Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 8

8
1O rue, mb͕e Samuel ghọrọ agadi, na o doro umu-ya ndikom ndi-ikpe ikpe Israel. 2Ma aha ọkpara-ya bu Joel; aha nwa-ya nwoke nke-abua bu Abaija: ha bu ndi-ikpe nime Bia-sheba. 3Ma umu-ya ndikom ejeghi kwa ije n'uzọ-ya nile, ha we wezuga onwe-ha soro urù nēzighi ezi, ha we nara ihe-iri-ngo, wezuga ikpé.
4Ndi-okenye nile nke Israel we chikọta onwe-ha, biakute Samuel rue Rema: 5ha we si ya, Le, gi onwe-gi aghọwo agadi, ma umu-gi ndikom adighi-eje ije n'uzọ-gi nile: ub͕u a mere ayi eze ikpe ayi ikpe dika mba nile. 6Ma okwu ahu jọrọ njọ n'anya Samuel, mb͕e ha siri, Nye ayi eze ikpe ayi ikpe. Samuel we kpere Jehova. 7Jehova we si Samuel, Ge nti olu ndim n'ihe nile ha nāsi gi: n'ihi na ọ bughi gi ka ha juworo, kama ọ bu Mu ka ha juworo, ka M'ghara iburu ha eze. 8Dika omume nile si di nke ha meworo site n'ubọchi M'mere ka ha si n'Ijipt rigota we rue ta, ha we rapum, fè chi ọzọ òfùfè, otú a ka ha onwe-ha nēme kwa gi. 9Ma ub͕u a ge nti olu-ha: nání na i gāb͕asiri ha àmà ike, gosi kwa ha ikpé eze ahu nke gābu eze-ha.
10Samuel we gwa ndi Israel, ndi nāriọ eze n'aka-ya, okwu nile nke Jehova. 11O we si, Nka gābu ikpé eze ahu nke gābu eze-unu: umu-unu ndikom ka ọ gāchiri, doro ha onwe-ya n'ub͕ọ-ala-ya na n'elu inyinya-ya; ha gānab͕a kwa ọsọ n'iru ub͕ọ-ala-ya: 12o gēdo-kwa-ra ha onwe-ya ibu ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom abua na iri; na ilu ọlu-ubi-ya, na iwe ihe-ubi-ya, na ikpu ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke ub͕ọ-ala-ya. 13Ọ bu kwa umu-unu ndinyom ka ọ gāchiri ibu ndi nāsugwa ude nēsì ísì utọ, na ibu ndi-odozi-anu, na ibu ndi-osi-ite. 14Ubi-unu, na ubi-vine-unu, na ubi-olive-unu, bú nke kachasi nma, ka ọ gēwere kwa, nye ndi-orù-ya. 15Nkpuru-ọghigha-unu na ubi-vine-unu ka ọ gēwere otù uzọ n'uzọ iri, nye ndi nējere ya ozi, nye kwa ndi-orù-ya. 16Ọ bu kwa ndi-orù-unu ndikom, na ndinyom nējere unu ozi, na umu-okorọbia-unu, bú ndi kachasi nma, na inyinya-ibu-unu, ka ọ gēwere, me ka ha je ozi-ya. 17Ìgwè ewu na aturu-unu ka ọ gēwere kwa otù uzọ n'uzọ iri: unu onwe-unu gābu-kwa-ra ya orù. 18Unu gēti kwa nkpu n'ubọchi ahu n'ihi eze-unu nke unu rọputara onwe-unu; ma Jehova agaghi-aza unu n'ubọchi ahu. 19Ma ndi Israel juru ige nti olu Samuel; ha si, É-è; kama, eze gāchiri ayi; 20ka ayi we di, ọbuná ayi onwe-ayi, ka mba nile; ka eze-ayi we nēkpe kwa ayi ikpe, nāpu kwa je n'iru ayi, nēbu kwa agha-ayi. 21Samuel we nu okwu nile nke ndi Israel, o we kwue ha na nti Jehova. 22Jehova we si Samuel, Ge nti olu-ha, mere ha eze. Samuel we si ndikom Israel, Lanu, nwoke ọ bula n'obodo-ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. SAMUEL 8: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye