Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 4

4
1Okwu Samuel we rue Israel nile nti. Israel we pua izute ndi Filistia ibu agha, we ma ulo-ikwū-ha n'akuku Eben-eza: ndi Filistia we ma ulo-ikwū-ha n'Efek. 2Ndi Filistia we do onwe-ha n'usoro izute Israel: agha ahu we nọsa, ewe tib͕ue Israel n'iru ndi Filistia: ha we tib͕ue n'etiti usoro ndi-agha Israel n'ọhia ihe ra ka nnù ndikom iri. 3Ndi Israel we ba n'ọmuma-ulo-ikwū, ndi-okenye Israel we si, N'ìhi gini ka Jehova tib͕uworo ayi ta n'iru ndi Filistia? Ka ayi si na Shailo wetara onwe-ayi ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ka o we bata n'etiti ayi, zọputa ayi n'ọbu-aka ndi-iro-ayi. 4Ndi Israel we ziga na Shailo, ha we si n'ebe ahu bute ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye bi n'etiti cherubim: umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, nọye-kwa-ra ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke n'ebe ahu. 5O rue, mb͕e ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova batara n'ọmuma-ulo-ikwū, na Israel nile tiri oké nkpu, ala wee daa uda. 6Ndi Filistia we nu olu iti-nkpu ahu, we si, Gini bu olu oké iti-nkpu a n'ọmuma-ulo-ikwū ndi-Hibru? Ha we mara na ib͕e Jehova abàwo n'ọmuma-ulo-ikwū. 7Ndi Filistia we tua egwu, n'ihi na ha siri, Chineke abàwo n'ọmuma-ulo-ikwū ahu. Ha we si, Ahuhu nādiri ayi! n'ihi na ihe dika nka adighi na mb͕e gara aga. 8Ahuhu nādiri ayi! ònye gānaputa ayi n'aka chi ndia di ike nke-ukwu? ndia bu chi nke were ihe-otiti nile ọ bula tib͕ue ndi Ijipt n'ọzara. 9Menu onwe-unu ka unu di ike, buru-kwa-nu ndikom, unu ndi Filistia, ka unu ghara iburu ndi-Hibru ndi-orù, dika ha buruworo unu ndi-orù: burunu ndikom, bu-kwa-nu agha. 10Ndi Filistia we bu agha, ewe tib͕ue Israel, ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ulo-ikwū-ya: oké ntib͕u uku we di; orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù iri-na-ise, bú ndi ji ukwu eje, we dapu n'Israel. 11Ewe were ib͕e Chineke; umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, nwukwara. 12Otù nwoke onye Benjamin we si n'usoro agha ahu b͕a ọsọ, biarue Shailo n'ubọchi ahu, uwe nwuda ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi ya n'isi. 13Ọ we bia, ma, le, Ilai nānọkwasi n'oche-ya n'akuku uzọ, nēche nche: n'ihi na obi-ya nāma jijiji n'ihi ib͕e Chineke. Nwoke ahu we ba igosi ya n'obodo, obodo ahu nile we tie nkpu. 14Ilai we nu olu iti-nkpu ahu, si, Gini bu olu ùzù a? Nwoke ahu we me ngwa bata, gosi Ilai. 15Ma Ilai b͕ara ọgu arọ anọ na iri na asatọ; anya-ya abua guzoro eguzo, ọ pughi kwa ihu uzọ. 16Nwoke ahu we si Ilai, Mu onwem bu onye si n'usoro agha bia, mu onwem si kwa n'usoro agha b͕alaga ta. O we si, Gini bu ihe emere, nwam? 17Onye ahu nke nēzì ozi ahu we za, si, Israel ab͕alagawo n'iru ndi Filistia, ọzọ kwa, oké ntib͕u adiwo n'etiti ndi Israel, ọzọ kwa, umu-gi ndikom abua, bú Họfnai na Finehas, anwuwo, ewerewo kwa ib͕e Chineke. 18O rue, mb͕e o hotara ib͕e Chineke, na o si n'oche-ya dala azu n'akuku ọnu-uzọ-ama, olu-ya we b͕ajie, o we nwua: n'ihi na nwoke ahu bu agadi, di kwa arọ́. Ya onwe-ya kpe-kwa-ra Israel ikpe ọgu arọ abua. 19Nwunye nwa-ya, bú nwunye Finehas, di ime, ọ gaje imu nwa: o we nu akukọ ahu na ewerewo ib͕e Chineke, na nna di-ya na di-ya anwuwo, o we ruru ala mua nwa; n'ihi na ime mere ya na mberede. 20Ma na mb͕e ọnwu-ya ndinyom ndi nēguzo n'akuku ya we kwue, si, Atula egwu; n'ihi na nwoke ka i muworo. Ma ọ zaghi, ọ tukwasighi kwa obi-ya na ya. 21O we kpọ aha nwa ahu Ikabod, si, Nsọpuru esiwo n'Israel pua: n'ihi owuwe ewere ib͕e Chineke, na n'ihi nna di-ya na di-ya. 22O we si, Nsọpuru esiwo n'Israel pua; n'ihi na ewerewo ib͕e Chineke.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. SAMUEL 4: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara