Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 5

5
1Ma ndi Filistia were ib͕e Chineke, ha we si n'Eben-eza bubata ya n'Ashdod. 2Ndi Filistia we were ib͕e Chineke, bubata ya n'ulo Degon, dọba ya n'akuku Degon. 3Ndi Ashdod we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, ma, le, Degon adakpuwo iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova. Ha we were Degon, tiyeghachi ya n'ọnọdu-ya. 4Ha we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, ma, le, Degon adakpuwo iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova; ma ebipuwo isi Degon na ọbu-aka-ya abua, ha we tọb͕ọrọ na nbata-uzọ; nání akuku-ya nke bu azù fọduru ya. 5N'ihi ya ndi-nchu-aja Degon na ndi nile nke nābà n'ulo Degon adighi-azọkwasi ukwu na nbata-uzọ Degon n'Ashdod, rue ta.
6Aka Jehova we di arọ́ n'aru ndi Ashdod, Ọ we kpochapu ha, were kwa emerod tib͕ue ha, bú Ashdod na ókè-ala-ya nile. 7Ndikom Ashdod we hu na ọ di otú a, ha we si, Ib͕e Chineke Israel agaghi-anọgide n'etiti ayi: n'ihi na aka-Ya esikawo ike n'aru ayi na n'aru Degon, bú chi-ayi. 8Ha we ziga, chikọtara onwe-ha ndi-isi nile nke ndi Filistia, si, Gini ka ayi gēme ib͕e Chineke Israel? Ha we si, Ka eburu ib͕e Chineke Israel b͕a buruburu rue Gat. Ha we būru ib͕e Chineke Israel b͕a buruburu rue ebe ahu. 9O rue, mb͕e ha būsiri ya buruburu, na aka Jehova digidere obodo ahu n'ọb͕ub͕a-aghara di uku ri nne: Ọ we tib͕ue ndikom obodo ahu, site n'onye ntà we rue onye uku, emerod we b͕apue n'aru ha. 10Ha we ziga ib͕e Chineke rue Ekron. O rue, mb͕e ib͕e Chineke biaruru Ekron, na ndi Ekron tiri nkpu, si, Ha eburuwo ib͕e Chineke Israel b͕a buruburu biakute ayi, ime ka ayi na ndi-ayi nwua. 11Ha we ziga, chikọta ndi-isi nile nke ndi Filistia, si, Zilaga ib͕e Chineke Israel, ka ọ laghachi kwa n'ebe-ya, ka o we ghara ime ka ayi na ndi-ayi nwua: n'ihi na ọb͕ub͕a-aghara nke ọnwu di n'obodo ahu nile; ọ di arọ́ nke-uku, bú aka Chineke, n'ebe ahu. 12Ndikom kwa ndi nānwughi, ewere emerod tib͕ue ha: ntiku obodo ahu we rigorue elu-igwe.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. SAMUEL 5: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye