot n'etiti unu, dozie obi-unu ibiakute Jehova, fè-kwa-nu nání Ya òfùfè: Ọ gānaputa kwa unu n'aka ndi Filistia. 4Umu Israel we wezuga Bealim na Ashtarot, fè nání Jehova òfùfè.
5Samuel we si, Chikọtanu Israel nile rue Mizpa, m'gēkpe-kwa-ra Jehova ekpere bayere unu. 6Ha we chikọta onwe-ha rue Mizpa, sere miri, wusi ya n'iru Jehova, bue ọnu n'ubọchi ahu, kwue n'ebe ahu, si, Ayi emehiewo megide Jehova. Samuel we kpe umu Israel ikpe na Mizpa. 7Ndi Filistia we nu na umu Israel chikọtara onwe-ha na Mizpa, ndi-isi ndi Filistia we rigo imegide Israel. Umu Israel we nu ya, tua egwu ndi Filistia. 8Umu Israel we si Samuel, Ab͕ala nkiti bayere ayi n'itiku Jehova, bú Chineke-ayi, nkpu, ka O we zọputa ayi n'aka ndi Filistia. 9Samuel we were otù nwa-aturu nke nāṅu ara, o we sure ya ọku ka ọ buru àjà-nsuresi-ọku anēsurere Jehova: Samuel we tikue Jehova nkpu bayere Israel; Jehova we za ya. 10O rue, mb͕e Samuel nēsure àjà-nsure-ọku ahu, na ndi Filistia biaruru nso ibuso Israel agha: Jehova we were oké olu makwasi ndi Filistia éb͕è-elu-igwe n'ubọchi ahu, we me ka ha b͕a aghara; ewe tib͕ue ha n'iru Israel. 11Ndikom Israel we si na Mizpa puta, chua ndi Filistia, tib͕ue ha rue okpuru Bet-ka. 12Samuel we were otù nkume do ya n'etiti Mizpa na Shen, kpọ aha-ya Eben-eza, si, Jehova eyerewo ayi aka rue ub͕u a. 13Ewe me ka ndi Filistia ruru ala, ha abàghi ọzọ n'ókè-ala Israel: aka Jehova we digide ndi Filistia ubọchi nile nke Samuel. 14Ewe nyeghachi Israel obodo nile nke ndi Filistia nara Israel, site n'Ekron we rue Gat; ókè-ala-ha ka Israel naputara n'aka ndi Filistia. Ma udo di n'etiti Israel na ndi-Amorait. 15Samuel we kpe Israel ikpe ubọchi nile nke ndu-ya. 16O we nēje buruburu kwa-arọ rue Bet-el, na Gilgal, na Mizpa; o we kpe Israel ikpe n'ebe ahu nile. 17Nlata-ya bu na Rema, n'ihi na n'ebe ahu ka ulo-ya di; ọ bu kwa n'ebe ahu ka ọ kpere Israel ikpe: o we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. SAMUEL 7: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye