Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 3

3
Abụ Ọma 3
Abụ Ọma Devid. Nke o dere mgbe o si nʼihu Absalọm gbapụ ọsọ ndụ.
Ekpere maka enyemaka
1O Onyenwe anyị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m.
2Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị,
“Chineke agaghị azọpụta ya.” Sela#3:2 Okwu Hibru nʼusoro abụ nke a na-amaghị ihe ọ pụtara, ụfọdụ na-eche na ọ bụ okwu ntụziaka nye ndị ọbụ abụ banyere ihe ha ga-eme
3Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m;
I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ.
4Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa,
ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. Sela
5Edinara m ala, hie ụra,
ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche.
6A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu,
agaghị m atụ egwu ọbụla.
7Bilie Onyenwe anyị!
Zọpụta m Chineke m!
Tie ndị iro m niile aka nʼagba;#3:7 Job 16:10
tipụkwa ndị ajọ omume eze nʼọnụ.
8Nʼihi na nzọpụta na-esite nʼebe Onyenwe anyị nọ na-abịa.
Ka ngọzị gị dịịrị ndị gị niile. Sela

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Abụ Ọma 3: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye