Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 6

6
1Ib͕e Jehova we di n'ọhia ndi Filistia ọnwa asa. 2Ndi Filistia we kpọ ndi-nchu-aja na ndi nāju ase, si, Gini ka ayi gēme ib͕e Jehova? me ka ayi mara ihe ayi gēji zilaga ya n'ebe-ya. 3Ha we si, Ọ buru na unu ezilaga ib͕e Chineke Israel, ezilagala ya n'aka efu; kama unu aghaghi inyeghachi Ya àjà-ikpe-ọmuma: mb͕e ahu agēme ka aru-unu di ike, agēme kwa ka unu mara ihe mere anēwezugaghi aka-Ya n'aru unu. 4Ha we si, Gini gābu àjà-ikpe-ọmuma ahu nke ayi gēnyeghachi Ya? Ha we si, Dika ọnu-ọgugu ndi-isi ndi Filistia si di, ọ bu emerod ọla-edo ise na òké ọla-edo ise ka unu gēnyeghachi: n'ihi na otù ihe-otiti diri ha nile, di-kwa-ra ndi-isi-unu. 5Unu gēme kwa onyinyo emerod-unu, na onyinyo òké-unu nke nēbibi ala-unu; unu gēnye kwa Chineke Israel nsọpuru: eleghi anya Ọ gēme ka aka-Ya di nfé pua n'aru unu, na n'aru chi nile unu, na n'ala-unu. 6N'ìhi gini kwa ka unu nēme ka obi-unu di arọ́, dika ndi Ijipt na Fero mere ka obi-ha di arọ́? mb͕e Ọ kwara ha emò, hà ezilagaghi ha, ha we la? 7Ma ub͕u a, werenu ihe me otù ub͕ọ-ala ọhu, chiri kwa nne-ehi abua nke nēnye umu ara, nke ọ dighi mb͕e yoke rigokwasiri ha, kegide-kwa-nu ehi ahu n'ub͕ọ-ala, me ka umu-ha si n'iso ha n'azu lata n'ulo: 8were-kwa-nu ib͕e Jehova tiyekwasi ya n'ub͕ọ-ala ahu; tiye ihe ọla-edo ahu, nke unu nēnyeghachi Ya ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma, n'ib͕e ntà n'akuku-ya; zilaga-kwa-nu ya, ka ọ we la. 9Le-kwa-nu, ọ buru na ọ rigo n'uzọ ókè-ala-ya rue Bet-shemesh, Ya onwe-ya emewo ayi oké ihe ọjọ a: ma ọ buru na ọ rigoghi otú a, ayi gāma kwa na ọ bughi aka-Ya tib͕uru ayi; ihe-ndabà ka ihe ahu bu, nke dabara ayi. 10Ndikom ahu we me otú a; ha chiri nne-ehi abua nke nēnye umu ara, kegide ha n'ub͕ọ-ala ahu, mechibido umu-ha uzọ n'ulo: 11ha we tukwasi ib͕e Jehova n'ub͕ọ-ala ahu, na ib͕e ntà ahu, na òké ọla-edo, na onyinyo emerod-ha. 12Ehi ahu we jezie ejezi n'uzọ rue uzọ Bet-shemesh: ọ bu n'otù uzọ atuliri atuli ka ha jere, nēje nēti nkpu, ha ewezugaghi kwa onwe-ha n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe; ndi-isi ndi Filistia we nējeso ha n'uzọ rue ókè-ala Bet-shemesh. 13Ma ndi Bet-shemesh nēbì ọka wheat-ha na ndagwurugwu: ha we welie anya-ha, hu ib͕e ahu, ṅuria ọṅu ihu ya. 14Ub͕ọ-ala ahu we ba n'ubi Joshua, bú onye Bet-shemesh, guzo n'ebe ahu, nkume uku di kwa n'ebe ahu: ha we kpọwa osisi ub͕ọ-ala ahu, sure ehi abua ahu ọku ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova. 15Ndi Livai we buda ib͕e Jehova na ib͕e ntà nke di n'akuku ya, nke ihe ọla-edo ahu nile di nime ya, ha we tukwasi ha na nkume uku ahu: ndikom Bet-shemesh we sure àjà-nsure-ọku, chu-kwa-ra Jehova aja ọzọ, n'ubọchi ahu. 16Ndi-isi ise nke ndi Filistia we hu ya, laghachi rue Ekron n'ubọchi ahu.
17Ndia bu emerod ọla-edo nke ndi Filistia nyeghachiri, ibu àjà-ikpe-ọmuma ichuru Jehova; Ashdod nwere otù, Geza nwere otù, Ashkelon nwere otù, Gat nwere otù, Ekron nwere otù; 18òké ọla-edo kwa, dika ọnu-ọgugu obodo nile nke ndi Filistia si di, bú nke ndi-isi ise ahu nwere, site n'obodo ewusiri ike we rue obodo ntà nke nēnweghi mb͕idi: we rue nkume uku ahu, bú Ebel, nke ha dọbara ib͕e Jehova n'elu ya: ọ di n'ubi Joshua, bú onye Bet-shemesh, rue ta. 19O we tib͕ue ufọdu nime ndikom Bet-shemesh, n'ihi na ha lere anya nime ib͕e Jehova, O we tib͕ue n'etiti ndi Israel ọgu ndikom atọ na iri, orú nnù ndikom uzọ isi na nnù ise: ndi Israel we rue újú, n'ihi na Jehova tib͕uru ntib͕u uku n'etiti ndi Israel. 20Ndikom Bet-shemesh we si, Ònye puru iguzo n'iru Jehova, bú Chineke nsọ a? Ọ̀ bu kwa onye ka O gēsi n'ebe ayi nọ rigokuru? 21Ha we zigara ndi bi na Kiriat-jearim ndi-ozi, si, Ndi Filistia ebughachiwo ib͕e Jehova; ridatanu, bugo ya n'ebe unu nọ.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. SAMUEL 6: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye