Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 4

4
Abụ Ọma 4
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nke a na-eji ụbọ akwara akpọ.
Ntụgharị uche nke abalị
1Zaa m mgbe m na-akpọku gị
Chineke m, gị onye ezi omume;
Napụta m site nʼihe mgbu m,
meere m ebere, nụrụkwa ekpere m.
2Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga-atụgharịa ebube m, mee ka ọ bụrụ ihe ihere?
Ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ ihe efu nʼanya na-achọ chi ndị ahụ na-abụghị chi nʼezie?#4:2 Nke unu maara na ha bụ okwu ụgha Sela
3Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị ahọpụtala ndị ezi omume nye onwe ya;
ọ ga-egekwa ntị nʼolu m mgbe ọbụla m kpọkuru ya.
4Maanụ jijiji, unu emehiekwala;
mgbe unu nọ nʼelu ihe ndina unu;
nọọnụ jụụ na-enyocha obi unu. Sela
5Tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi unu,
chụkwaranụ ya aja ezi omume.
6Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ, “Onye pụrụ imere anyị ihe ọma?”
Ma Onyenwe anyị, biko mee ka ìhè nke ihu gị mụkwasị anyị.
7Were ọṅụ mejupụta obi m
karịa mgbe mkpụrụ ubi, ya na mmanya ọhụrụ ha bara ụba nke ukwuu.
8Aga m edina ala ma rahụ ụra nʼudo,
nʼihi na ọ bụ naanị gị Onyenwe anyị,
na-eme ka m nọrọ na-enweghị ihe egwu ọbụla.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Abụ Ọma 4: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye